Glory Chukwu-Umunna

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
(Dupụ̀rụ̀ sì Glory Chukwu)
Glory Umunna
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye asọmpi ịma mma Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie
mmeriMost Beautiful Girl in Nigeria Dezie
Glory Chukwu Ummuna

Glory Umunna (a mụrụ Glory Chukwu ) bụ onye meriri Most Beautiful Girl in Nigeria nke afọ 2009. Ọ zọrọ asọmpi Miss World 2009 na Johannesburg,nke Saụt Afrịka . O bu onye igbo si na Abia Steeti . [1]

Umunna gụsịrị akwụkwọ na Mahadum nke Nigeria,dị na Nsukka, nweta nzere bachelọ na maikrobayọlọji . O nwekwara nzere masta na Management and Information Systems si na Cranfield,nke dị na UK.

N'agbanyeghị na ọ bụ onye si na ndịda nke Naijiria, Umunna nọchitere otu steeti ugwu nke Naijiria,bụ Nassarawa na mmemme ahụ e mere nke mbụ ya na Owerri . [2] Mgbe ọ dị afọ iri abụọ na atọ, Glory ghọọrọ eze nwanyị, ma na-asụtukwa furenchị nakwa bekee na asụsụ ọdịnala ya bụ Igbo.

Otu ebumnuche Umunna bụ ịrụ ọrụ na otu ụlọ ọrụ ebere nke na-akwado ụmụaka na-enweghị ka ọ haara ha na obodo ya, yana i tinye aka na mwughari na mmezigharị nke ngalaba ụmụaka n'ụlọọgwụ nke Naijiria niile.

N'ọnwa Julaị nke afọ 2011, Umunna lụrụ onye injinia bụ Uchechi Umunna, [3] di na nwunye a bụ nne na nna nye ụmụ nwanyị abụọ.

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]