We Don't Live Here Anymore (2018 film)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
We Don't Live Here Anymore (2018 film)
film
mba osiNaijiria Dezie
afọ/ụbọchị mbipụta14 Ọktoba 2018 Dezie
Onye nduziTope Oshin Dezie
Odee akụkọ ihe nkiriNoni Salma Dezie
onye nsonye ihe nkiriOsas Ighodaro, Lolo1 Dezie
nchịkọta akụkọ ihe nkiriNiyi Akinmolayan Dezie
onye na-emepụta iheOlumide Makanjuola, Tope Oshin Dezie

Àtụ:Infobox film



We Don't Live Here Anymore bụ ihe nkiri 2018 nke Naijiria (ihe nkiri) nke Tope Oshin duziri ma Olumide Makanjuola, Bose Oshin na Tope Oshin mepụtara. Ihe nkiri a gbadoro ụkwụ na akụkọ Lesbian Gay Bisexual na Transgender (LGBT) nke ụmụ akwụkwọ abụọ nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị Prominence, Chidi Egwuonwu (Temidayo Akinboro) na Tolu Bajulaye (Francis Sule). [1] Ụmụ nwoke abụọ a dị afọ iri na ụma hụrụ ibe ha n'anya, ha ga -emesokwa ọha mmadụ n'ihi ịkpa oke na -adabere na mmekọ nwoke na nwoke. [2] [3]

N'afọ 2018, We Don't Live Here Anymore nwetara ihe nrite abụọ (Ihe nkiri nke afọ na Tope Oshin dị ka onye ntụzi afọ) n'oge mbipụta nke iri nke 2018 Best of Nollywood awards (BON). [4] [5]

Ihe nkiri a gbara Osas Ighodaro dịka Leslie, Omotunde Adebowale David dịka Ms. Wilson, Francis Sule, Temidayo Akinboro, Funlola Aofiyebi, Katherine Obiang, n'etiti ndị na-eme ihe nkiri Nollywood. [1] Egosiputara ihe nkiri a izizi na Lagos na IMAX cinemas, Lekki na Oktober 14, 2018. [6]

Ndị Initiative nke Equal Rights (TIERS) kwadoro ihe nkiri a. [1]

Atụmatụ[dezie | dezie ebe o si]

Ụmụ akwụkwọ sekọndrị abụọ bụ ndị hụrụ ibe ha n'anya ka ejidere na mmekọ nwoke na nwoke n'ime ụlọ akwụkwọ, Prominence High School. [7] Nike Bajulaye na Nkem Egwuonwu, bụ ndị nne ụmụakwụkwọ a ka ndị isi ụlọ akwụkwọ kpọtụụrụ ha. N'ụlọ ọrụ onye isi ụlọ akwụkwọ, a gwara Nike na Nkem na enwere ike ịchụpụ ụmụ ha n'ụlọ akwụkwọ. Ndị inyom a meghachiri omume dị iche iche maka ọnọdụ mmekọahụ nke ụmụ ha. Nike Bajulaye na-agba mbọ ikpochapụ ihere nwa ya wetara ezinụlọ ya ma n'ụzọ dị iche, Nkem Egwuonwu na-akwado nwa ya nwoke ma nabata ya otú ọ dị. [3]

Nkedo[dezie | dezie ebe o si]

  • Francis Sule dị ka Tolu Bajulaye
  • Temidayo Akinboro dị ka Chidi Egwuonwu
  • Funlola Aofiyebi dị ka Nike Bajulaye
  • Katherine Obiang dị kaNkem Egwuonwuo
  • Osas Ighodaro dị ka Leslie
  • Chris Iheuwa dị ka Femi Bajulaye
  • Abiodun Aleja dị ka Principal
  • Omotunde Adebowale David dị ka Nwada Wilson
  • Kunle Dada dị ka Psychatiarist
  • Funmi Eko dị ka Isioma

Ekele[dezie | dezie ebe o si]

Na 2018, We Don't Live Here Anymore nwere ọtụtụ nhọpụta na ihe nrite n'oge mbipụta nke iri nke Best of Nollywood awards (BON) nke emere na Kakanfo Conference Centre, Ibadan, Oyo State . [8] [5] [4]

Ihe nrite na Nhọpụta[dezie | dezie ebe o si]

Ụbọchị Ihe nrite Udi Nsonaazụ Nsidee
2018 Best of Nollywood Awards Ihe nkiri nke Afọ Merie [5] [4]
Onye isi nke afọ Merie [5] [4]
Ihe nkiri nwere nseta ihuenyo kacha mma Ahọpụtara [8]
Ihe nkiri nwere ihe nrụpụta kacha mma Ahọpụtara [8]
Ihe nkiri nwere ndezi kacha mma Ahọpụtara [8]
Ihe nkiri nwere sinima kacha mma Ahọpụtara [8]

Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Elechukwu (2018-10-27). Tope Oshin’s ‘We Don’t Live Here Anymore’ Rattles Nollywood (en-US). THISDAY LIVE. Retrieved on 2021-10-18.
  2. We Don't Live Here Anymore (2018) - nlist | Nollywood, Nigerian Movies & Casting (en-GB). nlist.ng. Retrieved on 2021-10-18.
  3. 3.0 3.1 Eze (2018-10-15). Cisi Eze: The Dangers of Making Home Uninhabitable – A Review of We Don’t Live Here Anymore (en-US). BellaNaija. Retrieved on 2021-10-18.
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 BON Awards 2018 Full List Of Winners |FabWoman (en-US). FabWoman | News, Style, Living Content For The Nigerian Woman (2018-12-10). Retrieved on 2021-10-18.
  5. 5.0 5.1 5.2 5.3 Augoye (2018-12-10). BON Awards 2018: Tope Oshin, Tana Adelana win big (en-GB). Retrieved on 2021-10-18.
  6. Celebs storm premiere of ‘We Don’t Live Here Anymore’ (en-US). The Sun (Nigeria) (2018-10-20). Retrieved on 2021-10-18.
  7. TIERsadmin (2018-05-05). “We Don’t Live Here Anymore” brings an in-depth look at discrimination, violence and life struggle (en-US). TIERS. Retrieved on 2021-10-18.
  8. 8.0 8.1 8.2 8.3 8.4 Murtala (2018-11-08). FULL LIST: 'We Don't Live Here Anymore' earns 11 BON Awards nominations (en-US). TheCable Lifestyle. Retrieved on 2021-10-18.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • We Don't Live Here Anymore at IMDb