Gaa na ọdịnaya

Vida de Voss

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Vida de Voss

Vida V. de Voss bụ onye Namibia na-akwado ikike ụmụ nwanyị, onye isi otu nzukọ nwanyị Namibia a na-akpọ Sister Namibia, na onye bụbu onye nkuzi na ngalaba akwụkwọ ọgụgụ Bekee na Mahadum Sayensị na Nkà na uzu Namibia. Ọ na-akuzizi Asụsụ Bekee ugbua na Private School Swakopmund.

De Voss nwetara nzere masta na nkà ihe ọmụma na Mahadum Stellenbosch n'afọ 2006, akwụkwọ edemede ya bụ, Emmanuel Levinas on ethics as the first truth.[1] N'afọ 2010, o nwetara nzere masta na akwụkwọ Bekee na Mahadum steeti Iowa, akwụkwọ edemede ya bụ The Identity Challenge in Toni Morrison's "Paradise".[2]

De Voss bụbụ onye nkuzi akwụkwọ ọgụgụ Bekee na Mahadum Sayensị na Teknụzụ nke Namibia site na afọ 2013 ruo afọ 2021.[3]

Ọ na-arụ ọrụ ugbu a na Private School Swakopmund ebe ọ na-akụzi Asụsụ Bekee n'ogo greedi ụmụ akwụkwọ nke itoolu na nke iri

De Voss bụ onye nduzi nke Sister Namibia, otu òtù ụmụ nwanyị na onye na-ebipụta magazin aha ya (nke mbụ e bipụtara na afọ 1989), nke dị na Windhoek.[4][5]De Voss abụwokwa ọkà okwu ọbịa na Mahadum Namibia na Windhoek . [6] Na Machị 2016, ọ gwara ndị na-ege ntị ọtụtụ narị ụmụ nwanyị okwu na nzukọ na Windhoek's Safari Court Hotel iji cheta Ụbọchị Ụmụ nwanyị Mba Nile.[7]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Author. scholar.sun.ac.za. Archived from the original on 7 November 2017. Retrieved on 6 November 2017.
  2. Vida (6 November 2017). "The Identity Challenge in Toni Morrison's "Paradise"". Retrieved on 6 November 2017. 
  3. Vida de Voss - Bayt.com. people.bayt.com. Retrieved on 6 November 2017.
  4. Contact us. sisternamibia.com (30 June 2014). Retrieved on 6 November 2017.
  5. Vision. sisternamibia.com (30 June 2014). Retrieved on 6 November 2017.
  6. UNAM German Studies career day inspires students and employers. University of Namibia. Archived from the original on 9 September 2018. Retrieved on 6 November 2017.
  7. Namibia commemorates the International Women's Day: Hanns-Seidel-Stiftung. www2.hss.de. Retrieved on 6 November 2017.