Pericoma Okoye

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Pericoma Okoye
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1935 Dezie
Ebe ọmụmụImo State Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya2017 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, odee egwu Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie

Àtụ:Infobox musical artist Pericoma Okoye

Aha Omumu

Chief Pericoma Mezuo Okoye bu onye egwu Naijiria, onye ode egwu na onye odinaala. Enwekwara ike isupe aha nke mbu ya 'Pericoma' dika 'pericomo' 'Perry-Coma' na Perry-Koma'. A maara ya nkeoma n'ala igbo nile site na udi egwu o na-agu na okwukwe siri ike na omume nke okpukpe odinaala ndi'igbo a na akpo Obeah

Ndụ mbido[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ Okoye na Naịjirịa, ọkachasị na steeti Imo, mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ndị Igbo bụ Naịjirịa biri. Amuru ya na obodo ana akpo Arondizuogu, obodo ndi nwere ochichi ime obodo ato: Ideato North, Okigwe na Onuimo .

Onye isi ala[dezie | dezie ebe o si]

Okoye bụ Onye isi ala nke obodo Arondizogu dị na steeti Imo ruo mgbe ọ nwụrụ na 2017. [1]

Udị egwu[dezie | dezie ebe o si]

E nwere ike ịkọwa ụdị egwu ya nke ọma dị ka "ịtọpụta omenaala, ilu, yana ọdịnaala ndị Igbo". [2]

Ọrụ Ihe Nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Ọ pụtara na ihe nkiri akpọrọ Lion Of Africa n'akụkụ Nollywood, Pete Edochie . Ihe nkiri ahụ, nke dị n'akụkụ abụọ, bụ akụkọ ndụ ya na nwata.

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Okoye bu onye kwenyesiri ike na onye na-eme okpukpe ọdịnala ndị Igbo, Obeah. [3] [4]

Okoye bụ nna nke onye na-ahụ maka ịntanetị na Nigeria na onye na-egwu egwu Speed Darlington . [5] [6] [7] [8] [9]

Omenala okpukpe[dezie | dezie ebe o si]

Pericoma Okoye mgbe ọ dị ndụ bu onye amoosu ama ama ma ọ bụ 'onye dibịa' dịka ọ bụ onye egwu dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Naịjirịa kọwara, Legit. [10] Aha Otutu ya 'Arusi Makaja' nwekwara ike ịkọwa nke a, dịka 'Arusi' mgbe atụgharịrị ya n'asụsụ Bekee pụtara 'chi' ma ọ bụ 'ibu'. N'oge emume Ikeji e kwuru na ọ rụrụ ọtụtụ ihe arụ nke megidere ọtụtụ iwu nke ihe ndi bekee kporo physics. Oke dị mma nke ndị mmadụ si Arondizuogu, obodo ya, kwenyere na ọ bụ obere chi. Otutu ngosipụta nke “ike karịrị nke mmadụ” ma ọ bụ “ịgba afa” dịka a na-akpo ya, na mmeri agbanweghi agbanwe na asọmpi niile, mere ka aha ya bụrụ "Ọdụm nke Africa". [11]

Mkpa[dezie | dezie ebe o si]

Okoye bụ onye ama ama na Naịjirịa dịka onye isi ala ọdịnala n'Imo steeti. Ọ bara oke uru ma ruo oru pụtara ìhè na mmepe nke emume Ikeji [12] [13] emere na obodo ya. Emume a nke a na-eme n'onwa nke ano n'afo ọ bụla bụ ebe obodo Naijiria si enweta ego site na mba ofesi, dika ọ na-adọta ndị njem si n'akụkụ ụwa niile. [14]

  • Nnukwu Esemokwu
  • Ikeji Izuogu
  • Obodo Aghoka
  • Igatakwuteya Aja
  • Izu Ka Mma Na Nne Ji [15]

Ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

Ubochi iri na isii n'ọnwa nke abuo dị n’afọ 2017, a kọrọ na ọ nwụọla. [16]

Ntughari[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Elombah, Tim. "Popular Igbo Musician Pericoma Okoye Is Dead [Update]".
  2. Igbo traditional high life music exponent, Pericoma Okoye, passes on. Archived from the original on 2017-02-19. Retrieved on 2021-04-27.
  3. Obeah.
  4. kemetic-dreams: Obeah (sometimes spelled Obi,... | Ancestral Voices: Esoteric African knowledge.
  5. OGA (2017-07-09). Speed Darlington reveals he’s the Son of Pericoma Okoye, says "I hated him" (en-US).
  6. enkay (2017-07-09). Speed Darlington shocks fans, reveals his father is Pericoma Okoye (en-US).
  7. O (2017-07-08). "I hated him" — Speed Darlington reveals he's the Son of Pericoma Okoye (en-US).
  8. REVEALED: Speed Darlington's parents are popular most-feared herbalists in Nigeria (en-US) (2018-08-07).
  9. ukamaka (2019-01-17). Speed Darlington Covers MRH Magazine, Talks Music, His Late Father, and More (en-US).
  10. "Ichie Mezuo Pericomo Okoye, Arusi Makaja 1, aka Pericoma, allegedly dies (UPDATED)".
  11. Igbo Musician, Magician & "Lion Of Africa" Actor, Pericoma Is Dead | 9jaflaver.
  12. IKEJI FESTIVAL OF ARONDIZUOGU Logbaby.
  13. Ikeji Festival in Arondizogu. Archived from the original on 2019-04-19. Retrieved on 2021-04-27.
  14. "Ikeji festival: A boost to Nigeria’s culture – Vanguard News".
  15. pericoma okoye- izu ka mma na nne ji.
  16. A Legend Goes Home: Ichie Pericomo Okoye, Arusi Makaja 1, a.k.a Pericoma, Allegedly Passes On.