Ken Nnamani

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ken Nnamani
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereKen Dezie
aha ezinụlọ yaNnamani Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya2 Novemba 1948 Dezie
Ebe ọmụmụEnúgwu Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiPresident of the Senate of Nigeria, onye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọOhio University Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Ken Ugwu Nnamani (amụrụ n'ụbọchị nke abụọ n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1948) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria bụ onye isi oche nke Seneti nke Naijiria site n'afọ 2005 ruo n'afọ 2007.[1] Onye otu People's Democratic Party (PDP), a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye omeiwu site na Enugwu East Ogige ndị omeiwu nke Enugwu Steeti n'afọ 2003 ma jee ozi na Seneti ruo afọ 2007.[2]

Ihe ndị mere n'oge gara aga[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ken Nnamani n'ụbọchị nke abụọ n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1948 na Enugwu.[3] O nwere nzere BBA na MBA na Mahadum Ohio dị na Athens, Ohio ma rụọ ọrụ maka Du Pont De Nemours International na Geneva na Nova Chemicals International dị ka onye isi ahịa ma mesịa bụrụ onye ndụmọdụ. Ọ bụ onye isi ndụmọdụ, Maredec Limited.[2]

Ọrụ onye omeiwu[dezie | dezie ebe o si]

Enugwu Steeti, Naịjirịa

A họpụtara Ken Nnamani ka ọ bụrụ onye omeiwu maka Enugwu East n'afọ 2003.[2] A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke Federal Character & Governmental Affairs na onye otu nke kọmitii na Nhazi onwe, Federal Capital Territory and Appropriation & Finance.[4] Ọ ghọrọ onye isi oche nke Seneti nke Naịjirịa site na onwa Eprel 5 nke afọ 2005 ruo n'afọ 2007, na-ewere ọkwa a mgbe Adolphus Wabara gbara arụkwaghịm n'ihi ebubo nrụrụ aka.[5]

N'ikwu okwu n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2006, Nnamani kwuru na "N'ala nwere ọdịbendị dị iche iche na okpukpe dị iche iche dị ka Naịjirịa, ntuli aka a pụrụ ịtụkwasị obi na-enye ndị otu dị iche iche nke mba ahụ ohere ịga n'ihu na-arụkọ ọrụ ọnụ iji kwalite ọdịmma nke mmadụ niile. Nhọrọ 2007 bụ ntuli aka kachasị mkpa na Naịjirịa... Ntuli aka afọ 2007 na Naịjirịa nwere isi ihe iji mee ka ọchịchị onye kwuo uche ya sie ike na Naịjarịa.[6]

Ọrụ ya mgbe e mesịrị[dezie | dezie ebe o si]

N'abalị isii n'ọnwa Mee n'afọ 2008, a malitere Ken Nnamani Center for Leadership and Development na Abuja. Ebumnuche nke ụlọ ọrụ ahụ bụ ime ka ọ dịkwuo mfe idu ndú na mmepe dị mma na mgbanwe n'Afrika.[7]

N'ajụjụ ọnụ Jun n'afọ 2009, Ken Nnamani gosipụtara nchegbu banyere ọganihu maka ọchịchị onye kwuo uche ya zuru oke na Naịjirịa. O kwuru na "Akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị na ọ dịtụbeghị ọchịchị onye kwuo uche ya siri ike na-enweghị nnukwu ndị nọ n'etiti. Naịjirịa enweghị ndị nọ n'etiti, ya mere ọ bụghị ihe ijuanya na ọchịchị onye kwuo uche ya anyị adịghị ike ma nwee ike ịgbanwe. "[8]

Onyinye na mmata[dezie | dezie ebe o si]

  • N'abalị asaa n'ọnwa Disemba n'afọ 2007, onye omebe iwu Ken Nnamani natara onyinye ihe nlereanya na ọgụ megide nrụrụ aka nke Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) nyere ya na Code of Conduct Bureau, Independent Corrupt Practices and Related Offences Commission (ICPC).[9]
  • N'abalị iri na abụọ n'ọnwa Nọvemba n'afọ 2007, ndị omeiwu New York For Global Action (PGA) nyere ya onyinye nke onye mgbachite ọchịchị afọ 2007 , na-eme ka ọ bụrụ onye Naijiria mbụ natara onyinye ahụ a na-achọsi ike.[9]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ken Nnamani: The man who sold his conscience (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2021-10-25). Retrieved on 2022-02-24.
  2. 2.0 2.1 2.2 Gbenga Oke (7 May 2008). Ken Nnamani - Taking Good Governance and Development to Greater Height. Vanguard. Retrieved on 2009-10-06. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "van177" defined multiple times with different content
  3. MAKING LAW FOR GOOD GOVERNANCE IN NIGERIA: KEN NNAMANI SET TO MAKE A DIFFERENCE. NigeriaWorld (2005-06-06). Retrieved on 2009-10-06.
  4. Ken Nnamani. AfDevInfo. Archived from the original on 2012-03-11. Retrieved on 2009-10-06.
  5. WABARA, TOO LATE TO TALK NOW!. NigeriaWorld (June 14, 2007). Retrieved on 2009-10-06.
  6. The 2007 Elections and the Prospects of Democracy in Nigeria. Center for Strategic and International Studies (August 4, 2006). Archived from the original on September 10, 2009. Retrieved on 2009-10-06.
  7. Kabiru Mato (18 May 2008). The Ken Nnamani Centre. Leadership (Abuja). Retrieved on 2009-10-06.
  8. GBENGA OKE (June 14, 2009). How politicians endanger democracy — Ken Nnamani. Vanguard. Retrieved on 2009-10-06.
  9. 9.0 9.1 Director Senator Ken Nnamani.