Gaa na ọdịnaya

Zoia Ceaușescu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Zoia Ceaușescu (Romanian pronunciation: [ˈzoja tʃe̯a.uˈʃesku]; 28 Febụwarị 1949 - 20 Nọvemba 2006) bụ onye Romania na-eme mgbakọ na mwepụ, nwa nwanyị nke onye ndú Kọmunist Nicolae Ceaușescu na nwunye ya, Elena na nwanne nwanyị nke Nicu Ceaușescu na Valentin Ceaușescu. A makwaara ya dị ka Tovarășa Zoia (comrade Zoia).Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:IPA/data' not found.Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:IPA/data' not found.Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:IPA/data' not found.

Akụkọ ndụ

[dezie | dezie ebe o si]
Zoia na nne ya Elena n'afọ 1978

Zoia Ceaușescu gụrụ akwụkwọ na High School nr. 24 (nke bụzi Jean Monnet High School ugbua ) di na Bucharest ma gụsịa n'afọ 1966. Ọ gara n'ihu na agụmakwụkwọ ya na Faculty of Mathematics, Mahadum Bucharest. Ọ nwetara nzere Ph.D. ya n'afọ 1977 na akwụkwọ edemede thesis nke isiokwu ya Intertwining Dilations nke o dere na nduzi nke Ciprian Foias . Ceaușescu rụrụ ọrụ dị ka onye ome nnyocha na Institute of Mathematics nke Romanian Academy na Bucharest malite n'afọ 1974. Ngalaba nkà ya bụ nnyocha ọrụ. A na-ekwu na ndị mụrụ ya enweghị obi ụtọ maka nhọrọ nwa ha nwanyị mere ime nchọpụta na mgbakọ na mwepụ, ya mere ụlọ ọrụ ahụ gbasara n'afọ 1975. Ọ gara n'ihu na-arụ ọrụ na Institutul pentru Creație Științifică și Tehnică (INCREST, Institute for Scientific and Technical Creativity), ebe o mechara malite ma duzie ngalaba ọhụrụ nke mgbakọ na mwepụ. N'afọ 1976, Ceaușescu natara ihe nrite Simion Stoilow Prize maka ntinye ya pụtara ìhè na sayensị mgbakọ na mwepụ.[1]

Ọ lụrụ Mircea Oprean, onye injinia na prọfesọ na Mahadum Polytechnic nke Bucharest n'afọ 1980 .

N'oge mgbanwe ọchịchị nke Romania, na 24 Disemba 1989, e jichiri ya maka "imebi akụ na ụba nke Romania", ma tọhapụ ya ka ọnwa asatọ gasịrị, na 18 Ọgọstụ 1990. Mgbe a tọhapụrụ ya, ọ gbalịrị ịlaghachi n'ọrụ mbụ ya na INCREST mana onweghị ike, mgbe áhụ ike gwụziri ya, ọ laa ezumike nká. Mgbe mgbanwe ahụ gasịrị, ụfọdụ akwụkwọ akụkọ kọrọ na ọ biịrị ndụ ọjọọ, nwee ọtụtụ ndị na-ahụ ya n'anya ma na-aṅụkarị mmanya.

Mgbe e gbusịrị nne na nna ya, gọọmentị ọhụrụ weghaara ụlọ ebe ya na di ya bi (e ji ụlọ ahụ mee ihe akaebe maka akụ na ụba a na-ebo ebubo na ọ bụ ihe há zuru n'ohi), ya mere ya na di ya gara bírí na nke ndị enyi na ndị ikwu ha.

Mgbe mgbanwe nke chụpụrụ ndị mụrụ ya gasịrị, Zoia kọrọ na n'oge ndị mụrụ ya nọ n'ọchịchị, nne ya rịọrọ Securitate ka ha na-elebara ụmụ Ceaușescu anya, ma eleghị anya, dịka ọ dị ya, n'ihi "mmetụta ịhụnanya". Securitate "enweghị ike imetụ" ụmụaka ahụ aka ka o kwuru, mana ozi ha nyere kpatara ọtụtụ nsogbu nye ụmụaka ahụ. O kwukwara na ikike nwere "mmetụta na-ebibi ihe" n'ebe nna ya nọ nakwa na ọ "tụfuru ikike ikpe ikpe ya".

Zoia Ceaușescu kwenyere na e lighị ndị mụrụ ya na Ghencea Cemetery; ọ nwara ka e gwupụta ozu ha, mana ụlọ ikpe ndị agha jụrụ arịrịọ ya. [citation needed] A bọpụtara ozu ndị ahụ maka nchọpụta ma kwado na ha bụ nke nne na nna ya n'afọ 2010, mgbe ọ nwụsịrị. [2] 

Zoia bụ onye na-esesi siga ike. Ọ nwụrụ n'ọrịa kansa akpa ume n'afọ 2006, mgbe ọ dị afọ iri ise nà asaa, e wee kpọọ ozu ya ọkụ na Cenușa Crematorium .

Akwụkwọ ndị e bipụtara a họọrọ

[dezie | dezie ebe o si]

Zoia Ceaușescu bipụtara akwụkwọ sayensị iri abụọ na abụọ n'etiti 1976 na 1988. Ụfọdụ n'ime ha bụ:

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. (1997) in Jaguszewski, Janice M.: Recognizing excellence in the mathematical sciences: an international compilation of awards, prizes, and recipients. Greenwich, Conn.: JAI Press. ISBN 0762302356. OCLC 37513025. 
  2. Exhumed Romania body is Nicolae Ceausescu, tests show. BBC News (3 November 2010). Retrieved on 12 December 2024.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  •  

Templeeti:Nicolae Ceaușescu