Isiaka Adeleke

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Isiaka Adetunji Adeleke
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Jenụwarị 1955 Dezie
Ebe ọmụmụEnúgwu Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya23 Eprel 2017 Dezie
Ụdị ọnwụeke na-akpata Dezie
ihe kpatara ọnwụmyocardial infarction Dezie
ŃnàRaji Ayoola Adeleke Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiGovernor of Osun State, onye otu ndi omeiwu nigeria, onye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party, Alliance for Democracy Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
Isiaka Adetunji Adeleke
1st Governor of Osun State
1st [[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Preceded byLeo Segun Ajiborisha
Succeeded byAnthony Udofia
Senator - Osun West
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Succeeded byMudasiru Oyetunde Hussein
Senator - Osun West
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Preceded byMudashiru Hussein
Personal details
Born(1955-01-15) 15 Jenụwarị 1955
Enugu
Died23 Eprelụ 2017(2017-04-23) (aged 62)
Political partyAPC
ProfessionBusinessman, Politician

Isiaka Adetunji Adeleke (Amụrụ n'ụbọchị iri n'abụọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 1955 ruo ụbọchị iri n'abụọ nke ọnwa Eprel afọ 2017) bụ onye omebe iwu nke nọ na Naịjirịa ugboro abụọ onye nọchitere anya People's Democratic Party (PDP) na steeti Osun site n'afọ 2007 ruo afọ 2011 a họpụtara ya ọzọ n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke All Progressive Congress na-afo 2015. Ọ bụrụ onye otu Sineti Naịjirịa n'afọ 2007. [1] Ọ zọrọ ntuli aka ọzọ n'ọnwa Eprel nke afọ 2011 na n'elu otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP, ọ bịara onye nke abụọ site na vootu Nari iri asa n'asaa na iri itoolu. Onye meriri bụ Mudasiru Oyetunde Hussein nke otu Action Congress of Nigeria (ACN) ọ nwere vootu puku otu narị na iri abụọ n'otu, nari itoolu na iri asa n'otu. [2]

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

Isiaka Adetunji Adeleke a mụrụ n'ụbọchị nke iri n'ise nke ọnwa Jenụwarị afọ 1955 n'ime ezi na ụlọ nke sinetọ Ayoola Adeleke na Esther Adeleke. [3] Amuru ya na Steeti Enugu ma noo oge mbu nwata na obodo ahu rue mbido agha obodo Naijiria . Ọ malitere ụlọ akwụkwọ praịmarị ya n'ụlọ akwụkwọ Christ Church, Enugu, tupu ọ kwaga Ibadan. [3] Ọ gụsịrị ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya na Ogbomoso Grammar School. Adeleke nwere nzere bachelọ nke nka, na nzere masters na ochichi ndi mmadu. Ọ bụ onye isi oche, kansụl ọchịchị, Kansụl nkwalite mbupụ nke Naịjirịa, onye isi na onye isi oche, Kansụl ọchịchị nke Mahadum Calabar, Naịjirịa . [1] [4] Ọ bụ nwanne nna onye Naịjirịa na-agụ egwu, Davido [5]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Osun State, Nigeria

N’oge obodo Naịjirịa nke atọ, Adeleke zọrọ ọkwa gọvanọ nke Osun Steeti emere ọhụụ bụ nke e mepụtara site n’Oyo Steeti. Ọ bụ onye otu SDP nke bụ pati kachasị na steeti ahụ. Onye nọ n’ihu ya bụ onye ọkaiwu, Oladipo Oladosu mana mgbe ọ gbasịrị isi na nke Adeleke gbara nke abụọ, Adeleke nwere ike merie n’agba nke abụọ. [6] A hoputara ya dịka onye ochichi mbụ nke Osun State n'afọ 1992. Mkpebi ndị pụtara ìhè Adeleke mere bụ nguzobe nke ụlọ akwụkwọ sayensị dị na Iree, kọleji nke teknụzụ na Esa-Oke na mmecha nke Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi nke Ọchịchị Osun. Agbanyeghị, n'afọ 1994, mgbe mgbasa nke Obodo Naịjirịa ahụ gasịrị, Adeleke rutere n'ụlọikwuu ya na ndị otu mgbagha, bụ Afenifere mana ọ mechara banye na otu Ndị ọchịchị Patị nke Naịjirịa otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọhụrụ nke nkwado ya sitere n'aka ndị ha na Abacha nọ nso . [7] N’afọ 2007, a họpụtara Adeleke dị ka onye omebe iwu maka ọdịda anyanwụ Osun Onye ọ bụ ya na ya n'asọmpi a bụ Mudasiru Oyetunde Hussein, na-eguzo maka otu ndọrọndọrọ ọchịchị Action Congress . Hussein nọrọ oge abụọ n'ụlọ omebe iwu (1999 ruo 2007) dịka onye otu pati Alliance for Democracy na mpaghara Lagos Steeti, mana o sitere na steeti Osun. Hussein rịọrọ ka ntuli aka a hapụ inwe isi. A họpụtara Isiaka Adetunji Adeleke na komittii n'ahụ maka mwekọka akụrụngwa mmanụ ala elu ugwu na ụlọ ọrụ, Ụlọ na ndị agha ụgbọ ala. [1]

N'ọnwa Machị afọ 2008, o guzobere akara ugo mmụta maka ihe dị ka ụmụ akwụkwọ otu narị na-enweghị ike ịga ụlọ akwụkwọ sekọndrị na mba ahụ. [8]

N'ọnwa Julaị afọ 2009, dịka onye isi oche kọmitii sineti na INEC, Sịnetọ Isiaka Adetunji Adeleke toro ọrụ nke Independent National Electoral Commission, si na "rue ugbua INEC rụrụ ọrụ nke ọma". Ọ kwadola ikike ndị Naịjirịa bi na mba ofesi ịtụ vootu na Naịjirịa. Adeleke, tupu ọnwụ ya, e kwuru na ọ na-ele oche gọvanọ na Osun n'ihu ntuli aka nke steeti ahụ n'afọ 2018 [9]

Ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

Sịnetọ Isiaka Adeleke nwere ọrịa obi. Ọ nwụrụ n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Eprel, afọ 2017 na Biket Hospital na Osogbo, isi obodo Osun steeti. [10]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Sen. Isiaka Adetunji Adeleke. National Assembly of Nigeria. Archived from the original on November 23, 2009. Retrieved on 2009-09-20.
  2. Official result of OSUN Senatorial Elections. The Punch (Apr 10, 2011). Archived from the original on April 13, 2011. Retrieved on 2011-05-05.
  3. 3.0 3.1 Lawal. Isiaka Adeleke: 60 years of service to humanity. sunnewsonline. Archived from the original on 5 January 2016. Retrieved on 27 December 2015.
  4. Timi of Ede, Oba Oyewusi Agbonran II. The Nation (2009-08-22). Archived from the original on 2011-07-26. Retrieved on 2009-09-20.
  5. "Davido mourns late Uncle, Senator Isiaka Adeleke", The Vanguard, April 24, 2017.
  6. Agbroko, G. (1996, Nov 18). From the editor. Theweek
  7. Olaniyonu, Y. (1996, Nov 18). A victim or a villain? Theweek
  8. Adeleke Scholarship Award for Indigent Students. This Day (4 March 2008). Retrieved on 2009-09-20.
  9. Osun: APC dares Adeleke to openly declare governorship ambition. Naija News (December 4, 2016). Archived from the original on April 24, 2017. Retrieved on 2016-04-23.
  10. (23 April 2017) Senator Isiaka Adeleke Is Dead.