Yirgalem Fisseha Mebrahtu
Yirgalem Fisseha Mebrahtu (Amharic: ይርጋለም ፍсሃ መብraቱ; amụrụ n'afọ pụkụ na narị itoolu na ịrị asatọ na otụ) bụ onye mba Eritrea na-ede uri, onye edemede na onye nta akụkọ. N'afọ pụkụ abụọ na itoolu, gọọmentị mba Eritrea jidere ya ma tụọ ya mkpọrọ. Kemgbe afọ pụkụ abụọ na ịrị na asatọ, ọ na-ebi na Munich na nkwado nke PEN Center Germany.
Mbido ndụ na ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ ya n'afo pụkụ na narị itoolu na ịrị asatọ na otụ na mba Adi Keyh, [1] Yirgalem Fisseha Mebrahtu edeela uri kemgbe ọ bụ nwata. Site n'etiti afọ ndị afọ pụkụ na narị itoolu na ịrị itọọlu, ọ sonyere n'ihe omume edemede, nke mbụ n'ụlọ akwụkwọ ya ma mesịa na mgbasa ozi onwe onye na nke steeti. Ya na ndị edemede ndị ọzọ na-eto eto guzobere Adi Keyh Literature Club, nke bụ akụkụ nke netwọk nke ìgwè ndị yiri ya a na-ewere dị ka ndị na-eme ka akwụkwọ Eritrea dịghachi ndụ.[2] Ruo mgbe A machibidoro mgbasa ozi onwe onye n'afọ pụkụ abụọ na otụ, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nta akụkọ nwere onwe ya ma bipụta uri na magazin akwụkwọ. N'afọ pụkụ abụọ na abụọ, ọ gara ụlọ akwụkwọ ọzụzụ ndị nkuzi na isi obodo Asmara. Site na n'ọnwa Septemba n'afọ pụkụ abụọ na atọ ruo n'ọnwa Febụwarị n'afọ pụkụ abụọ na itoolu, ọ bụ onye edemede, onye na-eme ihe ngosi na onye nduzi mmemme na redio Redio Bana nke Ministry of Education nke Eritrea. N'ebe ahụ, o mepụtara akụkọ ahụike, gbaa ndị dọkịta ajụjụ ọnụ ma nye ozi gbasara HIV.[3]
Mkpọrọ na nchụpụ
[dezie | dezie ebe o si]N'onwa Febụwarị n'afọ pụkụ abụọ na itoolu, e jidere ya na ihe dị ka mmadụ rụrụ ịrị atọ ndị ọzọ n'ụlọ ọrụ redio ahụ, ọ bụkwa naanị nwanyị n'etiti ndị e jidere.[3][4] E boro ya ebubo na ya na ndị mgbasa ozi mba ọzọ nwere njikọ, ebubo ndị ọzọ gụnyere ebubo na ọ na-akpa nkata igbu onye isi ala na imerụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị.[5] Ọ nọrọ afọ abụọ mbụ ya n'ụlọ mkpọrọ naanị ya na ụlọ mkpọrọ Mai Swra, ebe a mekwara ya ahụhụ. Mgbe ọ nọsịrị afọ isii n'ụlọ mkpọrọ n'ebughị ebubo na n'ebuteghị ikpe, a tọhapụrụ ya n'afọ pụkụ abụọ na ịrị na ise. N'ihe dị ka n'afọ pụkụ abụọ na ịrị na asaa, ọ nwara ịgbapụ na mba Eritrea mana e jidere ya n'ókè ma tụọ ya mkpọrọ ọzọ ọnwa anọ. Mgbe a tọhapụrụ ya, o jisiri ike gbalaga mba Uganda. [6][7] Ndị nta akụkọ ndị ọzọ natara mmeso ọjọọ yiri nke ahụ gụnyere: Bereket Misghina, Basilios Zemo, na Meles Negusse Kiflu.[8]
N'ọnwa Disemba afọ pụkụ abụọ na ịrị na asatọ, ọ bịara Munich dị ka onye natara onyinye Writers-in-Exile site na PEN Center Germany. [9] Onye nọchiri ya n'ụlọ PEN bụ Stella Nyanzi . [10]
Abụ uri
[dezie | dezie ebe o si]N'afọ pụkụ abụọ na ịrị na itọọlu, o bipụtara uri narị na ịrị atọ e dere tupu a tụọ ya mkpọrọ na mgbe a tọhapụrụ ya n'ebe a chụgara ya. Ha pụtara na mbụ dị ka ኣለኹ (M dị ndụ) nke e dere na Tigrinya; n'afọ pụkụ abụọ na ịrị abụọ na abụọ e bipụtara nsụgharị German. [11] Dị ka onye na-ebipụta ya si kwuo, uri ndị ahụ na-adaba n'ụdị abụọ: "ịdị jụụ, ụjọ na obi umeala na obi ike" n'otu aka na "ebe kachasị elu nke esemokwu, agha nke omume rụrụ arụ na omume ọma, ime ihe ike na ikpe ziri ezi, mbibi na ịga n'ihu nke ọgbọ" n'akụkụ nke ọzọ, mkpagbu na ọnwụ. " N'afọ pụkụ abụọ na ịrị abụọ na abụọ, e bipụtara akụkọ mkpirikpi na edemede rụrụ onugugo ịrị atọ na atọ na mba Tigrinya ebe ọ tọhapụrụ onwe ya na mkpagbu ya ma họrọ isiokwu ndị nweere onwe ha. [12][1]
Edemsibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 Yirgalem Fisseha Mebrahtu (de-de). www.literaturportal-bayern.de. Retrieved on 11 November 2022.
- ↑ International (19 March 2019). 'Becoming a writer is an offense in the eyes of… (en). PEN International. Archived from the original on 11 November 2022. Retrieved on 11 November 2022.
- ↑ 3.0 3.1 Schriever (26 October 2020). München: Die Freiheit, zu sagen, was ist (de). Süddeutsche.de. Retrieved on 11 November 2022.
- ↑ (2010) Country Reports on Human Rights Practices: Report Submitted to the Committee on Foreign Affairs, U.S. House of Representatives and Committee on Foreign Relations, U.S. Senate by the Department of State in Accordance with Sections 116(d) and 502B(b) of the Foreign Assistance Act of 1961, as Amended (in en). U.S. Government Printing Office.
- ↑ Yirgalem Fisseha Mebrahtu (de-DE). Fritz Bauer Forum. Archived from the original on 6 December 2022. Retrieved on 11 November 2022.
- ↑ Noch immer am Leben. www.falter.at (13 November 2019). Retrieved on 11 November 2022.
- ↑ Yirgalem Fisseha Mebrahtu | Deutscher Kulturrat (de-DE) (27 May 2019). Retrieved on 11 November 2022.
- ↑ Srinivasan (1 June 2016). "Journalists' safety in the world's most restricted regime". Global Media Journal - African Edition 10 (2): 35–67.
- ↑ WiE-Stipendiat/innen (de-DE). PEN-Zentrum Deutschland. Archived from the original on 11 November 2022. Retrieved on 11 November 2022.
- ↑ Scherf (6 February 2022). Fünf für München: Doppelgänger, Farbenpracht und Sprachgewalt (de). Süddeutsche.de. Retrieved on 11 November 2022.
- ↑ Ich bin am Leben – Verlag Das Wunderhorn. www.wunderhorn.de. Retrieved on 11 November 2022.
- ↑ ኣለኹ (Alekhu) (en-GB). Retrieved on 11 November 2022.