Zainab Ahmed

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Zainab Ahmed
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoZainab Ahmed Dezie
Aha enyereZainab Dezie
aha ezinụlọ yaAhmed Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya16 Jụn 1960 Dezie
Ebe ọmụmụKaduna Steeti Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, accountant Dezie
ụdị ọrụ yapublic administration Dezie
onye were ọrụKaduna Steeti, Nigerian Telecommunications, Federal Government of Nigeria Dezie
Ọkwá o jiMinister of State for Budget and National Planning, Minister of Finance of Nigeria, Minister of Finance of Nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello, Mahadum Olabisi Onabanjo Dezie
ogo mmụtaBachelor of Science, Master nke Nchịkwa Azụmaahịa Dezie
Ebe obibiKaduna, Abuja Dezie
Ebe ọrụKaduna, Abuja Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1982 Dezie
affiliation stringNigeria, Budget and National Planning of Nigeria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Progressives Congress Dezie
so naWorld Economic Forum Annual Meeting 2020, World Economic Forum Annual Meeting 2023, IMF 2019 Annual Meetings, IMF 2019 Annual Meetings, IMF 2022 Annual Meetings Dezie
Onye òtù nkeNjikọ nke Ndị Naịjirịa Naịjirị, Nigerian Institute of Management Dezie

Zainab Shamsuna Ahmed (amụrụ 16 Juun 1960) bụ onye na-edekọ ego na Naịjirịa.[1] Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka ego, atụmatụ mmefu ego na mba site na 2019 ruo ugbu a.[2]

Mgbe arụkwaghịm nke onye mịnịsta na-ahụ maka ego Kemi Adeosun na Septemba 14, 2018, a họpụtara Zainab Ahmed ka ọ bụrụ Mịnịsta na-ahụ maka Ego na Septemba 2018.[3] N’afọ 2015, onye isi ala Muhammadu Buhari họpụtara ya dịka obere Mịnịsta na-ahụ maka atụmatụ mmefu ego na obodo.[4]

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ Ahmed na Kaduna Steeti . Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndrị na Queen Amina College, Kaduna, ma mesịa nwee A'Level na Zaria.[5] O nwetara nzere mbụ ya na mmuta Akaụntụ na Mahadum Ahmadu Bello na 1981, mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gara Mahadum Olabisi Onabanjo maka MBA ya.[6]

Ahmed nwetara MBA ya na August 2004 na Mahadum Ogun Steetị, Ago Iwoye; na BSc Accounting (1981) site na Mahadum Ahmadu Bello(ABU), Zaria; IJMB 'A' Levels (1979) site na SBS / ABU Zaria; na WASC 'O' Level na 1977 site na Queen Amina College, Kaduna.

Ọrụ [7][dezie | dezie ebe o si]

Zainab Shamsuna bụ Mịnịsta na-ahụ maka ego, atụmatụ mmefu ego na mba[8] nke Naijiria.

Zainab Shamsuna bụbu onye isi odeakwụkwọ gara aga na onye nhazi mba nke Nigeria Extractive Industries Transparency Initiative (NEITI). O sokwa na otu ndị isi NEITI abuo gara aga, na aru oru na NEITI na global EITI.

Onye na-ahụ maka ego site na ọzụzụ ya ma nwe nzere bachelor na mmuta banyere ego site na ABU Zaria na nzere masta na Business Administration (MBA), Ahmed, na ndekọ ndu ya, kwuru na ya nwere “oke omuma na ahụmahụ di iche iche na nhazi ma nchikwa ọrụ nke ndi obodo.”

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, Ahmed nwetere ọrụ na 1982 dị ka Akaụntụ II na Main Accounts nke Ministri okwu ego na Kaduna steetị ma e bulie ya na Akaụntụ I na March 1984, mana ọ gbara arụkwaghịm na 1985 iji sonyere NITEL. N'oge gara aga, ọ rụrụ ọrụ National Youth Service na Kaduna steetị na 1981/1982 ebe e zigara ya maka ọrụ mbụ ya na Messrs. Egunjobi Suleiman & Co. Chartered Accountants, ma jekwa ozi dị ka onye ọrụ ọzụzụ.

Ahmed arụọla ọrụ maka ndị Naịjirịa n'ọkwá dị elu dị iche iche, gụnyere onye isi nchịkwa nke ụlọ ọrụ ọchụnta ego nke Kaduna Steetị na Nigeria, yana onye isi ego nke ụlọ ọrụ nkwukọrịta ekwentị mkpanaaka Nigeria.[9] Ahọpụtara Zainab dịka Mịnịsta na-ahụ maka ego n'ụbọchị 21 nke August 2019 site n'aka onye isi ala.[10]

Ihe omume ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]