Kayode Olofin-Moyin

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Kayode Olofin-Moyin
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị agha Dezie
Ọkwá o jiGovernor of Ogun State Dezie
ebe agụmakwụkwọỤlọ Akwụkwọ Nchebe Naijiria, National Defence College, Nigeria Dezie
Ụcha ime anyawhite Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Ndụ mbido[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Navy Captain Kayode Olofin-moyin na Ilawe-Ekiti, Ekiti State, n'abali iri na-atọ nke ọnwa Mee, afo 1950.

Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ elementarị, ọ debanyere aha na Annunciation Catholic School, Ikere-Ekiti n'afo 1965. Ọ gụsịrị n'afo 1969 ma nweta Asambodo ụlọ Akwụkwọ ndị di na ọdida Anyanwụ Africa na ụdị di iche.

Anabatara ya na Nigerian Defence Academy n'afo 1971 dị ka cadet wee mecha ihe agum akwụkwọ ya nke ọma n'ọnwa Disemba afo 1972 e wee duo ya n'iyi ọrụ nke ndị agha mmiri nke Naijiria. Mgbe nke ahụ gasịrị, n'usoro ngwa ngwa, ọ gara maka ọzụzụ ndị ọzọ di n'ihu. Oteghi aka Ọ hapụrụ ụlọ akwụkwọ nchekwa Naijiria n'ọnwa Disemba 1972, mgbe ọ malitere agum akwụkwọ nke Midshipman onboard NNS OBUMA (nke a na-akpọbu NNS NIGERIA). Ọ gụsịrị ọzụzụ ya n'ọnwa Ọktoba1973

Ọrụ ya ka Onyeagha[dezie | dezie ebe o si]

Otu onye ọrụ nke enwere ike ịkọwa akpịrị ịkpọ nkụ ya maka ihe ọmụma dị ka onye n'anaghị eriju eriju, Navy Captain Olofin-Moyin gara Command and Staff College, Jaji nke nwere nnukwu nkwanyere ugwu n'afo 1985, O gụsịrị akwụkwọ n'afo 1986. O mechara gaa National War College, Abuja, n’agbata afọ 1997 na 1998.

Navy Captain Olofin-Moyin riri na-ọkwa na ọrụ ọ họọrọ. Site na Cadet n'afo 1972, e buliri ya banye na-ọkwa Midshipman n'afo 1973; Sub-Lieutenant (1973 - 1977); Lieutenant (1977 - 1981); Ọchịagha Lieutenant (1981 - 1988); Ọchịagha (1988 - 1994) na Navy Captain (1994)

Ụfodụ nhọpụta ya di ka Ọchịagha bụ, Onye isi ọrụ nchịkwa, NNS HADEJIA (Patrol Boat), (1978 - 1979); Onye isi ọrụ nchịkwa, NNS RUWAN YARO (Cadets Training Ship), (1984 - 1985); Onye isi ọrụ nchịkwa, NNS ENYIMIRI (A Corvette on ECOMOG Operation), Liberia, (1992 - 1993) na Onye isi ọrụ nchịkwa, Naval Air Station, (1996 - 1997).

Navy Captain Olofin-Moyin nwekwara nhọpụta ndị ọrụ dịka Staff Officer (Operation), Western Naval Command (1986 - 1988); Isi ọchịagha, Nigerian Naval College, Onura, Port Hacourt (1990 - 1992); Onye isi ndị agha Naval, ECOMOG, Liberia (1994 - 1995) na Onye Isi Ọrụ, Isi Ụlọ ọrụ ndị Navy, Lagos (1995 - 1996).

Onye nchịkwa Steeti Ogun[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Navy Captain Kayode Olofin-Moyin ka ọ bụrụ Onye isi nchịkwa ndị agha nke Ogun State, Naijiria site n'ọnwa Ọgọstụ 1998 ruo Mee 1999 n’oge ọchịchị mgbanwe nke General Abdulsalami Abubakar, na nyefe ike Ọchịchị gọvanọ nye onye a họpụtara bụ Olusegun Osoba na mbido nke Republic nke anọ na Naijiria . [1] O wuru ụlọ obibi ndi gọvanọ ọhụụ maka steeti Ogun, e meghere ya n'abali iri abụọ na asaa n'ọnwa Eprel 1999 tupu oge inyefe gọvanọ ndị nkịtị ike Ọchịchị [2]

N'ọnwa Nọvemba 2002 ọkụ gbara ma mebisia ụlọ ya dị na Victoria Island, Lagos . [3]

Ntughari[dezie | dezie ebe o si]

  1. Nigeria States. WorldStatesmen. Retrieved on 2010-05-08.
  2. Bamdus Bastu (October 2009). Satekholders and Sustainable Corporate Governance in Nigeria. Retrieved on 2010-05-08.
  3. Kolade Larewaju (7 November 2002). Fire Destroys Ex-Milad's Residence. Vanguard. Retrieved on 2010-05-08.