Uzziel Ndagijimana
Uzziel Ndagijimana | |
|---|---|
Uzziel Ndagijimana in 2023 | |
| Group CEO of Bank of Kigali Group | |
| In office 6 April 2018 – 15 August 2024 | |
| President | Paul Kagame |
| Preceded by | Claver Gatete |
| Succeeded by | Yusuf Murangwa |
| Personal details | |
| Nationality | Rwandan |
Uzziel Ndagijimana bụ onye mba Rwanda na-ahụ maka akụ na ụba, o jezikwara ozi dịka Minista na-ahụ maka ego na atụmatụ akụ na ụba na gọọmentị nke Onye isi ala Paul Kagame site n’oge afọ 2018 ruo oge afọ 2024 ma ọ bụ Yusuf Murangwa nọchiri anya ya. [1] [2][3]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]Ndagijimana nwere PhD, Economics, n’oge afọ 1998 site na Mahadum Warsaw na MSc. Economics si kwazi Warsaw School of Economics . [4]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Ndagijimana malitere ọrụ ya dịka onye nkuzi na ngalaba nke Economics, Social Sciences, na Management na National University of Rwanda n’oge afọ 1999. N'oge afọ 2002, ọ kwagara n'ọkwa ndị isi nke Gọọmentị mba Rwanda.[5]
Ndagijimana jezikwara ozi dịka Rector nke School of Finance and Banking na Kigali, Rwanda, site n’oge afọ 2002 ruo oge afọ 2007 mgbe nke ahụ gasịrị ọ gara n'ihu bụrụ osote Rector nke National University of Rwanda site n’oge afọ 2007 ruo oge afọ 2011. [5][6]
Ndagijimana bụ odeakwụkwọ na-adịgide adịgide nke Ministry of Health, Republic nke mba Rwanda, site na ọnwa Mee nke oge afọ 2011 ruo ọnwa Julaị nke oge afọ 2014. [6] Ọ bụkwa Minista nke Steeti na-ahụ maka atụmatụ akụ na ụba na Ministry of Finance and Economic Planning (MINECOFIN). [2]
N'oge nzukọ Afreximbank na Abuja kwa afọ iji cheta afọ iri abụọ na ise ya, Kemi Adeosun, onye bụ minista ego nke Naijiria, nọchiri Ndagijimana dị ka onyeisi oche nke ụlọ akụ ahụ.[7]
N'ọnwa Epreel nke ụbọchi asaa , n’oge afọ 2018, Onye isi ala Paul Kagame họpụtara Ndagijimana ka ọ bụrụ Minista na-ahụ maka ego na atụmatụ akụ na ụba na mba Rwanda.[1] Ndagijimana jere ozi dịka Onye isi oche nke Kansụl ndụmọdụ akụ na ụba nke Onye isi ala nke Republic of Rwanda . [5]
Ihe omume ndị ọzọ
[dezie | dezie ebe o si]- African Development Bank (AfDB), Onye bụbu onye otu Board of Governors (site na 2018)
- East African Development Bank (EADB), Onye bụbu onye otu Council (site na 2018)
- International Monetary Fund (IMF), Onye bụbu onye otu Board of Governors (site na 2018)
- World Bank, Onye bụbu onye ọrụ nke Board of Governors (site na 2018)
- Mahadum Mba nke Rwanda, Onye otu Board of Directors [5]
- National Bank of Rwanda, Onye otu Board of Directors [5]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 "Rwanda's president names new finance minister in reshuffle", Reuters. Retrieved on 2018-07-23.. Reuters. Archived from the original on 2022-02-26. Retrieved 2018-07-23.
- ↑ 2.0 2.1 Minister Uzziel Ndagijimana takes over at MINECOFIN, calls for continued collaboration (en). www.minecofin.gov.rw. Archived from the original on 2018-07-23. Retrieved on 2018-07-23.. www.minecofin.gov.rw. Archived from on 2018-07-23. Retrieved 2018-07-23.
- ↑ Kuteesa (2024-06-14). Yusuf Murangwa: The progressive economist set to steer Rwanda’s finance ministry (en). The New Times. Retrieved on 2024-08-18.
- ↑ Uzziel Ngagijimana (en-GB). IGC. Retrieved on 2019-12-26.
- ↑ 5.0 5.1 5.2 5.3 5.4 "Uzziel Ndagijimana", World Bank Live, 2018-04-12. Retrieved on 2018-07-23. (in en)"Uzziel Ndagijimana". World Bank Live. 2018-04-12. Retrieved 2018-07-23.
- ↑ 6.0 6.1 "Uzziel Ngagijimana - IGC", IGC. Retrieved on 2018-07-23. (in en-GB)"Uzziel Ngagijimana - IGC". IGC. Retrieved 2018-07-23.
- ↑ "Kemi Adeosun elected Afreximbank board chairperson | TODAY.NG", TODAY.NG, 2018-07-14. Retrieved on 2018-07-26. (in en-US)