Ọrụ Bekee

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ọrụ Bekee bụ ọrụ ndi gụrụ akwụkwo, ndi ọkachamara na ndi maara nke ekwe na-akụ na nhazi na nchikọta ụlọ ọrụ. Aha na-ewu ewu a na-akpọkwa ya bụ Ọrụ Oyibo. Ihe a na-akpọkwanụ onye na-arụ ya bụ onye ọrụ oyibo[1] ma ọbụ onye ọrụ bekee. A na-ahụkarị ndi ọrụ bekee na ụlọ ọrụ goomenti nile, ụlọ ọba ego na nnukwu ụlọ ọru ebe a na-ede ma na ahazi akwụkwọ ọrụ. Ọ bụ orụ a na-ahụ dika ihe enweghi mgbakasi ahụ. Ọrụ a nwekwara nkwalite na ọkwa dika afọ ole onye ahụ rugoro. Nkea pụtara na mmadụ nwere ike site na ọbere onye rigide ruo na agadi na ọrụ oyibo. A na-akwụ ndi ọrụ bekee ụgwọ ọnwa, nke gbadoro ụkwụ na ọkwa[2] onye ahụ nọ. E nwere ọtụtụ ihe e jiri mara ndi ọrụ bekee. Ha gụnyere ụdiri ekike ha na-eke aga ọrụ, etu ha si eme omume na etu ha si ekwu okwu. Ka ọ di taa, e jizikwa igwe kọmputa[3] arụ ọtụtụ ọrụ na ụlọ ọrụ nile enwere ndi ọrụ bekee. Nwoke na nwanyi na-alụkwa ọrụ bekee mana onwere ọtụtụ ndi na-ekwetaghi na ụmụ nwanyi ha ga-arụ ọrụ bekee n'ihi na ha kwenyere na ụdiri ọrụ ahụ ga-eme ka ndi nwanyi ha waa nnukwu anya.[4] Ma ka ọ di ugbua, ọrụ bekee agazuola mba nile nakwa mmadụ nile.

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://www.bbc.com/igbo/afirika-43739384
  2. https://bli.ca/ig/%E1%BB%8Dm%E1%BB%A5m%E1%BB%A5-bekee-na-montreal/
  3. https://www.researchgate.net/publication/343558649_Igboscholars_International_Journal_OF_IGBO_SCHOLARS_FORUM
  4. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54111128