Jump to content

Sekai Nzenza

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sekai Nzenza na 2023
Sekai Nzenza
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịZimbabwe Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya1959 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of Industry and Commerce, Minister of Public Service, Labour and Social Welfare Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Melbourne Dezie

Sekai Irene Nzenza Kanhutu bụ onye edemede Zimbabwean, onye nkatọ ọdịbendị na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. [1]

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya n'ime ime obodo Zimbabwe, ebe ọ zụrụ dị ka nọọsụ, tupu ọ gụchaa akwụkwọ nọọsụ ọzọ n'England ma mesịa gaa biri na mba Australia.[2] O nwere ọkwa dị elu na mpaghara Melbourne na Los Angeles . [3]

E bipụtara akwụkwọ mbụ ya, 'Zimbabwean Woman: My Own Story', n'afọ 1988. Akwụkwọ ya bụ 'Songs to an African Sunset' (1997) kọwara nloghachi ya n'obodo ezinụlọ ya na mbido afọ 1990. [4] O nwere Ph.D. na International Relations site na Mahadum Melbourne.

Sekai dere kọlụm kwa izu maka akwụkwọ akụkọ The Herald site na afọ 2011 ruo 2018, [5] na-alaghachikarị na isiokwu nke ndị Zimbabwe na-eweghachi ihe nketa ọdịbendị ha na mgbọrọgwụ obodo. Ọ banyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị ka onye otu 'Chikomba East' na ntuli aka Zimbabwe nke afọ 2018.[6] A họpụtara ya dị ka Minista na-ahụ maka ọrụ ọha na eze na ọdịmma ọha na eze nke Zimbabwe na 7 Septemba nke afọ 2018. [7]

Akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Zimbabwean Woman: My Own Story, London: Karia Press, 1988. . 
  • Abụ maka ọdịda anyanwụ Afrịka: Akụkọ Zimbabwe, Lonely Planet Publications, 1997.   ISBN 978-0864424723

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Sekai Shand. AustLit. Retrieved on 7 July 2016.
  2. Busby, Margaret (ed.), "Sekai Nzenza", in Daughters of Africa: An International Anthology of Words and Writings by Women of African Descent from the Ancient Egyptian to the Present, London: Jonathan Cape, 1992; Vintage, 1993, p. 855.
  3. "Contributors", in Philip Darby, From International Relations to Relations International: Postcolonial Essays, Routledge, 2015, p. xii.
  4. (30 October 2003) "Life Matters: Feature Interview: Dr Sekai Nzenza-Shand", Radio National
  5. Nzenza, Sekai, "A farewell to readers of my column", The Herald, 16 May 2018.
  6. Matabvu, Debra, "Chikomba East ready for Dr Nzenza", The Sunday Mail, 15 July 2018.
  7. Butaumocho, Ruth, "Nzenza: People’s servant with heart of gold", The Herald, 26 September 2018.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]