Eucharia Oluchi Nwaichi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Eucharia Oluchi Nwaichi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereEucharia Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
Ebe ọmụmụSteeti Abia Dezie
Ọrụ ọ na-arụbiochemist, toxicologist Dezie
onye were ọrụMahadum nke ọdụ ụgbọ mmiri-harcourt Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke ọdụ ụgbọ mmiri-harcourt Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2003 Dezie
Onye òtù nkeNext Einstein Forum, AAS Affiliates Programme Dezie

Eucharia Oluchi Nwaichi bu onye Naijiria no n'iru omumu na nkwado gburugburu ebe obibi, sayensi ala nakwa ihe gbasara ichoputa ma ala o di mma okuku ihe na ihe ndi ozo eji ala eme, a na-akpo toksikoloji (toxicology) n'asus bekee.

Ihe nchoputa ya na-eleba anya n'uzo esi edobezi ihe efu, uzo esi eme ka ihe efu hapu imebi gburugburu ebe obibi na odimma ihe mkpuru ndi akuru aku. O bu onye a ma ama n'ihe gbasasa nnwepu umu ola di iche iche na-emeru mmadu ahu, dika ola ndi bekee na-akpo cadmium, copper, mercury, lead, na umu ihe mmeru ahu a na-enwete na-aja ala n'adighi mma.

Ogugu Akwukwo na Ije Oru-Aka[dezie | dezie ebe o si]

Eucharia Oluchi Nwaichi nwetara Ph.D na  Mahadum Pot Hakot (Port Harcourt) ebe o guru BioChemistry. O mechakwara buru onye oke nkuzi na mahadum ahu. Tupu ya aburu onye oke nkuzi na Mahadum nke Pot Hakot, o ruru oru otu afo na Shell Oil Company site na afo 2009 rue na 2010.

Ndi otu L'Oreal-UNESCO nyere ya ihe nrite, ma mekwaa ya onye oke ochiho na mmuta na mpaghara ihe omumu sayensi anu-ahu a na-akpo Physical Sciences.  O so n'otu mmuta di iche iche dika Otu Kemikal Amerika (American Chemical Society), Otu Mba Ofesi N'ihe GbasaraTeknoloji Gburugburu Ebe Obibi (International SociEty For Environmental Technology), Otu Ndi Nlekota na Nchikota Ndi Naijiria (Nigerian Institute of Management) nakwa Otu Umu Nwanyi no na Mmuta Sayensi na Mba Ndi Ka N'Etolita Etoli (Organisation for Women in Science for the Developing World). .