Ndị otu Robert Scott

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ndị otu Robert Scott
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Aha enyereRobert Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya13 Disemba 1874, 1874 Dezie
Ebe ọmụmụAberdeen Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1 Ọktoba 1939, 1939 Dezie
Ọrụ ọ na-arụforestry scientist, botanist Dezie
onye were ọrụUniversity of Oxford Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Aberdeen, Aberdeen Grammar School Dezie
Onye òtù nkeRoyal Society Dezie
Ihe nriteFellow of the Royal Society, Companion of the Order of St Michael and St George, Companion of the Order of the Indian Empire Dezie

Robert Scott Troup CMG CIE FRS (13 Disemba 1874 - 1 Ọktoba 1939) bụ onye Britain ọkachamara n'ọhịa. Ọ nọrọ akụkụ mbụ nke ọrụ ya na Colonial India, laghachi England na 1920 iji duzie Oxford's School of Forestry.

Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

Troup gụrụ akwụkwọ na Aberdeen Grammar School na Mahadum nke di na obodo Aberdeen . Mgbe ahụ, ọ banyere na Cooper's Hill Koleeji, nke zụrụ ndị injinia na ndị na-elekọta ọhịa maka ọrụ India; n'ebe ahụ ka ọ zụrụ n'okpuru William Schlich.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Troup sonyeekwaziri Imperial Forestry Service n’afo 1897 ma ziga ya na Burma dịka osote onye na-elekọta ọhịa. N'afọ 1905, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye na-ahụ maka akụ na ụba ọhịa na Imperial Forest Research Institute na College ọhụrụ dị na Dehra Dun, n’obodo India. N'afọ 1915, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote onye nyocha nke ọhịa. N'afọ 1917-1918 ọ rụkwara ọrụ dị ka onye na-ahụzikwa maka ihe ndị e ji osisi mee na ụlọ ọrụ Indian Munitions Board.

Ọ kwụsịrị ọrụ ya na ebe oru Imperial Forestry Service dịka Inspector-General of Forests of Burma.

N'afọ 1920, Troup laghachiri na United Kingdom iji were oche nke Forestry na Mahadum Oxford, site na William Schlich, onye ọ gụrụ akwụkwọ na Cooper's Hill.[1] A họpụtara Troup ka ọ bụrụ Fellow nke St John's College, Oxford.

Bido n’afo 1924 ruo afo 1935 ọ bụ onye guzobere Director nke Oxford's Imperial Forestry Institute. A họpụtara ya dịka Fellow nke Royal Society (FRS) n’afo 1926.[2]

A họpụtara ya ka ọ bụkwazi onye ibe nke Order of the Indian Empire (CIE) n’afo 1920 New Year Honours na onye ibe nke Ordin of St Michael and St George (CMG) n’afo 1934.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

E bipụtara akwụkwọ atọ nke Troup dere bụ; The Silviculture of Indian Trees n’afo 1921. O dekwara Indian Forest Utilisation, Pinus Longifolia, Silvicultural Systems, A Manual of Forest Mensuration, Forestry and State Control and Exotic Forest Trees in the British Empire (nke a bukwa n’afo 1932).

Ihe edeturu n'okpuru ala[dezie | dezie ebe o si]

  1. Burley, Jeffery, et al. 2009. "A History of Forestry at Oxford", British Scholar, Vol. 1, No. 2., pp.236-261. Accessed: 6 May 2012.
  2. Stebbing (1940). "Robert Scott Troup. 1874-1939". Obituary Notices of Fellows of the Royal Society 3 (8): 217–226. DOI:10.1098/rsbm.1940.0018. 

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]