Sam Brown (Rastafari)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ras Sam Brown (16 Disemba 1925 - Ọgọst 1998) bụ onye ike Rastafari nke Jamaica.

Akụkọ Banyere Ya[dezie | dezie ebe o si]

A maara ya nke ọma na Kingston maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya mgbe o sonyere na ntuli aka nke 1961 ya na ndị otu ya bụ Otu Ndị na Ata Ahụhụ. O nwetara ihe na-erughị 100 vootu. N'agbanyeghị kwa n'ọbụ Otú ọ onye Rasta mbụ ị pụta maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mmetụta ya dị ukwuu karịa ihe ọnụ ọgụgụ a na-atụ aro. N'oge ahụ, e nwere mmetụta zuru oke na ije Rastafarian na ndị Rastas anaghị atụ vootu.

Leonard E. Barrett gụnyere ajụjụ ọnụ ya na Brown n'akwụkwọ ya nke 1977 Ndị Rastafarians ndị ọ kọwara dị ka "otu n'ime ndị mmadụ kachasị mgbagwoju anya n'ime ije Rastafarian". Barrett nyekwara ihe ndị akụkọ sitere na akwụkwọ mkpọsa ntuli aka Brown. [1] Barrett na-a tu aka na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Brown dị ka Otú Ndị Ojii karịa ma Otú Ndị N'ata Ahụhụ, ọ bụ ezie na ọ na-ekwukwa ọnọdụ nke òtù ahụ na mmadụ niile nweere onwe ha isonye n'agbanyeghị ụcha ahụ ha. Ọzọkwa gụnyere n'akwụkwọ ya bụ foto nke nwere isiokwu "foto dị ụkọ nke akara ndọrọ ndọrọ ọchịchị Rastafarian", na-egosi otu ndị Rastafarians (otu n'ime ha nwere ike ịbụ Brown) kwuru n'akụkụ bọọdụ na-akpọsa mkpọsa Brown.

N'afọ 1996, Brown bụ ziri nwa afọ nke egwú reggae na onye na-ede uri na abọm akpọrọ Akụkọ, ochie na-ugbua. Ọ nwụrụ mgbe ọ na-aga ngosi azụmahịa mba ụwa na Barbados na 1998.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

O jiri ohere mmetụta ya n'ime òtù ahụ nye Rastafari ụkpụrụ iri abụọ na otu nke enwere ike ịchịkọta n'ime iri, dịka ya onwe ya kwuru na akụkọ mkpa n'ime ije Rastafarian, agu'm akwụkwọ Caribbean 1966, Vol. 6,1:40 :

"Rastafarian bụ onye na-egbu ikpere n'ala nye Chineke (Rastafari) naanị. Anyị bụ ndị na-erube isi n'iwu omume ọma na nke Chineke, dabere na ụkpụrụ nke Mozis:

(1) Anyị jiri ike jụụ ihe ọbụla dị nkọ eji emebi onyinyo nke mmadụ, dịka ọmụmaatụ, ịkpụcha na ịkpụ afụ ọnụ, igbu egbugbu nke ahụ, ịkpụ anụ ahụ.

(2) Anyị bụ ndị na-eri akwụkwọ nri, na-ejikarị anụmanụ ụfọdụ eme ihe ma na-ama iwu iji anụ ezì eme ihe n'ụdị ọ bụla, azụ mkpokoro, azụ na-enweghị ntụpọ, ejila wdg.

(3) Anyị anaghị efe ofufe ma na-elepu anya na Chineke ọ bụla karịa Rastafari, na-ama iwu iju ofufe ndị ọgọ mmụọ ndị ọzọ niile iwu ma na-asọpụrụ ndị kwere ekwe niile.

(4) Anyị hụrụ ụmụnne nwoke nke mmadụ n'anya ma kwanyere ùgwù, mana ịhụnanya mbụ anyị bụ ụmụ Ham.

(5) Anyị anaghị akwado ma kpọọ kwa asị ikpoasi, obi ofu, ị tu asị, aghụnanya, aghụhụghọ, wdg.

(6) Anyị ekwenyeghị na obi ụtọ nke ọha nke oge a na ihe ọjọọ nke oge a.

(7) Anyị ṅụrụ iyi ịmepụta usoro ụwa nke otu nwanne.

(8) Ọrụ anyị bụ ịnye aka ọrụ ebere nye nwanne ọ bụla nọ na nsogbu, nke mbụ n'ihi na ọ bụ nke usoro Rastafari - nke abụọ bụ ị nye mmadụ ọ bụla, anụmanụ, osisi, wdg, n'otu aka ahụ.

(9) Anyị n'esochi iwu oge ochie nke Etiopia.

(10) Ị gaghị eche echiche banyere enyemaka, utu aha na ihe onwunwe nke onye iro n'ime egwu ya nwere ike ịchọ inye gị; mkpebi maka ebumnuche gị bụ ịhụnanya nke Rastafari."

<<N'ime mba ọ bụla n'ụwa taa ị na-ahụ Rasta. N'ụdị agba ọ bụla, n'ụdị agbụrụ ọ bụla ị ga-ahụ ndị Rasta, "ọcha", "acha ọcha", "acha odo", "acha ọbara ọbara" na onyinyo niile dị n'etiti.>> - Ras Sam Brown [1]

Ebe'm Si De[dezie | dezie ebe o si]

  1. Barrett, The Rastafarians, Kingston & London: Sangsters/Heinemann, 1977.