Anna Sharyhina

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Anna Sharyhina
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịYukrain Dezie
aha n'asụsụ obodoАнна Борисівна Шаригіна Dezie
Aha enyereAnna Dezie
aha ezinụlọ yaSharyhin Dezie
patronym or matronym for this personBorysivna Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1978 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye na-akwado ikike LGTI Dezie

Anna Borysivna Sharyhina (amụrụ ya na c.1978) bụ nwanyị Ukraine na-akwado ọrụ LBGT. Ọ bụ onye nkuzi nke Sphere Women Association, òtù ụmụ nwanyị nwere mmasị na nwanyị na mba Kharkiv, na nke NGO Kyiv Pride, kọmitii na-ahazi Pride Parade na Kiev . [1]

Sharyhina na onye ya na ya na-akpakọ, Vira Chemygina, etinyela aka na mpaghara LBGT nke Ukraine n' otu ndị nwanyị nwere mmasị na nwanyị. Ha haziri ije Kiev na ije izizi maka ịha nhatanha. Njem nke Kiev nke abụọ maka ịhe gbasara nhatanha, emere na 2015, ndị uwe ojii sooro ya ma nwee nkwado nke ọnụ ọgụgụ ọha na eze. Agbanyeghị, njem a were naanị nkeji iri na ise n'ihi oke ime ihe ike megide ndị mere ngaghari a ahụ. [1] Mmadụ iri, tinyere ndị uwe ojii na-eche ihe omume ahụ merụrụ ahụ. [2]

Sharyhina n'ọrụ LBGT enwela mmegide na-aga n'ihu na Ukraine. Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere LBGT n'ụlọ ebe a na-ere akwụkwọ na Kharkiv, ebughariri nzukọ ahụ ugboro abụọ: nke mbụ gaa na ebe mgbasa ozi ndị Kharkiv nke Nakipelo nakwa gaa na etiti Kolv Izolyatsiya. [3] Ndị na-ahụghị anya ji anwụrụ ọkụ buso PrideHub agha, bụ ebe etiti obodo Kharkiv, na July 2018; Ejiri grafiti na ọbara anụmanụ mebisịa ụlọ ahụ. Agbanyeghị na ọ bụ ndị uwe ojii mere mkpesa, na ihe karịr akwụkwọ mkpesa 1000 edegaara onye na-ahụ maka ime obodo Arsen Avakov, ọ nweghị onye ọ bụla tara ntaramahụhụ maka mpụ ahụ. [4] [5]

N'ọnwa atọ n'afọ 2019 Sharyhina so na ndị na-ahazi izu nke ịdị n'otu ụmụ nwanyị na Kharkiv maka izu mbụ nke Mach:

Ihe esi mee emume a bụ ibido n'isi nkewa ihe esi bido Ụbọchị Ụmụ Nwanyị na Mba Uwa mgbe ụmụ nwanyị zukọrọ maka oké ruru ha. Nke a bụ ụbọchị ịdị n'otu ụmụ nwanyị ọbughi maka oriri na ngwọri. Izu ịdị n'otu ụmụ nwanyị bụ oge mmụta tinyekwa na anyị dị n'otu abụghị maka imegide ihe kama maka ọdịmma ụmụ nwanyị, obodo ụmụ nwanyị nakwa maka mpaghara Ukraine niile.

Na Jenụwarị 2020 Sharyhina katọrọ Mike Pompeo maka ịga leta Ukraine na-ezukọghị ndị isi obodo LGBTQ. [4] [5]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]