Veronica Nnaji

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Veronica Nnaji
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereVeronica Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya10 Jenụwarị 1940 Dezie
Ebe ọmụmụUmuaka Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Veronica Ogechi Nnaji (onye amuru n' ubochi iri n'onwa Jenuarị 1940) bu onye nọọsụ na onye ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria. Na 1979 ọ bụ otu n'ime ìgwè mbụ nke ụmụ nwanyị atọ ndị were oche ha na Ụlọ Nnọchiteanya .

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Nnaji na Umuaka n'ọnwa Jenụwarị 1940, otu n'ime ụmụ asaa onye ọrụ ugbo bụ Therea Ezendu na onye na-azụ ahịa Mathias Ezendu mụrụ. [1] Ọ gụrụ akwụkwọ na Holy Rosary School n'etiti afọ 1948 na 1955, [2] emesia ọ zụrụ ọzụzụ dịka onye nọọsụ na ụlọ ọgwụ Our Lady of Lourdes dị na Ihiala site n'afo 1956 ruo 1960. [1] Ọ gara ụlọ akwụkwọ nke ịdị ọcha na Aba ma gakwa Health Center dị na Nsukka, ọ tozuru oke dịka nọọsụ na 1963. [1] O mechara rụọ ọrụ na Amaigbo Joint Hospital dị na Nkwerre n'etiti 1963 na 1965, mgbe nke ahụ gasịrị ọ rụrụ ọrụ n'ụlọ ụmụaka na-enweghị nne na nna na Okwelle ruo 1970. [1] [2] Ọ lụrụ di n'afọ 1965 ma mụọ ụmụ ise. [2] N'afọ 1974, ọ ghọrọ onye nwe ụlọ ebe a na-amụ nwa. [2]

Na nhoputa ndi omeiwu nke afo 1979, Nnaji bu onye Naijiria ndi otu pati Isu ma tinye ya n'ulo omebe iwu. N'akụkụ Abiola Babatope na Justina Eze, ọ bụ otu n'ime ụmụnwaanyị atọ mbụ a họpụtara na ụlọ omeiwu ka ha nọrọ n'oche ha (A họpụtara Esther Soyannwo n'afọ 1964 mana ọ nọghị oche ya). [3] Ọ jere ozi na nzuko omeiwu ruo 1983 . [2]

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Nigeria who is who in the Legislature (the House of Representatives), 1979-1983, 1983, p79
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Raph Uwechue (1991) Africa Who's who, p1288
  3. Mart Martin (2000) The Almanac of Women and Minorities in World Politics, pp287–288