Ten Aofiyebi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Tenidade Aofiyebi bụ onye omere na nwanyị ọchụnta ego Naijiria.

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Aofiyebi bụ onye Yoruba . [1] Ọ gara St Anne's School Ibadan maka ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya, tupu ọ nweta ọkwa "A" na ụlọ akwụkwọ Farringtons, ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị nọọrọ onwe ha na Kent, United Kingdom . Ọ nwetara agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị na kọleji nke mejupụtara Mahadum London .

Ọ gbara na ihe nkiri usoro onyonyo Mirror in the Sun ya na Clarion Chukwuma n'etiti 1984 na 1986. [2] Aofiyebi gbara n'usoro ihe onyonyo For Better, For Worse na 2003. [3] Na 2005, ọ gosiputara na ihe nkiri ndọrọ ndọrọ ọchịchị Prince of the Savannah, nke Bayo Awala duziri. [4] Na 2013, Aofiyebi gosiputara na ihe nkiri ịhụnanya na-ato ochi Flower Girl, nke Michelle Bello duziri. [5] Aofiyebi nwere ọrụ na 2015 ihe nkiri usoro onyonyo Royal Castle, na isiokwu ndị metụtara nrara nye , aghụghọ, nrụrụ aka, na ịhụnanya. [6]

Aofiyebi bidoro azụmaahịa mgbazinye TKM Essentials na Mee 2014. Ndị ahịa mbụ gụnyere ndị na-eme atụmatụ mmemme na ndị na-eme ihe ndozi ime. Echiche maka azụmahịa ahụ bịara mgbe ọ na-eme atụmatụ ụbọchị ọmụmụ iri isii ya wee nata nnukwu ụgwọ site n'aka onye nhazi ihe omume, ma kpebie na ọ ga-abụ ihe dị mma ịzụta ihe ndị ahụ kama ịgbazite ha. Ọtụtụ n'ime akụrụngwa ya sitere China na India, o kwuru na ha dị oke ọnụ mana ọ ga-adịrị ndị nwere ego ọnụ. Ụlọ ahịa ahụ dị na Raufu Williams Crescent, na Lagos, na nnukwu mmeghe ahụ bụ nwunye onye na chi Lagos Abimbola Fashola . [7] Na Julaị 2014, Aofiyebi jere ozi dị ka onye ndụmọdụ azụmaahịa nye ndị ọchụnta ego na-eto eto bu akụkụ nke atụmatụ Mara Mentor Initiative. [8] N'afọ 2019, ọ bụ onye ọka ikpe na asọmpi ịma mma maka ụmụ agbọghọ ntị chiri. [9]

Ọ bụ nwanne nne ma ọ bu nna nwanyị omee Funlola Aofiyebi-Raimi . [10] Aofiyebi nwere ejima Taiwo na Kehinde. [7] Ọ bụ nne ochie. [11]

Ihe nkiri na-erụghị oke[dezie | dezie ebe o si]

  • 1984-1986: Mirror in the Sun (usoro ihe onyonyo onyonyo)
  • 1998: A place Called Home (obere ihe nkiri)
  • 2003: Fir Better, for Worse
  • 2005: Prince of the Savannah
  • 2013: Flower Girls
  • 2015: Royal Castle (usoro ihe onyonyo) 

Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Svend Juncker: Turmoil, drama of tracing ancestral roots", Vanguard, 5 December 2018. Retrieved on 9 November 2020.
  2. Funlola Aofiyebi: Five Things You Should Know About The Star. Heavy NG. Retrieved on 9 November 2020.
  3. Ajayi. "A STRANGE AND FASCINATING NATION: MY EARLY YEARS IN NIGERIA (Concluded)", Nigeria World, 17 March 2015. Retrieved on 9 November 2020.
  4. Shijuwomi, Behold My Redeemer. Rssing.com (17 June 2015). Retrieved on 9 November 2020.
  5. "FAB Teaser: ‘Flower Girl’", FAB Magazine, 14 December 2012. Retrieved on 9 November 2020.
  6. "Watch Chris Attoh, Deyemi Okanlawon, Gloria Young & more in new Telenovela", Pulse, 19 September 2015. Retrieved on 9 November 2020.
  7. 7.0 7.1 "‘Why I went into rental business’ – TENI AOFIYEBI", Encomium, 21 May 2014. Retrieved on 9 November 2020.
  8. Olapoju (6 August 2014). One-on-one: 50 entrepreneurs selected for mentorship in Mara Mentor programme. Ynaija. Retrieved on 9 November 2020.
  9. Emmanuel. "Nigeria Holds First Beauty Pageant for Deaf Girls Nov.1", Inside Business, 1 November 2019. Retrieved on 9 November 2020.
  10. Suleiman (30 August 2009). I've always wanted to educate and entertain people - Funlola Aofiyebi-Raimi. Vanguard. Retrieved on 29 September 2013.
  11. Aniemeka. "Teni Aofiyebi ages gracefully", Online Nigeria, 6 July 2013. Retrieved on 9 November 2020.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Loladeville