Megan Sneddon

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Megan Sneddon
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịObodoézè Nà Ofú Dezie
obodo maka egwuregwuScotland Dezie
Aha enyereMegan Dezie
aha ezinụlọ yaSneddon Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya9 Septemba 1985 Dezie
Ebe ọmụmụBellshill Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheetiti etiti Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
nọmba egwuregwu9 Dezie

Megan Burns (née Sneddon; amụrụ n'abalị itoolu nke ọnwa Septemba afọ 1985) bụ onye Scotland na-agba bọọlụ nke na-agba bọọlụ Motherwell na Premier League ụmụ nwanyị Scotland. Sneddon gbara bọọlụ nke mbụ ya na Scotland mgbe ọ dị afọ iri na isii ma nwee egwuregwu otu narị na iri atọ nke ndị otu mba.

Ọrụ klọb[dezie | dezie ebe o si]

Sneddon nọrọ afọ ise na Kilmarnock,ma nwee mmeri okpukpu atọ n'afọ 2002 mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii. N'ọnwa Julaị afọ 2006, ọ sonyeere Glasgow City. N'abalị iri na asatọ n'ọnwa Eprel afọ 2010, e gosipụtara mpụtara ya ya na klọb ahụ ka ọrụru ugboro otu narị na na mmeri goolu anọ asatara abụọ na megide ndị Spartan.[1]

N'ọnwa Febụwarị n'afọ 2011, a kpọrọ Sneddon n'ime ndị otu Scotland's Cyprus Cup, nke edepụtara dị ka onye egwuregwu Liverpool.[2] O kpebiri ịhapụ Glasgow City mgbe ọ na-enweghị afọ ojuju na klọb ahụ.[3] Sneddon gbara mpụtara nke mbụ ya nke klọb FA WSL na mmeri enyi na enyi na Hibernian.[4] Otú ọ dị, na mbido oge bekee Sneddon bịanyere aka na Celtic. O kwuru ihe kpatara ya tinyere ndụmọdụ nke onye nkuzi Scotland bụ Anna Signeul maka mkpebi ahụ.[5]

Sneddon bịanyere aka na Rangers na ọnwa Jenụwarị 2013.

N'abalị iri na itoolu n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2015, Sneddon sooro ọtụtụ ndị otu Scotland ya site n'ịbịanye aka na Motherwell nwere ịnụ ọkụ n'obi.[6] O kwuru banyere ịbịanye aka ya: "Obi dị m ụtọ na Motherwell enyewo m ohere ịmalite ọrụ m. Anọ m na-atụ anya ịlaghachi n'ámá egwuregwu ebe ọ bụ na ọ fọrọ nke nta ka m kụọ bọọlụ kemgbe Nọvemba. Ọ ga-adịkwa mma igwu egwu n'akụkụ ụfọdụ ihu ama. "

Ọ bịanyere aka na Motherwell ọzọ n'afo 2018.[7]

Ọrụ mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Sneddon na-egwuri egwu maka Scotland na 2009

Sneddon gbara egwuregwu mbụ ya na Scotland ka oforo otu ụbọchị tupu afọ iri na asaa ya, na mmeri goolu asatọ asatara abụọ nke United States na mba Columbus, Ohio.[8]

A họpụtara Sneddon maka ndị otu ụmụ nwanyị Scotland nọ n'ihi ndị n'erubeghi afọ iri abụọ na anọ ka ha gbaa bọọlụ na asọmpi Nordic n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2008. Ọ bụ onyeisi ndị otu ahụ na asọmpi ahụ.[9][10]

N'ọnwa Disemba afọ 2011, Sneddon bụ otu n'ime ndị egwuregwu Celtic anọ a bịakwutere maka igba egwuregwu bọọlụ nyee otu GB na Olympics afọ 2012 .[11]

Ọ kwụsịrị ọrụ mba ụwa ya mgbe Scotland erughi n'ogo ndị tozuru na asọmpi iko mba uwa nke FIFA kwadoro nke afọ 2015 akpọrọ 2015 FIFA Women's World Cup, na nkatọ ọkatoro n'ihu ọha usoro Anna Signeul ma na-ekwu maka ihe isi ike ndị egwuregwu nwere nkwa ịgba bọọlụ dị iche iche maka klọb na mba n'elu ọrụ na-abụghị egwuregwu ahụ.[12][7]

Nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

Nke Onwe[dezie | dezie ebe o si]

  • East Kilbride Nwanyị Egwuregwu nke Afọ: 2008[13]
  • Onye omere South Lanarkshire nke ndị toro eto: 2009[14]
  • Onye egwuregwu mba ụwa nke afọ nke Scottish FA: 2011[15]
  • Onye egwuregwu SWPL nke afọ : 2013[16]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta nke ụmụ nwanyị na-agba bọọlụ nwere 100 ma ọ bụ karịa okpu
  • Scottish FA Women's International Roll of Honour

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Megan Sneddon hits 100. Glasgow City F.C. (22 April 2010). Retrieved on 29 September 2018.
  2. Scotland Cyprus Cup squad. Women's Soccer Scene (2011-02-19). Archived from the original on 2011-09-27. Retrieved on 2011-03-01.
  3. Paul Thomson (2011-02-23). Football: Megan heads to top English club. East Kilbride News. Retrieved on 2011-03-01.
  4. Liverpool give Scots trio debuts. She Kicks (2011-03-01). Archived from the original on 1 April 2012. Retrieved on 2011-03-01.
  5. Paul Thomson (2011-04-13). Football: Megan gives up Liverpool chance for Scotland. East Kilbride News. Retrieved on 2011-04-13.
  6. Ladies sign midfielder Megan Sneddon. Motherwell FC (2015-08-19). Retrieved on 2015-08-19.
  7. 7.0 7.1 All shaping up Well for Eddie Wolecki Black, Alan Campbell, The Herald, 6 May 2018
  8. Paul Thomson (2010-07-21). Football: Megan to mark another milestone for Scotland. East Kilbride News. Retrieved on 2011-02-18.
  9. U23: Scotland 0-5 Switzerland scottishfa.co.uk.
  10. U23: Scotland 0-3 Sweden scottishfa.co.uk.
  11. Olympic approach for four Scottish women. BBC Sport (2011-12-23). Retrieved on 2011-12-23.
  12. Megan Sneddon slams Scotland tactics: Midfielder hits out at boss Anna Signeul after World Cup playoff loss, Paul Thomson, Daily Record, 5 November 2014
  13. Megan Sneddon is EK Female Sports Personality of the Year. Glasgow City F.C. (30 March 2009). Retrieved on 29 September 2018.
  14. Megan lands prestigious award. Women's Soccer Scene (31 August 2009). Archived from the original on 29 September 2018. Retrieved on 29 September 2018.
  15. Shannon honoured with top award. Women's Soccer Scene (2 December 2011). Archived from the original on 22 January 2020. Retrieved on 29 September 2018.
  16. Megan Sneddon is Player of the Year. Women's Soccer Scene (23 November 2013). Archived from the original on 7 August 2018. Retrieved on 29 September 2018.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]