Jump to content

Dumebi Iyamah: Ọdịiche dị n'etiti nyochagharị

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Content deleted Content added
Akwugo (ṅkátá | mmetara)
Created by translating the page "Dumebi Iyamah"
O nweghị ihe dị iche.

Orübà nà ógè 14:12, 30 Novemba 2020

Dumebi Iyamah

Dumebi Andrea Iyamah onye amụrụ n’afọ 1993, bụ onye Naịjirịa na Canada n'eme ihe gbasara Ejiji amụrụ ma zụlite na Lagos, Nigeria . Ọ bụ onye isi oche na onye guzobere aha labeelụ ejiji bụ Andrea Iyamah nke na-ahụ maka ejiji agbamakwụkwọ, uwe eji egwu mmiri wdg. A maara ya maka ejiji ụmụ nwanyị na uwe eji egwu mmiri, nke ndị ama ama dịka Gabrielle Union, Ciara na Issa Rae . [1] [2]

Mmalite Ndụ na mmụta

Amụrụ Iyamah na Lagos, nye nne na nna bụ Andrew na Onyi Iyamah bu ndị si Ika na(Agbor ) dịka onye nke ano n'ime ụmụ anọ. Ọ gara ụlọ akwụkwọ Grange na Lagos .

O nwere nzere bachelọ na Nkwukọrịta na Mọltịmidịa na McMaster University . Ọ malitere akara ejiji ya bụ Ontario Canada n'oge ọ na-amụ akwụkwọ na Mahadum McMaster mgbe ọ dị afọ iri na asaa, o wepụtara ntọala ụdị ejiji site na enyemaka na nkwado nke ezinụlọ ya na ndị enyi ya. [3]

Ọrụ

Iyamah malitere iwu akara ejiji ya bụ Andrea Iyamah mgbe ọ dị afọ iri na asaa. Isi ụlọ ọrụ "Andrea Iyamah" dị na Toronto, yana ụlọ ngosi ahịa ama ama na Lagos nke ebidoro n'afọ 2017 [4] [5] [6] [7] N'oge ọ malitere ịde blọgụ, ọ kesara ọrụ ya nke nka gụnyere eserese ejiji., ihe eserese, na foto ya na ndị na-ege ntị dijitalụ. E gosipụtara otu n'ime atụmatụ ya na blọgú na-ewu ewu na 2011 nke kpalitere okike nke "Andrea Iyamah." [8] [9] [10] Ọ tinyere ichụ na azụmaahịa ya ka ọ na-achụso mmụta mahadum,Ọ malitere site na ịkepụta akwa emume sitere n'aka ndị ahịa. Ọ nụchahariri akara ahụ ka ọ gbasaa gaa na ngalaba ejiji atọ nke gunyere ejiji agbamakwụkwọ, akwa eji egwu mmiri ma ọ bụ akwa ọpụpụ. Na nwebata ọzụzụ oke akwa eji egwụ mmiri na 2013, ọrụ ya enwetala nlebara anya site na ndị nrupụta akwa dịka Vogue, Elle, Essence, Refinery29, HuffPost, Cosmopolitan na ọtụtụ ndị ọzọ. [11] [12]

O meela ọtụtụ ihe ngosi ejiji n’Afrika, Europe, France, na United States [13] ya na ndị ama ama dịka Ciara, Gabrielle Union, Genevieve Nnaji na ndị ọzọ yi ekike ya. [14] [15] [16] O gosiputara akara ngosi 2020 nke oge sọma nke izu ngosi Ejiji 2019 na Lagos. [17]

Ndụ onwe

Iyamah bụ nwa ikpeazụ n’ime ụmụaka anọ Andrew na Onyi Iyamah mụrụ. Nna ya bụ ịnjịnịa site na agụmakwụkwọ ma nne ya bụ onye ọrụ nkà ịchọ mma nwere ogige ana eme isi na ebe a n'ere ákwà. N'oge amụrụ ya, nne na nna ahụ bụ ndị ọchụnta ego, nwere azụmaahịa ha. Mgbe ọ dị nanị afọ asaa, nna ya nwụrụ, ma ọ bụ nne ya zụlitere ya. [18] [19] Nwanne ya nwanyị, onye na-eme ihe nkiri bụ Somkele Iyamah, bụ onye nduzi nke akara ejiji Andrea Iyamah . [20]

Nrụtụaka

Njikọ dị na mpụga

  • Official website