Yenagoa Township Stadium

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Yenagoa Township Stadium
ama-egwuregwu
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaYenagoa Dezie
nhazi ọnọdụ4°55′58″N 6°16′0″E Dezie
occupantBayelsa United F.C. Dezie
Map

Ama egwuregwu Samson Siasia bụ ámá emebere iji n'eme ọtụtụ egwuregwu dị na isi obodo bụ Yenagoa , Nigeria . A na -eji ya ugbu a agbakarichaegwuregwu bọọlụ, ọ bụkwa ama egwuregwu nnọọ n'ụlọ nke Ocean Boys FC na Bayelsa United . Ama egwuregwu a nwere ike ibacha Puku mmadụ ise. Tupu afọ puku iri abụọ na iteghete (2009), a maara ya dị ka ámá egwuregwu obodo mepere emepe bụ Yenagoa. E weghachiri ya n'afọ 2009 wee kpọọ ya aha onye bụbu onye ama ama na Naịjirịa ma bụrụ onye gbaburu bọọlụma chikọkwa otu egwu bọọlụ bụ Samson Siasia . Samson Siasia bụbu onye egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ onye kụzielara ọtụtụ ndị òtù egwu bọọlụ ma nwee ọtụtụ agam n'ihu oge a. Ogige egwuregwu Samson Siasia bụ obosara ala emebere maka egwuregwu bọọlụ akpọrọ pichi nke nwere Astro tofụ mbụ na -mbụ amara amara gburugburu ebe obibi Afrịka, nke Astro tofụ a o nwere dị ñarị ma bụrụ nke ogige obibi Afrịka nabatara tụmadi ịba uru, nakwa ifurufu eriri aki oyibo nke dị ya bụ nke jupụtara n'elu ahịhịa aka mere nke n'enweghi ihe kwuchiri ya yana shock pad nke bụ ihe na anọ n'okpuru ahịhịa nsa na ala nke n'adị larịị n'ụkwụ bụ nke aka mere ma bụrụ kwa nke nyere ya bụ pichi ọpụrụ iche nke nyere ya oyiyi yiwere ahịhịa àlà pùrù . Pichi astro tọf a dị larịị ma nabata ogige ebe arụrụ ya bụ Monimichelle bụ́ ụlọ ọrụ ndị maara ihe gbasara ọrụrụ na mmepe ihe gbasara ngwa egwuregwu. wuru ọmarịcha astro tọf pichi a dị larịị ka ahịhịa àlà pùrù ma bụrụ ọpụrụ iche(Monimichelle sport Facility and development ltd)

5555