Emeka Ezeugo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Emeka Ezeugo
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
Aha enyereEmeka Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya16 Disemba 1965, 8 Ọgọọst 1967 Dezie
Ebe ọmụmụAbá Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụ̀sụ̀ Ìgbò, Bekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ, association football coach Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheetiti etiti Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
so na1994 FIFA World Cup, 1988 Summer Olympics Dezie

Àtụ:Infobox football biography

Emeka Ezeugo (a mụrụ 16 Disemba 1965) bụ onye Naịjiria bụbu ọkaa n'egwuregwu Naịjiria onye mere egwuregwu dị ka ọnọ n'etiti . Ọ rụụrụ ndị klọọbụ India, East Bengal FC, nọchitekwaala anya otu egwuregwu Naịjiria na iko mba ụwa nke FIFA . [1] Ọ chịkwara Abia Warriors FC dị ka onye nkuzi bọọlụ n'ikpeazụ.

Ọrụ klọbụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ezeugo n'Aba . Ọ gbara bọọlụ dị ka ọkaa na mba ise gụnyere Connecticut Wolves (A-League na United States), East Bengal, Kolkata, India, Peru na Dhaka Mohammedan n'oge ọrụ egwuregwu afọ iri na ise. [2]

O sonyere ndị Mohammedan Sporting na East Bengal ka ọ na-eru na njedebe 1980 ha. Ọ gafere na Danish League ya na klọbụ etiti tebulu Lyngby BK wee gaa n'ihu nke ukwuu nke na ọ rịgoro otu na-anọchite anya Naịjira na 1994 FIFA World Cup . Ọ bịara India maka obere oge na 1997 ịgbara ndị klọọbụ India, Mohun Bagan AC egwuregwu bọọlụ ole na ole. [3]

Ọrụ mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Ezeugo bu ụzọ gbaara ndị otu mba Naijiria egwu na asọmpi Summer Olympics nke afọ 1988 na Seoul, South Korea. [4] A na-etu ya "Emmy", o nwetaara otu nashọnalụ okpu iri na otu n'agbata 1992 na 1994, ma bụrụ onye otu ndị gbazuru asọmpi na iko mba ụwa FIFA 1994.

Ọrụ nkuzi egwuregwu[dezie | dezie ebe o si]

Ezeugo ji ikikere nkụzi bọọlụ nke US ya na ikikere mba ụwa KNVB Netherlands. Ezeugo nwere ndekọ nkuzi afọ asaa na-eweta anyaụfụ, ka ọ mezuru ntugharị ya site na onye ọgbụgba gaa na onye nkịzi nke gụnyere oge ya dị ka onye nkụzi na CoT NYs Borough nke Manhattan Community College na 2002. Na 2003 ọ zụrụ Deportivo Municipal, Lima maka oge abụọ tupu ya nlọghachi na United States, na 15 August 2005 e wee kpọọ ya onye nụzi egwuregwu bọọlụ ụmụnwoke ọhụụ na New York City College of Technology, [5] ebe a n'agbata 2008.

Ezeuga nọrọ oge okpomọkụ 2004 ruo 2006 ọzụzụ na Camp Chateaugay, ogige okpomọkụ dị na New York's Adirondack Mountains maka ụmụaka dị afọ 7 ruo 15.

Na 19 Eprel 2008, ọ laghachiri India wee binye aka na nkwekọrịta ọrụ ngo dị ka onyeisi nkụzi nke otu bọọlụ ya mbụ Churchill Brothers SC [6] na 5 Septemba 2008 a tọhapụrụ ya pụọ na nkwekọrịta ya. [7]

Ọ bụzị onye isi nkụzi nke Heartland, ọnọdụ o weere ihe pekarịrị otu ọnwa gara aga.  ]

Na 31 October 2013, e mere ya onye isi nkụzi nke otu Nigeria Premier League e buliri ọhụụ Abia Warriors .

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Nwanne Emeka nwoke bụ Valentine Ezeugo, onye bụbu onye egwuregwu bọọlụ n'India, hụtaara Churchill Bros patron Churchill Alemao onye bugoro iko mba ụwa na Naịjiria.

Ntọgharị[dezie | dezie ebe o si]

Na February, 2012 mgbe ọ bụ onye nkụzi nke Mohammedan Sporting Club nke Bangladesh ọ tọghara banye Islam . [8]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Saurabh Duggal (16 July 2018). From Chandigarh to FIFA World Cup, Nigerian Emeka Ezeugo traces his journey. Hindustan Times. Archived from the original on 30 November 2021. Retrieved on 12 January 2021.
  2. Former Kolkata Maidan star and 1994 World Cupper Emeka Ezeugo to run for Rohingyas. The Hindustan Times. Archived from the original on 9 July 2021. Retrieved on 3 July 2021.
  3. Emeka blasts Mohammedans officials. Archived from the original on 3 August 2008. Retrieved on 19 February 2009.
  4. Emeka Ezeugo Bio, Stats, and Results | Olympics at. Sports-reference.com. Archived from the original on 23 September 2013. Retrieved on 2013-11-15.
  5. CUNY Athletic Conference - Emeka Ezeugo Named Men's Soccer Coach at City Tech. Cunyathletics.com. Archived from the original on 2012-07-28. Retrieved on 2013-11-15.
  6. Sport / Football : Emeka is new coach. The Hindu (2008-04-19). Archived from the original on 2008-04-22. Retrieved on 2013-11-15.
  7. Churchill Brothers sack coach Emeka. Zeenews.com. Archived from the original on 2013-02-10. Retrieved on 2013-11-15.
  8. New Age | Newspaper. Newagebd.com (2012-02-13). Archived from the original on 10 January 2014. Retrieved on 2013-11-15.