Gaa na ọdịnaya

William Leslie Amanzuru

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
William Leslie Amanzuru
William Leslie Amanzuru na Oslo Freedom Forum 2019
Mba Ugandan
A maara ya maka  Onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na gburugburu ebe obibi

William Leslie Amanzuru bụ Onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na gburugburu ebe obibi na onye isi otu na ndị enyi Zoka na mba Ugandan. [1] [2] [3][4]

Ihe ndị mere n'oge gara aga

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ma'di na [Lira District] n'ebe ugwu ọdịda anyanwụ mba Uganda, Amanzuru toro n'ógbè dị gburugburu ọhịa Zoka ebe a na-echekwa ọhịa na ọdịda anyanwụ Naịl Uganda . [1] [5][6]

N'ịbụ onye na-enwe nsogbu site na mmebi iwu na-akwadoghị nke ihe onwunwe ọhịa, Amanzuru kpebiri ime ihe iji hụ na echekwara ọhịa Zoka. N'afọ pụkụ abụọ na ịrị na ise, Amanzuru na obodo ahụ guzobere otu a na-akpọ "ndị enyi Zoka", otu ndị na-ahụ maka gburugburu ebe obibi nke hụrụ Zoka Central Forest Reserve n'anya iji kwụsị mpụ iwu na-akwadoghị nke ndị na-egbutu osisi, ndị na-ere osisi na ndị na-azụ icheku ọkụ.[3][1][5][7]

Na mbido nke ndị enyi Zoka, otu ahụ haziri ọrụ ha n'otu ìgwè watsap iji soro ndị na-egbutu osisi ma gwa ibe ha ma ọ bụrụ na ọrụ ọ bụla kwesịrị ime ihe.[3][5][8][9]

Amanzuru zutere mmegide siri ike site n'aka ndị agha Uganda dị ike na ndị uwe ojii na-enwe afọ ojuju na ahia osisi iwu na-akwadoghị. Ọ na-eche egwu ọnwụ ihu, na-abanye n'ụlọ ya ma na-akwaga ezinụlọ ya narị ịse kilomita na-achọ nchekwa.[3][5][10][11] 

Ya na ndị ọzọ na-eme ngagharị iwe haziri ihe omume iji mee ka ọha na eze mara banyere ihe ize ndụ nke mgbanwe ihu igwe. N'afọ pụkụ abụọ na ịrị na itọọlu, ha haziri njem njem kilomita rụrụ narị anọ na iri asaa iji chekwaa ọhịa Zoka, njem ahụ malitere site na Kampala isi obodo Uganda ruo n'ọhịa Zoka na mpaghara Adjumani ma were ụbọchị 15.[5][12] 

Amanzuru bụ onye natara European Union Human Rights Defenders Award 2019 na mba Uganda maka ọrụ ya nke na-elekwasị anya na nchedo gburugburu ebe obibi na Ikpe ziri ezi nke ihu igwe.[1][13]

Edemsibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Ugandan environmental rights defender William Amanzuru wins EU Human Rights Defenders' Award 2019 | EEAS Website. www.eeas.europa.eu. Retrieved on 2022-06-15.
  2. William Amanzuru (en). Front Line Defenders (2019-08-22). Retrieved on 2022-06-15.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Koigi. William Amanzuru on the price of defending Uganda's forests (en). FairPlanet. Archived from the original on 2023-06-04. Retrieved on 2022-06-15.
  4. Environmental Activism for Wildlife Protection in Uganda | Planetary Security Initiative. www.planetarysecurityinitiative.org. Retrieved on 2022-06-15.
  5. 5.0 5.1 5.2 5.3 5.4 "Uganda's forests are disappearing. He's fighting back.", Christian Science Monitor, 2019-09-24. Retrieved on 2022-06-15.
  6. Amanzuru wins EU Human Rights Defenders' award (en). The East African (2020-07-06). Retrieved on 2022-06-15.
  7. Human Rights Defender of the Month: William Leslie Amanzuru - DefendDefenders (en-US) (2018-10-06). Retrieved on 2022-06-15.
  8. William Amanzuru on saving Zoka forest. ⋆ Souwie on ... (en-US) (2019-12-27). Retrieved on 2022-06-15.
  9. Musoke (2021-04-26). Race on to restore Uganda's forests (en-US). The Independent Uganda. Retrieved on 2022-06-15.
  10. Police on the spot over fresh plunder of Zoka forest reserve (en). Monitor (2021-03-24). Retrieved on 2022-06-15.
  11. Rupiny. Zoka Forest: Illegal Lumbering Going On Unabated (en). Uganda Radio Network. Retrieved on 2022-06-15.
  12. Adjumani locals, leaders to meet over Zoka forest plunder - (en-US) (2022-05-11). Retrieved on 2022-06-15.
  13. Ugandan, William Amanzuru, wins EU Human Rights defenders' award 2019 (en-US). Nile Post (2019-05-07). Retrieved on 2022-06-15.