Peace Uko

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Peace Uko
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyerePeace Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya26 Disemba 1995 Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
Ọrụ ọ na-arụsprinter Dezie
blood typeO Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie
so na Dezie

Peace Uko (amụrụ na 26 Disemba1995) bu onye egwuregwu ejiri ọsọ 100 mita maara nke ọma[1]. ọ meriri egwurewgu nke 100m na memme egwuregwu mba Naijiria[2].

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Uko gbara ọsọ nke mbụ ya, 4 × 100m, na-afo 2013 na asompi mba ụwa emere na Moscow. Emechara kapụ aha ya na ndi otu ya n'asompi a n'ihi na ihe mkpishị eji agba ọsọ dapụrụ n'aka Patience Okon George na Stephanie Kalu.

Na-asompi nke mbu ya na Egwuregwu nke Mahadum Naijiriya emere n'afo 2014, ọ merie ọsọ 100m[3]. Ọzọkwa ọ merie ọsọ nke 200m n'ihu Patience Okon George[4]. Nke a nyeere mahadum ya aka, Mahadum Port Harcourt merie egwuregwu nke ugboro ise[5].

Na asompi ọsọ mba uwa na Nassau, ọ gbara ọsọ nke 4 x 100m maka Naijiria maa gbaa onye nke asaa[6]. n'afo 2015, ọ mere ndekọ nke 11.27s na egwuregwu ahụ bụ NTC Pure Athletics Sprints Elite Meet na Clermont, Florida, United States[7]. Na asompi emere na Naijiria n'afo 2016, o gbara nke onye abụọ n'azu Blessing Okagbare-Ighoteguonor, mana n'ihu Gloria Asumnu[8].

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]