Lara George
ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
aha n'asụsụ obodo | Lara George ![]() |
Aha ọmụmụ | Lara George ![]() |
aha enyere | Lara ![]() |
aha ezinụlọ ya | George ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 22 Jụn 1978, 25 Jụn 1978 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Lagos ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, pidgin Naịjirịa ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ, odee egwu, producer ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | University of Lagos, Queen's College, Lagos ![]() |
Ebe obibi | Alpharetta ![]() |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1997 ![]() |
Ụcha ime anya | brown ![]() |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii ![]() |
ngwa egwu | olu egwụ ![]() |
ụdị | gospel music ![]() |
akara ndekọ | Soforte Entertainment ![]() |
Ihe nrite | The Headies, Nigeria Entertainment Awards, GMA Dove Award for Artist of the Year, Crystal Award ![]() |
ahọpụtara maka | The Headies, Kora Awards ![]() |
nnọchiaha nkeonwe | L484 ![]() |
Lara George Audio bụ onye Nigerian gospel onye na-etipụta egwu, na-edekwa egwu ma na akwado otiti egwu. [1]
Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Lara George n'ime ezinụlọ Oluwole Bajomo na Lagos State, ngalaba nke Nigeria . [2] Ọ gara Queen's College, Lagos, mecha gaa University of Lagos ebe m nwetara nzere Mastas digiri mu na ogodo chimaobi Architecture . [3]
Ọrụ otiti egwu ya
[dezie | dezie ebe o si]George malitere ọrụ egwu ya na University of Lagos, , ebe ọ sonyeere ndị ukwe ukwe ụka nke campus. O so n’otu egwu Kush,bụ nke ekposagoro nke TY Bello, Dapo Torimiro na Emem Ema so na ya. Album nke izizi ya nke akpọrọ ọkụ bụ Forever In My Heart,ọzọ bụ "Ijoba Orun" nke ewepụtara n'afọ 2008. The album buteere ya ọtụtụ ihe nrite na nturu ugo. N’afọ 2008, o ritere ihe onyinye Voice of the Year na Nigeria Music Awards. N’afọ 2010, enwetakwara ihe onyinye kacha elu gbara ụmụ nwaanyị olu ya kacha mma na ‘Headies’,Award bụ nke a na-akpọzi ‘Hip-Hop World Awards’ ugbu a na Nigerịa. Ọ nwetakwara nturu ugo na katigory nke a kpọrọ ''Best African Female Gospel Artiste'' na 2011 Africa Gospel Music Awards emere na London, UK. Lara George onye nke a kpọrọ ''Trailblazer of the year'', a họpụtara ya , Africa Gospel Music Awards, nke afọ 2016 nke sitere n'otu ndị pan-African Kora Awards dị ka ''Best Femal Artise West Afrca nakwa ''Gospel Artiste of the year, Ben TV Awards UK, n'etiti ọtụtụ onyinye ndị ọzọ.
George agụọla egwu n'ọtụtụ mmeme ama ama ndị nke gụnyere GreenBelt Festival UK (dịka otu nke KUSH), otu n'ime ihe nkiri egwu egwu kachasị ukwuu n'Africa nke ihe dika mmadụ puku nari ise biara ya.Ụfọdụ ndị biara kọnsatị a gụnyere ndị ama ama dịka Ron Kenoly, Bebe, Cece Winans, Micah Stampley, Don Moen na Mary Mary. Ihe ndi ọzọ egosipụtara bụ Calabar Festival, MTN Music Festival, Festival of Life UK, Festival of Life Canada, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.
George pụtara na BET International dị ka otu n’ime ndị omenkà izizi si Naịjirịa egosiri na mmemme ahụ. Ọ bụ onye otu BET Voting Academy ebe ọ rụrụ afọ abụọ . Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ọka ikpe na igwe onyonyo TV nke Airtel TRACE MUSIC Star .
Obibi Ndụ ya
[dezie | dezie ebe o si]Ọ lụrụ Gbenga George, onye ọkaiwu na onye na-achụ nta ego. O nwere umu abuo: otu nwoke aha ya bu Adeoba na nwagboghobia aha ya bu Tiaraoluwa ma biri na Alpharetta, Georgia di na Amerika. [4]
Ọ bụ osote onye isi oche nke SoForte Entertainment Distribution Ltd., ụlọ ọrụ izizi ahaziri ahazi maka nhazi na nkesa mmemme na Nigeria, ha na ụlọ ọrụ IAS / TNT ndị oje ozi nakwa ụlọ ọrụ na-esipụta nri a kpọrọ ''Mr Biggs'' na ''Sweet Sensation'', nke butere mmepụta ọnụ ụlọ nri narị abụọ na iri ise na Nigeria bụ nke ha na-ekesa ngwa egwu ha.
Egwu ndị o tiri
[dezie | dezie ebe o si]- Forever In My Heart (2008)
- Lara George (2009)
- Higher - The Dansaki Album (2012)
- Love Nwantintin (2014)
- Onye Medley (2014)
- Iberibe Eluigwe (2017)
Órú nka ya
[dezie | dezie ebe o si]- "Ndewo" (Adele mkpuchi) (2015) [5]
Onyinye na nhoputa
[dezie | dezie ebe o si]Afọ | Mmemme | Nrite | mpụtara | ebe nsinweta |
---|---|---|---|---|
2016 | KORA onyinye | Best Gospel Artiste | a họpụtara ya | [6] |
2014 | BEN TV UK onyinye | o meriri | ||
Onyinye Crystal | Nwanyi Ulo Oma Kacha Mma | o meriri | ||
2013 | Afrika Gospel Music kwuo | Trailblazer nke Afọ | o meriri | |
2012 | Ozi Egwu Oziọma | Best African Nwa nwanyi Gospel Artiste | o meriri | [7] |
2011 | Onyinye Ntụrụndụ Naịjirịa | Onye Oma Onye Oma | o meriri | |
2010 | o meriri | |||
Isi | Ọrụ kacha mma (Nwanyi) | o meriri | ||
Nigeria Music onyinye | Nwanyi Ulo Oma Kacha Mma | o meriri | ||
2008 | Isi | Ọrụ kacha mma (Nwanyi) | a họpụtara ya | [8] |
Hụ kwa
[dezie | dezie ebe o si]Ebe nsi nweta
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ OVWE MEDEME. What I miss most about kush – Gospel singer Lara George. The Nation.
- ↑ Lara George Still Strong – More Than A Decade After Kush. Xclusive Gospel, Nigerian Gospel Music Online Magazine (April 10, 2017).
- ↑ Real reason we broke up KUSH — Lara George. Vanguard News.
- ↑ Why I keep my husband as my manager — Lara George. Vanguard News.
- ↑ Hello (Adele Cover). Joey Akan. Archived from the original on 7 December 2015. Retrieved on 4 December 2015.
- ↑ "BIOGRAPHY LARA GEORGES - KORA", KORA.
- ↑ "Lara George is African queen of gospel music - Vanguard News", Vanguard News.
- ↑ Lara George songs. Archived from the original on 2020-10-31. Retrieved on 2020-09-27.