Trefor Richard Morgan
Trefor Richard Morgan (28 Jenụwarị 1914 - 3 Jenụwarụ 1970) bụ onye na-akwado mba Welsh. Ọ bụ onye ọchụnta ego guzobere ụlọ ọrụ ịnshọransị ma kwadokwa mbọ niile gbasara agụmakwụkwọ asụsụ Welsh.
Ndụ mbido
[dezie | dezie ebe o si]Amụrụ na Tonyrefail, Glamorgan, nna ya nwụnahụrụ Morgan n'ọrịa Influenza nke Spanish nke 1918. Ọ meriri ebe n'ụlọ akwụkwọ ụtọ asụsụ, ma hapụrụ mgbe ọ dị afọ iri na anọ ka ọ rụọ ọrụ dị ka onye na-egwupụta coal, n'ihi nsogbu ego ezinụlọ ya nwere.[1] Ka ọ na-erule etiti afọ 1940, ọ na-arụ ọrụ ugbo .[2]
Morgan bụ Onye jụrụ n'ihi akọ na uche n'oge Agha Ụwa nke Abụọ, n'ihi nkwenkwe mba Welsh ya. N'afọ 1941, a tụrụ Morgan na nwoke ọzọ, Ted Merriman, mkpọrọ otu ọnwa maka ebubo mkparị mgbe ha tụgharịrị azụ n'oge ha na-egwu God Save the King na ihe omume e mere na Aberystwyth.[3] Morgan lụrụ Gwyneth Evans na 1943. [1]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
[dezie | dezie ebe o si]Morgan malitere ọrụ na Plaid Cymru. Ọ kwụrụ maka pati ahụ na Ogmore na ntuli aka izugbe nke 1945 na na ntuli aka ime obodo 1946. Ọ bụ otu n'ime ndị malitere otu Welsh Republican Movement, nke e hibere na Septemba 1949, mgbe esemokwu dị iche iche mere ka ndị otu Plaid Cymru dị ihe dị ka iri ise si na ogbako pụta.[4] N'afọ 1950, o guzoro dị ka onye na-akwado mba n'onwe ya na Merthyr Tydfil. N'afọ 1955, ọ guzoro ọzọ maka Plaid, n'oge a na Abertillery, na ntuli aka nke 1964 na 1966, ọ guzoro na Brecon na Radnorshire.[1]
Azụmaahịa na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]Mgbasa ozi ntuli aka Morgan enweghị ihe ịga nke ọma, o kpebikwara ilekwasị anya n'ịkwalite azụmaahịa Welsh nwere onwe ya. Iji mezuo nke a, o guzobere ụlọ ọrụ ịnshọransị, Cwmni Undeb, nke dị na Aberdare. O kwere nkwa na a ga-etinye uru ọ bụla na ụlọ ọrụ Welsh ma ọ bụ guzobe ụlọ akwụkwọ asụsụ Welsh. Site na nke a, o mepụtara ụlọ ahịa maka azụmaahịa nwere echiche yiri ya na Hirwaun, na 1963 hiwere Cronfa Glyndwr yr Ypuesto Cymreig (The Glyndŵr Trust for Welsh Schools), nke kesara ego nye ndị nne na nna chọrọ iziga ụmụ ha n'ụlọ akwụkwọ asụsụ Welsh. [5] N'afọ 1968, o guzobere Ysgol Glyndwr dị nso na Bridgend dị ka ụlọ akwụkwọ sekọndrị na-asụ asụsụ Welsh, mana nke a mechiri n'oge na-adịghị anya mgbe ọ nwụsịrị, n'afọ 1970. [6]
Ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 1.2 Morgan, Trefor Richard. National Library of Wales. Retrieved on 14 February 2016. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>tag; name "library" defined multiple times with different content - ↑ "Welsh Nationalists' attack in Labour stronghold", Manchester Guardian, 3 June 1946.
- ↑ McAllister (2001). Plaid Cymru: The Emergence of a Political Party. Seren. ISBN 9781854113108.
- ↑ The Welsh Republican Movement. www.llgc.org.uk. National Library of Wales. Retrieved on 14 February 2016.
- ↑ James (October 2014). 50 years on – and still the battle continues!. www.cronfaglyndwr.net. Ninnau, the North American Welsh Magazine. Archived from the original on 22 February 2016. Retrieved on 14 February 2016.
- ↑ Williams (2003). Our Children's Language: The Welsh-medium Schools of Wales 1939-2000. Cardiff: Y Lolfa. ISBN 9780862437046.