Abdullahi Abubakar Gumel

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abdullahi Abubakar Gumel
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1940s Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Progressives Congress, People's Democratic Party Dezie

Sinetọ Abdullahi Abubakar Gumel bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria na onye otu Ogbakọ mba nke asato onyeJigawa Steeti . [1] Ọ na-anọchite anya Mpaghara ọchịchị Ugwu odida anyanwu Jigawa.

Na Sịnetị, ọ bụ onye isi oche Kọmitii n'ahụ maka Steeti na Gọọmentị Obodo. [2]

Abdullahi Abubakar Gumel
Senator of the Federal Republic of Nigeria Jigawa State North West Senatorial District
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
Àtụ:Str rep
June 2015
Preceded byDanladi Abdullahi Sankara
Personal details
BornApril 20, 1949
Political partyAll Progressives Congress
ProfessionPolitician

Mmalite ndụ na mmụta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Abdullahi Abubakar Gumel n'ụbọchi iri abụọ nke ọnwa April, afọ 1949 ọ bụ onye mpaghara gọọmentị obodo Maigatari nke Jigawa Steeti. [3]

O ji asambodo nna ukwu amụma ọha na nchịkwa nke si na Mahadum Bayero Kano, Kano Steeti. Mana tupu nke a, ọ gara Politeknik nke Kaduna dị na Kaduna Steeti ebe o nwetara asambodo nke mba na akaụntụ tupu ọ gafee mahadum Bayero Kano, ebe ọ nwetara asambodo dị elu na nchịkwa ọha na Diplọma ngụcha akwụkwọ na amụma ọha na nchịkwa [4]

Abdullahi Gumel ejeela ozi n’ọkwa dị iche iche. Ọ bụ osote onye isi ụlọ akwụkwọ nke mbu Gumel Gabas dị na Gumel, Jigawa State (site na-afọ 1969 ruo afọ 1971), Onye n'edegharị okwu na mkpirisi na omume ụlọ Kano Steeti , Kano Steeti (na-afọ 1972), Onye isi Akaụntụ Ego na Ikike telivishọn nke Naijiria. NTA Kano Steeti (site na-afọ 1976 ruo afọ 1979 ), Onye isi Akaụntụ na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị National Party of Nigeria (NPN) n'isi ụlọ ọrụ mba dị na Lagos (site na-afọ 1979 ruo afọ 1983) na onye otu nke otu nkwalite ụlọ ọrụ nke Naijiria (site na-afọ 1980 ruo afọ 1983), Ụlọ ọrụ nchebe na mgbanwe (na-afọ 1983) na Ụlọ ọrụ egwuregwu nke Kano Steeti (site na-afọ 1980 ruo afọ 1983) . [4]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Mmasị Gumel nwere ijere ndị ya ozi mere ka ọ banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Na-afọ 1999, a hoputara ya dika onye otu ndi ulo nke ndi nnochite anya (Naijiria) ịnochite anya mpaghara ọchịchị mba Gumel (nke mpaghara ọchịchị obodo Gumel / Maitagri / SuleTanrarkar / Gagarawa). Mgbe ọ nọ n'ụlọ di nnochite anya, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi oche Kọmitii ụlọ na Ọrụ ndị pụrụ Iche site n'afo 1999 ruo afo 2000 na onye isi oche Kọmitii ụlọ na omume ndị uwe ojii site n'afo 2001 ruo afo 2003. [5]

Na-afo 2003, a họpụtara ya dị ka onye Ndụmọdụ Pụrụ Iche nke Onye Ọkachasị Na-ọkà okwu Mgbe ahụ ( Aminu Bello Masari ) na Ọrụ ndị pụrụ Iche site n'afo 2003 ruo afo 2007. [6]

A hoputara ya dị ka Sịnetọ na-ahụ maka mpaghara ọchịchị ugwu ndịda anyanwụ Jigawa Steeti n'afo 2015 n’okpuru otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ndi All Progressives Congress. [7]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Ọ lụrụ nwanyị ma nwee ụmụ. [4]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Assembly. National Assembly | Federal Republic of Nigeria (en). www.nass.gov.ng. Retrieved on 2018-01-11.
  2. "Full list of Senate committee chairmen, vice chairmen - ScanNews Nigeria", ScanNews Nigeria. Retrieved on 2018-01-12. (in en-US)
  3. National Assembly Members - Jigawa State Government. www.jigawastate.gov.ng. Archived from the original on 2018-01-16. Retrieved on 2018-01-12.
  4. 4.0 4.1 4.2 Biography of Abdullahi Abubakar Gumel. www.nigerianbiography.com. Retrieved on 2018-01-12.
  5. HOUSE OF REPRESENTATIVE. dawodu.com. Retrieved on 2018-01-12.
  6. Biography Of Sen. Abubakar Gumel (en). www.nigerianelitesforum.com. Archived from the original on 2018-01-15. Retrieved on 2018-01-12.
  7. "Nigeria 2015 Elections: Senatorial Candidates - Full List - Premium Times Nigeria", Premium Times Nigeria, 2015-01-14. Retrieved on 2018-01-12. (in en-GB)

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • www.nass.gov.ng