Onitsha Market

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ahịa Onitsha
ahia
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaOnịchạ Dezie
nhazi ọnọdụ6°9′9″N 6°46′30″E Dezie
street addressEdozie Lane, Main Market, Onitsha, Nigéria Dezie
Map

Ahịa Ọnicha nke a makwaara dị ka Onitsha Main Market na bekee[1] bụ otu n'ime ahịa kacha ibu na ọdịda anyanwụ Afrịka dabere na nha ala na oke ngwongwo ahịa a n'ere ebe ahụ. [2] Ahịa ahụ dị n'ime obodo Onitsha, nke bu isi obodo azụmaahịa nke steeti Anambra nke dị na ọdịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ndị na achịkwa ma na elekọta ahịa ahụ bụ otu a na akpọ na bekee Onitsha Market Traders Association (OMATA). Ndị OMATA (aha ịchafụ) bụ otu ndị ahịa, ọchụnta ego ndị nke so na otu akacha asọpụrụ na kọntinent Afrịka na ihe gbasara ịzụ ahịa. Ọtụtụ n'ime ndị na-azụ ahịa ma na-ebubata ngwongwo ahịa dị iche iche na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nwere isi ụlọ ọrụ ha n'ahịa Ọnicha. A maara na ndị ọchụnta ego nọ n'ógbè ahụ dịka ndị na-ebubata ma ọ dịkarịa ọbere, ngwa ahịa nke tọn iri anọ ugboro isii na ihe dị ka nnukwu igbe nke ga eru ogologo iri anọ kwa afọ ọ bụla. Ụfọdụ ndịa na-ebubata ngwa ahịa nke tọn iri anọ ihe karịrị ugboro narị abụọ na otu afọ. Ngwa ahia ndị a gụnyere ọla ụdị dị iche iche, uwe, ngwongwo ezinụlọ, akụrụngwa eji ewu ụlọ ebe obibi na nke eji ewu ụlọ ọrụ na ebe a na emepụta akụrụngwa dị iche iche.

Ahia nke a di n'akụkụ Osimiri Niger na otu mpaghara ma nwee njikọ n'akụkụ ọdịda anyanwụ yana Fegge na okporo ụzọ nke gafere Osumaru. Ahia Ọnicha nọ na nchekwa ndị Onitsha Main Market Vigilante ndị nke na -arụ ọrụ n'okpuru na nkwado nke ndị uwe ojii Nigeria . Enwere ike ịkọwa ahịa a n'ụzọ ziri ezi dị ka ụlọ ike azụmahịa nke West Africa niile. Ndị ahịa nọ na mpaghara ECOWAS na gburugburu ya na-akwado ya nke ukwuu gụnyere Accra, Abidjan, Douala, Niamey na Cotonou na ebe ndị ọzọ na kọntinent ahụ, site na ahịa ha na azụ na nnukwu Ahia Ọnicha ahụ.

A na-enwe ngwa ahịa ụdị dịgasị iche iche na nnukwu ahịa Onitsha ahụ. N'agbanyeghị ezigbo nchekwa, a na enwe kwa ọtụtụ ndị akanakpa, ndị wayo na ndị arụ ọrụ nghọrị.

Akwụkwọ Onitsha Market nke bụ otu ụdị akụkọ malitere na nnukwu Ahia Ọnicha

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

  "About Onitsha Market – MyCostoma". mycostoma.com. Retrieved 2021-05-24.

Nigeria's expert copy-cats  

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. About Onitsha Market – MyCostoma. mycostoma.com. Retrieved on 2021-05-24.
  2. Nigeria's expert copy-cats