Daisy Danjuma

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Daisy Danjuma
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereDaisy Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya6 Ọgọọst 1952 Dezie
Ebe ọmụmụKazaure Dezie
Dị/nwunyeTheophilus Danjuma Dezie
nwaYuki Omenai Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Daisy Ehanire Danjuma (onye a muru n'ụbọchị nke 6 n'ọnwa Ọgọst n'afọ 1952) bu onye ndọrọ-ndọrọ ochichi nke ala Naijiria nke bu sịnetọ nke nọchiri anya Edo South Senatorial District nke Edo steeti n'ụlọ Sịnetị nke Naijiria site n'afọ 2003 ruo afọ 2007. Ọ zọghachikwara n'oge ntuli aka nke Naijiria n'afọ 2011, mana ihe agaghịrị ya nke ọma. [1] [2]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Daisy Ehanire Danjuma n'ụbọchị nke 6 n'ọnwa Ọgọst n'afọ 1952 na Benin City, nke Edo Steeti,dị na Naijiria.

Mmụta na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Danjuma gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị gọọmentị n'obodo Benin, n'Edo steeti, tupu ọ gụọ akwụkwọ na Mahadum nke Ahmadu Bello,na Zaria, ebe ọ gụsịrị akwụkwọ ma nweta nzere bachelọ na Iwu n'afọ 1976. N'afọ 1977, a kpọrọ ya na <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/Nigerian_Bar" rel="mw:ExtLink" title="Nigerian Bar" class="mw-redirect cx-link" data-linkid="57">Nigerian Bar</a> dịka ọkaikpe. Danjuma malitere ọrụ i ji otu afọ fee ala nna ya (NYSC) dịka onye ndụmọdụ steeti na Mịnịstrị nke Ikpe ziri ezi nke Legos Steeti, bụrụkwazị onye ọka ikpe nye Council of Aid Council of Nigeria. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye enyemaka ndị isi na Nigerian Acceptances Limited (NAL), ụlọ akụ, site n'afọ 1977 ruo afọ 1978. Ọ bụ odeakwụkwọ ulọ Ọrụ / Onye Ndụmọdụ Iwu nya Nigerian Television Authority (NTA) site n'afọ 1982 ruo afọ 1992. A hoputara Danjuma dika onye Sịnetọ nke obodo Naijiria (2003-2007) na-anọchite anya Edo South.

Ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Na <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/2003_Nigerian_parliamentary_election" rel="mw:ExtLink" title="2003 Nigerian parliamentary election" class="cx-link" data-linkid="67">2003 Nigerian parliamentary election</a>, a hoputara Danjuma ka o buru onye nnọchite anya Edo South nke Edo Steeti n'ụlọ nzuko omeiwu nke Naijiria site n'afọ 2003 ruo afọ 2007 n’okpuru Action Congress Party (AC). Dika onye omeiwu, o jere ozi dika onye isi oche, ndi otu kọmitii sịneti na-ahụ maka ụmụ nwanyi na mwulite ndi ntorobia, onye otu komiti sineti na-ahụ maka, ahụike, agụmakwụkwọ, ego, na njem ụgbọala. Ị bụ sinetọ si Naịjirịa nyere Danjuma ohere ị bụ onye otu Commonwealth Parliamentary Association (CPA). O jeekwala ozi dị ka Onye isi oche, Women and Child Right Committee nke Economic Community of West African States (ECOWAS Parliament). Danjuma zọrọ ọkwa nke abụọ ya maka ọfịs ndị omeiwu na ntuli aka nke afọ 2011 mana o mrghi ọfụma mere Ehigie Edobor Uzumere jiri merie ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu abụọ nke votu ya; site na vootu 135,346 na 70,725. Nke a gosiri Uzamere ihe ịga nke ọma maka ntuli aka ọzọ na ntuli aka Eprel afọ 2011 maka Edo South Senatorial District. [3] [4] [5] [6] Mgbe a rịọchara arịrịọ ugboro ugboro, n'ọnwa Juunu afọ 2009, ụlọ ikpe mkpegharị kwuru na n'eziokwu na-ahọpụtara Uzamere n'ụzọ kwesịrị ekwesị.

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Danjuma lụrụ onye bụbu onye isi ọchịagha Naịjirịa na mịnịsta na-ahụ maka nchekwa nke Naịjirịa, Theophilus Yakubu Danjuma onye guzobere ụlọ ọrụ nchọpụta mmanụ, South Atlantic Petroleum. Ha abụọ nwere otu nwa.

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Senate:The AC Challenge (April 23, 2007). Archived from the original on 2009-01-06. Retrieved on 2009-11-23.
  2. PDP Senate Race: Who wins, who loses? (February 12, 2006). Retrieved on 2009-11-23.
  3. INEC releases final results in Edo. In Depth Nigeria (April 12, 2011). Retrieved on 2011-04-21.
  4. Senate:The AC Challenge (April 23, 2007). Archived from the original on 2009-01-06. Retrieved on 2009-11-23.
  5. PDP Senate Race: Who wins, who loses? (February 12, 2006). Retrieved on 2009-11-23.
  6. Tribunal Condemns INEC Over Elections, Sacks Senator Uzamere (June 28, 2008). Archived from the original on 2011-07-14. Retrieved on 2009-11-23.