Rania El-Mashat

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Rania Al-Mashat
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịEgypt Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20 Jụn 1975 Dezie
Ebe ọmụmụCairo Dezie
Asụsụ obodoEgyptian Arabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Egyptian Arabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụeconomist, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of Tourism, Minister of International Cooperation Dezie
ebe agụmakwụkwọThe American University in Cairo, University of Maryland Dezie
affiliationCentral Bank nke Egypt Dezie
affiliation stringCentral Bank of Egypt, International Monetary Fund (IMF), Minister of International Cooperation of Egypt, Arab Republic of Egypt Dezie

Rania A. El-Mashat (amụrụ na abalị iri abụọ n'ọnwa Jun afọ 1975) bụ onye Egypt na-ahụ maka akụ na ụba na ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ bụ ya bụ Minista na-ahụ maka imekọ ihe ọnụ na mba ụwa ugbu a na onye bụbu Minista maka njem nlere anya site na 2018 ruo Disemba 2019.[1] Ọ nọbu n'ọkwá dị elu na ụlọ ọrụ International Monetary Fund na Washington DC ya na Oba ego gọọmenti etiti mba Ijipt (Central Bank of Egypt)

Amụrụ El-Mashat na Cairo di na mba Egypt nye Abdel Monem El Mashat, onye ọkammụta na ngalaba Sayensị ndọrọndọrọ ọchịchị (political science )na Mahadum Cairo na Nagwa el-Attar, onye rụrụ ọrụ na Mahadum Ain Shams.[2][3] O ji nzere Bachelọ Ịkọnọmiks pụta na Mahadum Cairo (AUC) n'afọ 1995.[4] A họpụtara nna ya dịka onye ndụmọdụ na ngalaba omenala na agụmakwụkwọ na ụlọ ọrụ n'ahụ maka ime njem baa ala Egypt nke dị na Washington DC n'afọ 1995, Al-Mashat ewee debanye aha na mahadum Maryland di nso ébé ahu,[3] ebe ọ nwetara nzere Mastas n'afọ 1998 nwetakwa nzere P.hD n'afọ 2001,[3][5] na nkega nke mkpata na mmefu mba ụwa (International Economics) nke gbasara ego na nhazi ojiji ụgwọ (Monetary Policy and Debt Management .[2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

El-Mashat rụrụ ọrụ dị ka onye na-ahụ maka akụ na ụba ụlọ ọrụ International Monetary Fund dị na Washington DC site na Jun 2001 ruo Julaị 2005.[3][4] Mgbe ọ malitere na IMF, mgbe ọ dị afọ iri abụo na ise, ọ bụ onye kachasị bụrụ obere nwa na-arụ ọrụ n'ebe ahụ.[6][5][7] Ọ rụrụ ọrụ na mmemme ha, na India, Vietnam, na Gambia.[2]

N'ọnwa Ọgọstụ afọ 2005, El-Mashat laghachiri Ijipt na òkù nke Minista na-ahụ maka itinye ego Mahmoud Mohieldin kpọrọ ya, iji nye aka melite usoro na mmekọrịta ụlọ akụ ala ahụ, ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka osote gọvanọ na onye isi nke Ngalaba Iwu Ego maka Ọba ego gọọmenti etiti mba Egypt (Central Bank of Egypt)ruo Mee afọ 2016.[7][6][3][4][5] Mgbe mgbanwe ọchịchị nke afọ 2011 gasịrị, o nyere aka hazie ma gosipụta usoro omume gbasara akụ na ụba nke gọọmentị.[5] Ọ kụzikwaara akụ na ụba na Mahadum America dị na Cairo ma rụọ ọrụ na bọọdụ nke mgbanwe égo Egypt, Ọba ego Arab ya na Middle East Economic Association.[8][2]

N'ọnwa Ọgọstụ 2016, El-Mashat laghachiri na mba America mgbe a họpụtara ya dị ka onye ndụmọdụ nke onye isi nchịkwa nke IMF, Maurice Obstfeld.[3][9] O kwuru banyere ọrụ a, "Echere m na ahụmịhe m nwere bụ ime ndị karịrị m n'ọ́kwa Ihe ịtụ n'anya mgbe niile site n'ịbụ nwanyị Arab eji eme ọnụ".[7] N'afọ 2017, o sonyere na ndị òtù ọ̀kaikp

nke

nke World Economicna ihe nke emere a kpọrọ "Investing In Peace", nke mere eji denye aha ya n'ime mmadụ iri bu ọpụrụiche, ndị eweere ihe ntinye ucheobi ha dika ndi a ga-ekwu mFkaoha ma enwewe mkparịtaụka n'isiokwu bụ anyere "ime ka ụwa bụrụ ebe ziri ezi".[4]

Na Jenụwarị afọ 2018, Praịm MinistaSherif Ismail họpụtara El-Mashat dika minista njem nlere anya nke mba Egypt nke meziri ka ụmụ nwanyị so na òtù ndị ọrụ ya dị isii.[10][11] El-Mashat ghọziri nwanyị mbụ rúrú ógó minista na mba Ijipt, bụrụkwa ya bụ minista kacha bụrụ obere nwa n'oge ahụ.[3] N'ọrụ a, ọ na elekata Bọọdụ n'akwalite n'ahụ maka njem nlere anya mba Ijipt (Egyptian Tourism Promotion Board) nakwa the Tourism Development Authority.[3] O mèchàrà kwuo na nhọputa a tụrụ ya anya mana o mèchàrà ghọta na onye isi ala mba Egypt chọrọ ka ngalaba njem nlere anya ala ahụ bụrụ nke emeturu aka n'ụzọ pụrụ iche. Njem nlere anya na enye ala Egypt ego ruru pesentị iri na ise ruo pesentị iri abụọ nke ego niile gọọmenti Ijipt n'akpata.[12]

N'ọnwa Ọktoba 2018, El-Mashat duuru nwunye onye isi ala mba Amerika Melania Trump gaa njem nleta, gosi ya Giza Pyramids, na-ekwu na nleta ahụ gosipụtara ozi nke "Nchebe na nchekwa Ijipt n'ụwa".[13] Na Jenụwarị 2019, El-Mashat kwupụtara na a ga-amalite nnukwu ụlọ ngosi ihe mgbe ochie nke Ijipt n'afọ 2020 ma bụrụ nke ụlọ ọrụ onwe ga-achịkwa dị ka akụkụ nke atụmatụ gọọmentị ịchekwa ọtụtụ ebe ochie.[14] Al-Mashat bụ otu n'ime ndị ọkà okwu isii na World Tourism Forum na Lucerne na Mee 2019.[15]

El-Mashat ekwuola maka ịha nhatanha nwoke na nwanyị na mkpa agụmakwụkwọ dị, na-ekwu sị, "Nye ụmụ agbọghọ Ijipt niile, nọgide na-itinye ego na agụmakwụkwọ gị. Ụwa nọ na-asọmmpi nke ukwuu nke bụ na ihe ị maara bụ ihe na-eme ka ị dị iche na onye ọ bụla ọzọ.[6]

Ihe nrita na nkwanye ùgwù ndị O nwetagasịrị[dezie | dezie ebe o si]

Al-Mashat natara 2013 Distinguished Alumni Award site na AUC.[4] N'afọ 2014, World Economic Forum kpọrọ ya "Onye ndu ụwa na-eto eto".[3][4] N'afọ 2015, a kpọrọ ya otu n'ime ụmụ nwanyị iri ise kachasị nwee mmetụta na akụ na ụba Ijipt.[7]

Na Maachị 2021, Al-Mashat natara onyinye "Ndị nọ n'ihu n'iweta Mgbanwe" n'oge emume jikọrọ aka nke Embassies nke Mexico, Canada, na Sweden haziri na Cairo.[16]

N'ọnwa Disemba afọ 2022, Al-Mashat natara ihe nrite maka "Most Visionary and Outstanding Minister of International Cooperation of 2022 n'Africa", nke George Washington University Institute of African Studies na GE7 Initiative nyere ya na Ọgbakọ ndị ndú mba ụwa ndị nwere ebumnobi ọdịnihu dị mma (World Visionary Leaders'Summit) nke emere na Washington D.C.[17]

Al-Mashat bụ onye Alakụba ma ọ gara njem ala nsọ mbụ ya na Mecca n'afọ 1997.[12]

  1. رانيا المشاط وزيرة التعاون الدولى.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Al-Mashat (12 December 2016). "Playing an Active Policy Role within the Government", in Samia Spencer: Daughters of the Nile: Egyptian Women Changing Their World. Cambridge Scholars Publishing, 37–46. ISBN 9781443844956. 
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 3.5 3.6 3.7 3.8 Rania Al-Mashat, ECON PhD '01. College of Behavioral and Social Sciences, University of Maryland. Archived from the original on 2023-06-16. Retrieved on 2023-06-16.
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 4.4 4.5 AUC Alumna Rania Al-Mashat Egypt's New Minister of Tourism. The American University in Cairo.
  5. 5.0 5.1 5.2 5.3 Grant (January 23, 2018). Egypt's first female minister of tourism is a UMD grad. The Diamondback. The University of Maryland. Archived from the original on April 1, 2019. Retrieved on April 1, 2019.
  6. 6.0 6.1 6.2 What You Need To Know About Egypt's First Ever Tourism Minister. Cairo Scene (January 14, 2018). Archived from the original on April 1, 2019. Retrieved on April 1, 2019.
  7. 7.0 7.1 7.2 7.3 Hassan (January 14, 2018). Meet Egypt's tourism minister, former monetary policy maker. Egypt Today. Retrieved on April 1, 2019.
  8. Al Sherbini (June 21, 2018). Ministerial portfolios boost Egyptian women's gains. Gulf News. Retrieved on April 1, 2019.
  9. Rania Al-Mashat to be new senior advisor to IMF. Albawaba (July 31, 2016). Retrieved on April 1, 2019.
  10. Tawfeek (January 15, 2018). Meet Rania Mashat, Egypt's first female Tourism Minister, set to revolutionize the industry. Egypt Independent. Retrieved on April 1, 2019.
  11. El-Wardany (January 14, 2018). Egypt Replaces Tourism Minister in Reshuffle. Bllomberg. Retrieved on April 1, 2019.
  12. 12.0 12.1 Nugali (November 26, 2018). Exclusive: Egypt's first female Tourism Minister talks about Red Sea project and future plans. Arab News. Retrieved on April 1, 2019.
  13. Al-Youm (October 7, 2018). Ministers of tourism, antiquities escort Melania Trump to Pyramids. Egypt Independent. Retrieved on April 1, 2019.
  14. Egypt's Grand Museum to be run by private sector: Min. of Tourism. Egypt Today (January 25, 2019). Retrieved on April 1, 2019.
  15. Taylor (January 25, 2019). Al Mashat to address World Tourism Forum. Travel Weekly. Retrieved on April 1, 2019.
  16. StackPath.
  17. Rania Al-Mashat awarded 2022's most visionary, outstanding Int'l Cooperation Minister in Africa. EgyptToday (2022-12-14). Retrieved on 2023-02-23.