Bankon language

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Bankon (Abo, Abaw, Bo, Bon) bụ asụsụ Bantu a na-asụ na ngalaba Moungo dịna Mpaghara Littoral nke ọdịda Cameroon. Ọ nwere ọdịdị okwu pasenti iri asatọ na isii ya na Rombi nke a na-asụ na ngalaba Meme dị na Mpaghara odịda.

Bankon bụ endonym. Abo bụ aha nchịkwa.

Ụdị dị iche iche[dezie | dezie ebe o si]

Otu puku narị atọ ndị na asụ asụsụ a mana Lombe na Bankon bụ olumba ofu asụsụ. Enwere ihe karịrị pasenti iri asatọ na atọ nghọta ọgụgụ isi na etiti ha.[1]

Ndị Barombi na-ekwu na ha si n'ala Abo, ndị Abo na-ekwukwa na ha sitere na Barombi. Dị ka akụkọ ọdịbendị agbụrụ dị n'ógbè ahụ si kwuo, nke si Congo, Nkon, nwa Lombi, biri na mpaghara ebe bu Bankon ma ọ bụ Abo ụbọchị ugbu a, ebe nna ya bụ Lombi gara n'ihu n'ebe ugwu chọta ebe obibi Barombi dịka ọdị ugbu a.[1]

Ndị nọ n'ebe ugwu nke Abo rutere n'oge adịbeghị anya bụ ndị Duala; nke a mere eji ewere ndị Abo dị ka ụmụnne nke Duala, ọbụnadị na ọ na-agbagwoju anya, asụsụ ha dị nso na otu Basaa. Ndị Abo (dị ka ndị Barombi niile) na-asụkwa Duala.[1]

Lombe, otu olumba nke ndị Barombi, na Mpaghara ndịda odịda anyanwụ na ebe atọ dị iche iche: abụọ nke dị na ngalaba Mémé. Nke mbụ dị n'ebe ugwu Cameroon na akụkụ Ọdọ Mmiri Barombi-Koto, nke abụọ dịkwa n'ebe ọdịda anyanwụ nke Kumba gburugburu Ọdọ mmiri Barombi Mbo (ha abụọ dị na obodo Kumba). Nke atọ, dị n'ebe ọdịda anyanwụ, dị na ngalaba Ndian, obodo Ekondo-Titi, n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke obodo Ekondo - Titi. Mpaghara atọ ahụ dị n'ime ndị na-asụ asụsụ Oroko n'ebe Ọwụwa Anyanwụ.[1]

Site na ọmụmụ agbụrụ / ọdịnala, Lombi bụ nna nna Nkon, bụkwa agbụrụ Bo, dịka usoro ọmụmụ nke Dika-Akwa chịkọtara si dị.[1]

A na-asụ Bankon na akụkụ ugwu ọnụ mmiri Wouri na nke obodo Dibombari (na ngalaba Mungo,na Mpaghara Littoral ) n'etiti asụsụ Mbo site na ugwu na ọdịda anyanwụ, na mpaghara asụsụ Duala n'ebe ndịda na ọwụwa anyanwụ.[1]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 (2012) in Binam Bikoi: Atlas linguistique du Cameroun (ALCAM), Atlas linguistique de l'Afrique centrale (ALAC) (in fr). Yaoundé: CERDOTOLA. ISBN 9789956796069.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "ALCAM2012" defined multiple times with different content