MKO Abiola Statue

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chief M.K.O Abiola Statue

Ọ bụ Olurotimi Ajayi chepụtara ma guzobe ihe ọkpụkpọ nke MKO Abiola iji cheta Chief Moshood Abiola, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a na-ewere n'ọtụtụ ebe dị ka onye mmeri nke ntuli aka Naijiria na-enweghị nkwubi okwu n'afọ 1993. N'ịbụ nke guzo n'ihe dị ka mita 46 n'ogologo, a kpughere ihe oyiyi ahụ na iri na abụọ nke ọnwa June 2018 n'oge ọchịchị Gọvanọ Akinwunmi Ambode.

Ihe ndị mere n'oge gara aga[dezie | dezie ebe o si]

Moshood Kashimawo Olawale Abiola, onye a na-akpọkarị MKO Abiola (24 August 1937 na nke asaa July 1998) bụ onye ọchụnta ego, onye na-ebipụta akwụkwọ na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị.[1] O sonyere na ntuli aka nke 1993 na Naịjirịa ma bụrụ onye a na-ewere dịka onye mmeri ọ bụ ezie na ewepụtaghị nsonaazụ ikpeazụ.[2] N'afọ 1994, e jidere ya ma tụọ ya mkpọrọ maka ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru mgbe o kwupụtara onwe ya dị ka onye isi ala Naịjirịa.[3] MKO Abiola nwụrụ na asaa Julaị 1998, ụbọchị a ga-ahapụ ya n'ụlọ mkpọrọ.[4] Ọnọdụ ndị a na-enyo enyo na-esochi ọnwụ ya, ebe nyocha nke ozu kwuru na Abiola nwụrụ site na nkụchi obi, Onye isi nchekwa nke General Sani Abacha kwuru na a kụrụ Abiola ihe ruo ọnwụ.[5]

Ebumnuche[dezie | dezie ebe o si]

N'icheta ndụ, ike na ihe nketa nke Abiola setịpụrụ, gọọmentị steeti Lagos site n'aka gọvanọ Akinwunmi Ambode kpughere ihe oyiyi MKO Abiola na nke iri na abụọ June 2018 kpọmkwem afọ iri abụọ na ise mgbe ọ meriri ntuli aka onye isi ala na nke iri na abụọ June 1993 na Ojota, mpaghara Lagos.[6] Gọvanọ ahụ kwuru na ihe oyiyi ahụ ga-anọgide na-abụ ihe ncheta nke ihe nketa Abiola na ịdị ukwuu ọ nọchitere anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa. Gụọ ihe ndị ọzọ na: https://www.vanguardngr.com/2018/06/ambode-pays-tribute-abiola-unveils-statue/z.[7]

Nkọwa nke ihe owuwu[dezie | dezie ebe o si]

N'ịbụ nke dị n'etiti "MKO Gardens" ma guzo nke iri atọ na asaa feet ogologo (conversion???), a na-etinye ihe oyiyi MKO Abiola na pedestal 9 feet na-eme ka ọ bụrụ ihe ncheta na nke iri anọ na abụọ feet elu. Ihe a tụrụ atụ nke e ji eriri ugegbe mee na-egosi Abiola na-amụmụ ọnụ ọchị na-eyi agbada na-asọ asọ na aka nri ya weliri elu na-egosi ihe ịrịba ama nke udo. E bu ụzọ chepụta ihe oyiyi MKO Abiola n'afọ 2003 tupu e degharịa ya ka ọ dị ugbu a.[6]

Ebe a na-ese foto[dezie | dezie ebe o si]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Wale Adebanwi (31 March 2014). Yorùbá Elites and Ethnic Politics in Nigeria: Ọbáfemi Awólowo and Corporate Agency. Cambridge University Press, 99–. ISBN 978-1-139-91711-7. 
  2. Frank H. Columbus (1 January 2006). Politics and Economics of Africa. Nova Publishers, 123–. ISBN 978-1-60021-173-7. 
  3. (1998) Africa Research Bulletin: Political, social, and cultural series. Blackwell. 
  4. (1999) Africa Film & Tv. Z Promotions. 
  5. (2000) The Economist. Charles Reynell. 
  6. 6.0 6.1 "[PHOTOS] June 12: Ambode unveils 46-feet statue of MKO Abiola", 12 June 2018. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "mko" defined multiple times with different content
  7. "Ambode pays tribute to Abiola, unveils statue", Vanguard News, 12 June 2018.