Isaac Wright Jr.

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Isaac Wright Jr.
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Aha enyereIsaac Dezie
aha ezinụlọ yaWright Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya23 Jenụwarị 1962 Dezie
Ebe ọmụmụOrlando Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu, onye na-emeputa ihe ndeko Dezie
ebe agụmakwụkwọBerkeley High School, Thomas Edison State University, St. Thomas University School of Law Dezie
suffix ọgbọL252247-F2 Dezie

Isaac Wright Jr. (amụrụ na Jenụwarị 23, 1962) bụ ónyé ọka iwu America, onye ndụmọdụ, onye ọchụnta ego, na ónyé ọrụ ebere.[1] A maara ya nke ọma maka ebubo ụgha ma maa ya ikpe dị ka onye na-ere ọgwụ ọjọọ ma maa ya mkpọrọ ndụ ya niile na 1991 na-eche ebubo iri metụtara ire cocaine ihu. A tụgharịrị ikpe ya n'afọ 1997 mgbè ikpe ọ wetara n'ihi nrụrụ aka ndị uwe ojii n'oge nyocha ya na ónyé ọkàiwu maara na ọ na-agba akaebe ụgha na ikpe ya. A na-egosi akụkọ ya na ihe nkiri telivishọn / usoro ihe nkírí "For Life", nke gosipụtara na 2020 na American Broadcasting Company. Ọ bụ ónyé na-azọ ọkwa onye isi ọbọdọ nke New York City na ntuli aka ónyé isi ọbọdọ New York City nke 2021.[2]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Wright na Jenụwarị 23, 1962, na Orlando, Florida, nke Isaac Wright Sr. na Sandra B. Wright.[3] Nna Wright bụ ónyé agha na-arụ ọrụ ma Wright biri n'ọtụtụ ọbọdọ dị na US na mbà ofesi. Ọ gàrà Berkeley High School na Moncks Corner, South Carolina.[4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Na mbido afọ 1980, Wright, mgbè ya na nwunye ya na nwa ya nwanyị bi na New York City, pụtara na ihe ngosi talent Star Search ruo ọtụtụ izu dị ka Ónyé otu egwu egwu atọ Uptown Express. Ka ọ na-erule ngwụcha afọ 1980 ọ bụ ónyé njikwa nkà ma nwee akara ndekọ onwé ya a na-akpọ X-Press Records mgbe nwunye ya, Sunshine, bụ ónyé otu na-ere platinum nke ọ kwadoro nke a na- bingaka The Cover Girls, otu egwu pop na nke ọbọdọ.

Njide na ịtụ mkpọrọ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1989, e jidere Isaac Wright Jr. ma boo ya ebubo ụgha na ọ bụ ónyé isi n'azụ otu n'ime nnukwu netwọk nkesa ọgwụ na mpaghara New York / New Jersey.[5] Mgbè e jidere ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ, e kpere ya ikpe na 1991 ma maa ya ikpe n'okpuru iwu ọgwụ ọjọọ nke New Jersey.[6] E mechara maa ya ikpe ịga mkpọrọ ndụ ya niile n'ihi ikpe a mara ya na ngụkọta afọ 72 màkà ebubo ndị ọzọ.[6][5]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Official website

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]