Orompoto

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Orompoto
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha ọmaqueen regnant Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie

Orompoto (a na-sụpekwa ya ka Oronpoto ) [1] bụ nwanyị Alaafin nke Oyo, alaeze ndị Yoruba. [2] [3] [4] [5] Alaeze ahụ ọ chịrị dịzị ugbu a na mpaghara nke ọdịda anyanwụ na etiti-ugwu (north-central) Nigeria. [6]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Orompoto bụ nwanne nwanyị onye nke bu ya ụzọ chịa, Eguguojo. [7] Ọ bụ nwanyị izizi bụ “eze” nke Oyo n’oge ana-enwe ọchịchị alaeze, bụrụkwa nwanyị izizi kemgbe onye chịburu alaeze ahụ bụ Yeyeori. [2] Orompoto batara n'oche eze ahụ n'ihi na onweghị nwoke ga-anochi anya n'ime ezinụlọ ha n'oge ahụ. [8] O nyeere aka chụpụ ndị Nupe na Oyo n'ime afo 1555. Orompoto biri na oge narị afọ nke iri na isii. [6] [9]

Orompto bụ eze Oyo nke abụọ chịrị n’isi obodo ọhụrụ nke Igboho. [10] Ufọdụ akụkọ ọdịnala nke ihe ndekọ a na-edeghị ede kwuru na ọ ghọrọ nwoke site na mgbagoju anya tupu ọ banye n'ocheeze ebe ahụ.

Orompoto jiri inyinya lụọ otutu agha nke ana-ekwu na o nwere ike o bụrụ na Borgu ka onwetara ha. [11] A kowara na ọ bụ ezigbo ọkaibe n'ịnyịnya, ma mepụta usoro pụrụ iche nke ndị agha ya jiri kwudosie ike n'okpuru Eso Ikoyi . N'ihe ahubeghi mbu, ndi agha ya bu ndi di ike a na-atu egwu, luru otutu agha megide ndi ilo nke obodo Oyo. [1] Dika onye agha mara nke ekwe na-aku, a sịrị na ọ goiputara ihe di iche n'ọgụ nke Illayi. Mgbe ọ na-alụso ndi ilo ya ọgụ ahu, ndị ọchịagha atọ tufuru ndu ha n'ike. Ha bu Gbonkas na Oyo. Onye nke atọ n’ime ha ka ekwenyere na ọ dara mana ihu ya kpọchiri na ọchi na -enweghị atụ. Ndị iro ahụ chere na ọ ka dị ndụ ma na-eme ihe ọchị. Ma o gbogojuru ha anya mgbe ha hụrụ na ha enweghị ike ị bụ okacha mma na ebe ndi Oyo gbonkas nọ. [12] Ha gbahapụrụ agha ahụ na-enweghi afọ ojuju wee laa nke mere na ndi Oyo weere mmeri.

Onye nọchiri ya bụ Ajiboyede .

Ntughari[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 World history, Volume 1 (Volumes 3-4 of Oxford illustrated encyclopedia). 
  2. 2.0 2.1 The Yoruba in Transition: History, Values, and Modernity. 
  3. Modernity and Its Malcontents: Ritual and Power in Postcolonial Africa. 
  4. Women in the Yoruba Religious Sphere (McGill Studies in the History of Religions). 
  5. Studies in World Affairs, Volume 1. 
  6. 6.0 6.1 Chronology of Oyo Kingdom's Alaafins. Archived from the original on February 25, 2018. Retrieved on February 23, 2018.
  7. African Gender Studies: A Reader. 
  8. Sex and the Empire That Is No More: Gender and the Politics of Metaphor in Oyo Yoruba Religion (Berghahn Series). 
  9. West Africa Before the Colonial Era: A History to 1850. 
  10. Matory, James Lorand (2005). Sex and the empire that is no more : gender and the politics of metaphor in Oyo Yoruba religion. Berghahn Books. ISBN 1571813071. OCLC 910195474. 
  11. Samuel Johnson, Obadiah Johnson. The History of the Yorubas, From the Earliest of Times to the Beginning of the British Protectorate. 
  12. Smith, Robert (1965). "The Alafin in Exile: A Study of the Igboho Period in Oyo History". The Journal of African History 6 (1): 57–77. DOI:10.1017/s0021853700005338. ISSN 0021-8537.