Women at the World's Crossroads

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Women at the World's Crossroads
akwụkwọ

Women at the World's Crossroads bụ akwụkwọ e bipụtara n'afọ 1922 site na onye obodo England nke nwere ikike ụmụ nwanyị ma bụrụkwa onye nkwusa ozi ọma aha ya bụ Maude Royden.

Nchịkọta[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ ahụ chịkọtara okwu Royden kwuru na National Convention of the Young Women's Christian Association. Isiokwu "Ozi ndị inyom na nkà mmụta okpukpe" lekwasịrị anya n'ụmụ inyom nwere ikike ịbụ ndị ozi dabere na enweghị ike inweta site na Kraịst, na Jizọs gosipụtara onwe ya nye ndị ikom nakwa ndị inyom.[1] Okwu ikpeazụ nke dị na akwụkwọ ahụ bụ maka nkwenye Royden na ịhụnanya bụ naanị ike nke okike.[1]

Nnabata[dezie | dezie ebe o si]

Shamokin News-Dispatch bipụtara akụkọ afọ 1923 sitere na YWCA USA nke na-ekwu na akwụkwọ ahụ nwere "ihe achọrọ n'ọtụtụ ebe".[2] Onye isi oche nke YWCA n'oge ahụ, Mabel Marshall, tụrụ arọ tostu maka akwụkwọ ahụ.[3] Onye mbipụta akwụkwọ Woman's Press kwuru n'afọ 1923 na ihe akwụkwọ ahụ chọrọ bụ "ihe a n'ahụtụbeghị mbụ" nakwa na a ga- bipụta mbipụta ezumike maka akwụkwọ Japan.[4] Mary O. Cowper kwuru na akwụkwọ akụkọ Social Forces na dịka Royden "na-ede ma ọ bụ na-ekwu okwu, o yiri ka ọ bụghị onye a na akwaghari maọbụ onye mmetụta, kama ọ dị irè, ezi uche dị na ya, na ọ bụkwa onye na eme ka mmadụ kwenya, na'akpali akpali".[5]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "Books, by, for, and about women", New York Herald, December 31, 1922.
  2. "Y.W.C.A", Shamokin News-Dispatch, January 25, 1923.
  3. "One hundred at luncheon", The Pittsburg Sun, March 7, 1923.
  4. "Miss Royden's Popularity", The Capital, February 13, 1923.
  5. Cowper (January 1, 1922). "New books on recreation". Social Forces 1 (1): 489.