Betty Anyanwu-Akeredolu
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
Aha ọmụmụ | Betty Chioma Anyanwu |
Aha enyere | Betty |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 20 Julaị 1953 |
Ebe ọmụmụ | Owẹrrẹ |
Dị/nwunye | Oluwarotimi Odunayo Akeredolu |
Ọrụ ọ na-arụ | ọkà mmụta sayensị |
ebe agụmakwụkwọ | Mahadum nke Nigeria, University of the Philippines |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | All Progressives Congress |
Ọnọdụ ahụike | Kansa ara |
Betty Anyanwu-Akeredolu (a mụrụ n'afọ 1953) bu akwakọlchọristị, onye na-enyere ndi mmadu aka, ma burukwa nwunye onye isi ala nke Ondo Steeti na Naijiria. Ọ lụrụ gọvanọ bụ Oluwarotimi Odunayo Akeredolu . [1] O bu onye hiwere Breast Cancer Association nke Naijiria. [2]
Omumu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]
A mụrụ Betty Anyanwu- Akeredolu n'ụbọchị nke 20 n'ọnwa Julaị n'afọ 1953, na ezi na ulo nke onye isi BUB na Nneoma Dora Anyanwu, na Emeabiam, nke Owerri-West, na Imo Steeti . [3] Anyanwu-Akeredolu gara Mahadum nke Naijiria,dị na Nsukka ebe ọ nwetara nzere bachelọ nke sayensị na zuuọlọji n'afọ 1977. O nwere akara nzere masta na sayensị nke azụ, nke isi agụmagụ ya bụ akwakọlchọristị, na Mahadum nke Philippines dị na Visayas n'obodo Iloilo . [4]
Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]
Ọ malitere ọrụ ya dị ka ọkachamara n'ịkụ azụ mgbe ọ na-arụ ọrụ na Ngalaba Na-ahụ Maka Azụ n'ogo gọọmentị etiti. Ọ lara ezumike nká n'afọ 2005. [5] [6] Ọ bu onye na-azu ahia azụ ma na enyekwa ndumodu site na ulo oru ya, Aquatek Farms Ventures. [7] Na mgbakwunye, ọ banyela na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kemgbe afọ 2007 ma na-arụsi ọrụ ike n'oge a (2017). [8]
Afọ ọma na inyere ndi mmadu aka[dezie | dezie ebe o si]
N’afọ 1997, a chọpụtara na ọ na-arịa kansa ara. Ọ gara nlekọta ma gbakee. Ọ malitere otu ụlọ ọrụ bụ ndị ọrụ ebere, Breast Cancer Association of Nigeria (BRECAN) [9] iji mee ka a mata banyere ọrịa a. O ritela ugo na ntunye ọrụ ya na mbọ ọ na-agba i buso ọrịa kansa aha na Naịjirịa. [6]
Ọ bụkwa onye nkwado nke otu ‘Bring Back Our Girls’. [10]
Ndụ onwe ya[dezie | dezie ebe o si]
Ọ lụrụ Oluwarotimi Odunayo Akeredolu, SAN . [10] [6] Ha nwere ụmụ anọ na ụmụ ụmụ anọ.
Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]
- ↑ Akeredolu's wife pledges to help end female genital mutilation in Ondo – Premium Times Nigeria. www.premiumtimesng.com. Retrieved on 6 April 2017.
- ↑ ABOUT. Archived from the original on 2019-07-01. Retrieved on 2020-11-06.
- ↑ When I met my husband, it was love at first sight – Betty Akeredolu. punchng.com.
- ↑ Rotimi Akeredolu's Wife-Betty Anyanwu Akeredolu Profile-New Ondo First Lady.
- ↑ https://www.pressreader.com/nigeria/thisday/20170303/281784218879458%7Cpublisher=thisdaylive.com%7Caccessdate=7 April 2017
- ↑ 6.0 6.1 6.2 Betty Anyanwu – Akeredolu, Compassionate First Lady of Ondo state. Archived from the original on 2019-07-01. Retrieved on 2020-11-06.
- ↑ Meet Betty Anyanwu Akeredolu Wife of Ondo State Governor Mr. Rotimi Akeredolu Her 4 Children : See Brief Profile & Biography – Daily Media Nigeria. Archived from the original on 2017-09-06. Retrieved on 2020-11-06.
- ↑ http://studylib.net/doc/7071818/--recovery-international-breast-cancer-support-conference%7Cpublisher=studylib.net%7Caccessdate=6 April 2017
- ↑ How Nigeria can win the fight against cancer – BRECAN Founder, Betty Anyanwu-Akeredolu. dailypost.ng (6 February 2017).
- ↑ 10.0 10.1 Why I married Governor Akeredolu – Wife – Nigeria Newspapers.