Gaa na ọdịnaya

Veronica Lucy Gordon

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Veronica Lucy Gordon
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịSouth Sudan Dezie
Aha enyereVeronica, Lucy Dezie
Aha ezinụlọ yaGordon Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ntaakụkọ, radio producer, àgwà redio, activist Dezie
Ebe agụmakwụkwọUniversity of Juba Dezie

Veronica Lucy Gordon bụ onye nta akụkọ nke mba South Sudan, onye mgbasa ozi redio na onye na-ahụ maka ikike mmadụ, bụkwa onye guzobere Association of Media Women in South Sudan (AMWISS). N'afọ 2014, ọ bụkwazi nwanyị mbụ so na bọọdụ ezegetiv nke Association for Media Development of South Sudan (AMDISS).

Mmalite na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Gordon nwere diplọma na Community Studies na Rural Development nke ọ nwetara na Mahadum Juba.[1] Ọ nwetakwara ọzụzụ ọnwa isii na akụkọ maka akwụkwọ akụkọ ya na foto ma nke a bụkwazi nke ọ bụ Hirondele na BBC Trust kwadoro.[1]

Gordon bụ onye na-ede akwụkwọ akụkọ na Nile Mirror Newspaper n’oge afọ1983 ma na-akọkarị banyere agụmakwụkwọ ụmụ nwanyị. [1]

N'etiti afọ 1985 ya na oge afọ 2000, Gordon rụrụ ọrụ na Sudan National Broadcasting Cooperation ebe a manyere ya ịla ezumike nká.[1] Ọ sonyeere Coordination Council for the Southern States, nke Riek Machar guzobere.[1] N'oge afọ 2006, ọ na-arụ ọrụ dị ka onye na-emepụta ma na-asụgharịkwa mmemme maka redio Free Voice . [1]

N'oge afọ 2006, ya na Apollonia Mathia nwụrụ anwụ, na ndi ọzọ, Gordon guzobere Association of Media Women in South Sudan (AMWISS) [2] [3] mgbe ọ na-arụkwa ọrụ dịka onye nduzi n’obodo South Sudan Radio (2012). [4]

N'oge afọ 2014, a họpụtara Gordon dịka onye isi oche nwanyị mbụ nke Association for Media Development na South Sudan (AMDISS). [5]

Hụkwazi

[dezie | dezie ebe o si]
  • Apollonia Mathia
  • Mgbasa ozi na South Sudan
  • Ihe ndị ruuru mmadụ na South Sudan

Edensịbia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 Ayen Achol Deng (14 December 2021). Veteran journalist who bore brunt of war for decades narrates her story. Archived from the original on 10 October 2023. Retrieved on 21 March 2022.
  2. Meet Veronica Lucy Gordon, South Sudan (en-US). Nobel Women's Initiative (2014-12-04). Retrieved on 2022-03-21.
  3. FOJO:Media Institute. "Report on Training Needs for South Sudanese Journalists", Fojo Media Institute, November 2012, pp. 13. Retrieved on 21 March 2022.
  4. Powell. "South Sudan : Media and telecoms landscape guide, February 2012", Infoasaid, 1 February 2012, pp. 13–14. Retrieved on 21 March 2022.
  5. Veteran Journalist Alfred Taban elected head of AMDISS (en-US). Eye Radio (2014-10-17). Retrieved on 2022-03-21.