Jump to content

Mertlene Perkins

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mertlene Perkins
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
aha ezinụlọ yaPerkins Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya1917 Dezie
Ebe ọmụmụGastonburg Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya2015 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ese Dezie
agbụrụNdi Afrika nke Amerika Dezie
onye nnọchite anya nwebiisinkaikike mmeputakwa nke CISAC-otu nọchiri anya ya Dezie
Nwere ọrụ na mkpokọtaMetropolitan Museum of Art Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie

Mertlene Perkins (1917-2015) bụ ónyé America na-ese ihe. A na-ejikọta ya na ndị otu Gee's Bend quilting collective.[1][2] E gosipụtara ọrụ ya na Museum of Fine Arts, Houston ma tinye ya na nchịkọta nké Metropolitan Museum of Art.[3][4]

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

Nné na nnà Perkins bụ Maggie Tripp na Isom Martin, n'otu n'otu. Nne ya bụ ónyé ọrụ ugbo na nnà ya na-arụ ọrụ n'ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Ọ hụrụ ya n'anya ịnọnyere nne ya, ya mèrè ọ malitere inyere aka n'ugbo ahụ n'oge ọ nwèrè ike, ihe dị ka afọ asatọ. Ha na-azụkarị ogho, ahụekere ọka, na poteto.[3]

Ọ gàrà ụlọ akwụkwọ afọ itoolu na Prairie, Alabama Ọ lụrụ Herman Perkins mgbè ọ dị afọ iri na itoolu. Ha zụlitere ụmụ iri na abụọ ọnụ, itoolu n'ime ha dị ndụ ruo mgbè ha toro.[3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Perkins mụtara ịkpa ákwà n'aka nne ya na nné nne ya. Quilting bụ ihe na-atọ Perkins ụtọ. N'ịgbaso omenala nke Gee's Bend improvisation style, ọ na-ekwu na "M na-eme akwa nke m. Anaghị m eso echiche ónyé ọ bụla ma e wezụga nke m. "[3]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Beardsley (2002). Gee's Bend: The Women and Their Quilts (in en). Tinwood Books. ISBN 9780971910409. 
  2. Arnett (2006). Gee's Bend: The Architecture of the Quilt (in en). Tinwood Books. ISBN 9780971910478. 
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Mertlene Perkins | Souls Grown Deep Foundation. www.soulsgrowndeep.org. Retrieved on 2019-04-22.
  4. Mertlene Perkins | Birds in Flight quilt. www.metmuseum.org. Retrieved on 2019-04-22.