Godfrey Okoye

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Godfrey Mary Paul Okoye, C.S.Sp. (Ubochi nke iri na iteghete nke onwa Disemba na afo 1913 ruo17ubochi nke iri na asaa n'onwa Machị nke afo1977)O bụ bishọp nke Chọọchị Roman Katọlik na Naịjirịa. Ọ bụ Bishọp mbụ nke obodo Port Harcourt, na-eje ozi site na ubochi nke ato n'onwa Septemba nke afo1961 ruo ubochi nke asaa n'onwa Machị nke afo 1970. Mgbe ọ hapụsịrị diocese nke Port Harcourt, ọ ghọrọ Bishọp nke abụọ nke Enugu, nọchiri Bishọb John Cross Anyogu.

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Okoye na ubọchi nke iri na iteghete nke onwa Disemba na afo1913 nye Okoye Nwazulu na Ada Oji na Ifitedunu na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Nigeria, ugbu a bu Anambra Stati.[1] Most Rev. Dr. Charles Heerey, Achịbishọp nke Onitsha, na ubochi nke iri abuọ na asaa nke onwa Julaị na afo1947.[2] N'afọ 1950, ọ ghọrọ naanị onye ụkọchukwu Igbo nke abụọ a nabatara n'ime ọgbakọ nke Mmụọ Nsọ.[3] Okoye tinyere aka nke ukwuu n'ihe omume gbasara Agha Obodo Naịjirịa, nkwado ya doro anya maka Biafra mere ka ndị ụkọchukwu ibe ya nwee nchegbu na a ga-elekwasị ha anya na Naịjirị.[4] Onye na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ Adrian Hastings kọwara Okoye dị ka "onye Biafra na-anụ ọkụ n'obi".[5] N'afọ 1977, obere oge tupu ya enwee Iwa ahu hainia, Okoye bibiri faịlụ nke onwe ya na-akọwapụta itinye aka ya n'agha ahụ. Ọ nwụrụ obere oge ka ịwa ahụ gasịrị.[6]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

 

Ebemside[dezie | dezie ebe o si]

  1. Amadi (1995). Bishop G.M.P. Okoye : his life, his times. Lagos: Everlead Communications. ISBN 9789783336711. 
  2. Our Founder. Daughters of Divine Love Congregation. Archived from the original on 10 August 2016. Retrieved on 27 April 2016.
  3. Okwu (2010). Igbo Culture and the Christian Missions, 1857-1957: Conversion in Theory and Practice. Rowman & Littlefield. ISBN 9780761848844. 
  4. Omenka (2010). "Blaming the Gods: Christian Religious Propaganda in the Nigeria-Biafra War". Journal of African History 51 (3): 367-389. DOI:10.1017/S0021853710000460. 
  5. Hastings (1979). A History of African Christianity 1950-1975. Cambridge University Press. ISBN 9780521293976. 
  6. Emenyonu (2000). "Nationalism and the Creative Talent", Goatskin Bags and Wisdom: New Critical Perspectives on African Literature. ISBN 9780865436718. 

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Roman Catholic Diocese of Port Harcourt