Jump to content

Lara George: Ọdịiche dị n'etiti nyochagharị

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Content deleted Content added
Created by translating the page "Lara George"
Tags: [[1]] [[MidiaWiki:Cx-nkowapagelink|NtugharịỌdịnaya]]
O nweghị ihe dị iche.

Orübà nà ógè 14:07, 26 Septemba 2020

Lara George

Lere George bụ onye Nigerian gospel onye na-etipụta egwu, na-edekwa egwu ma na akwado otiti egwu. [1]

Biography

Mmalite ndu na agụmakwụkwọ

A mụrụ Lara George n'ime ezinụlọ Oluwole Bajomo na Lagos State, ngalaba nke Nigeria . [2] Ọ gara Queen's College, Lagos, mecha gaa University of Lagos ebe ọ nwetara nzere Mastas digiri Architecture . [3]

Ọrụ otiti egwu ya

George malitere ọrụ egwu ya na University of Lagos, , ebe ọ sonyeere ndị ukwe ukwe ụka nke campus. O so n’otu egwu Kush,bụ nke ekposagoro nke TY Bello, Dapo Torimiro na Emem Ema so na ya. Album nke izizi ya nke akpọrọ ọkụ bụ Forever In My Heart,ọzọ bụ "Ijoba Orun" nke ewepụtara n'afọ 2008. The album buteere ya ọtụtụ ihe nrite na nturu ugo. N’afọ 2008, o ritere ihe onyinye Voice of the Year na Nigeria Music Awards. N’afọ 2010, enwetakwara ihe onyinye kacha elu gbara ụmụ nwaanyị olu ya kacha mma na ‘Headies’,Award bụ nke a na-akpọzi ‘Hip-Hop World Awards’ ugbu a na Nigerịa. Ọ nwetakwara nturu ugo na katigory nke a kpọrọ ''Best African Female Gospel Artiste'' na 2011 Africa Gospel Music Awards emere na London, UK. Lara George onye nke a kpọrọ ''Trailblazer of the year'', a họpụtara ya , Africa Gospel Music Awards, nke afọ 2016 nke sitere n'otu ndị pan-African Kora Awards dị ka ''Best Femal Artise West Afrca nakwa ''Gospel Artiste of the year, Ben TV Awards UK, n'etiti ọtụtụ onyinye ndị ọzọ.

George agụọla egwu n'ọtụtụ mmeme ama ama ndị nke gụnyere GreenBelt Festival UK (dịka otu nke KUSH), otu n'ime ihe nkiri egwu egwu kachasị ukwuu n'Africa nke ihe dika mmadụ puku nari ise biara ya.Ụfọdụ ndị biara kọnsatị a gụnyere ndị ama ama dịka Ron Kenoly, Bebe, Cece Winans, Micah Stampley, Don Moen na Mary Mary. Ihe ndi ọzọ egosipụtara bụ Calabar Festival, MTN Music Festival, Festival of Life UK, Festival of Life Canada, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

George pụtara na BET International dị ka otu n’ime ndị omenkà izizi si Naịjirịa egosiri na mmemme ahụ. Ọ bụ onye otu BET Voting Academy ebe ọ rụrụ afọ abụọ . Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ọka ikpe na igwe onyonyo TV nke Airtel TRACE MUSIC Star .

Ndụ onwe

  1. OVWE MEDEME. What I miss most about kush – Gospel singer Lara George. The Nation.
  2. Lara George Still Strong – More Than A Decade After Kush. Xclusive Gospel, Nigerian Gospel Music Online Magazine (April 10, 2017).
  3. Real reason we broke up KUSH — Lara George. Vanguard News.