Jump to content

Ọ̀mụ̀ntụdị

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Site na aka-ikpa rue aka-nri, elu rue ala: ọda-iyi na ndagwurugwu, nkanụzụ laser, bolom-bolom eji enyocha ìgwè, àmùmà, nzukọ kpakpando, ntụsa nrù, ọgbụgba ụmi-atọm, nsèrèsè nhiwe-ngahari ụgbọala.

Fiziksi bu ọ̀mụ̀mụ̀ sayensị na eleba anya na màtá, mmejupụta ya, ngaghari ya, na omume n'ime mbara & oge, ma kwa etu osi gbásáá ume na njimike.

Fiziksi so na otu ọ̀mụ̀mụ̀ kacha dị ochie, na mbụ fiziksi, kèmị̀à, bayọlọji yana ụfọdụ ngalaba matimatiksi nọ na okpuru filọsọfi okike, mana mgbe enwere Mgbake Sayensị na Afọ-narị nke 17, ngalaba sayensị okike ndịa mèchàrà we buru Ọ̀mụ̀mụ̀ dị iche iche nọrọ onwe ha. Fiziksi na ezute ọtụtụ ọ̀mụ̀mụ̀ nnyocha ndị ọzọ dịka bayofizksi, na kèmị̀à kwantụm, òkè ọ̀mụ̀mụ̀ na agbanwe kwa mgbe. Alo ọhụrụ na apụta na fiziksi na enyere aka ịkọwa echiche awapụtara na sayensị ndị ọzọ ma na etinye uche na usoro ọhụrụ aga eji mee nnyocha na ọ̀mụ̀mụ̀ ndịa dika matimatiksi na filọsọfi

Nhatanha na-egosi mmekọrịta dị n'etiti Njimike igwe-ọdidọ na mmejupụta ya. Njimike igwe-ọdidọ (F) na enye ubara chaji (q), ụwara (v) ya na mbara igwe-ọdidọ (B).

Ngalaba Fiziksi

[dezie | dezie ebe o si]

Ntinye ọrụ ọ̀mụ̀mụ̀ fiziksi na ezute ọtụtụ nhanhiwe agbanyeghị na ọkànfiziksi nile nwere iwu na usoro ha ji arụ ọrụ. Enyochala iwu na usoro ndịa nile ma chọpụta na ha na okike gakọrọ. Ịma atụ, iwu nke ntọala ngahari na egosipụta ọfụma ngahari ihe, tumadu na ha ka atọm ibu ma nwe ụwara na erughi ụwara ìhè.

Iwu na usoro ndịa bu ngwa dị mkpa maka ime nnyocha na ọ̀mụ̀mụ̀ gamiri agami, ọkafiziksi ọbula agbanyeghị ngalaba ọbula kwesịrị ịma gbasara ha. Iwu ndị a bukwa ngalaba fiziksi gụnyere ngahari nkịtị (fiziksi nkịtị), ǹkàngahari kwantụm (fiziksi kwantụm), njemokpomọkụ na ngahari stasisi, magnelatrịkị, ya na mmetụta ọpụrụiche.

Fiziksi Nkịtị

[dezie | dezie ebe o si]
Usoro oge ọkà fiziksi ndị tinyere aka na ọ̀mụ̀mụ̀ ngahari.

Fiziksi nkịtị gụnyere ngalaba na ọ̀mụ̀mụ̀ ndị àmà ama na mbido narị-afọ nke 20: Ngahari nkịtị, Ụdà, ìhèn'anya, njemokpomọkụ ya na magnelatrịkị.

Ngahari nkịtị na elebara anya na njimike ya na ngahari ha na ebute, ọnwere ngalaba abụọ ǹkà-ọkwumọtọ (ọ̀mụ̀mụ̀ njimike nọ na ihe na anaghị agaghari), ngaharimkpe (ọ̀mụ̀mụ̀ ngahari na adịghị eleba anya na ihe n'ebute ya), ngaharizuruoke (ọ̀mụ̀mụ̀ ngahari na njimike n'ebute ya). Enwekwara ike ịkewa ngahari ka ọ bụrụ ngahari ọkpụrụkpụ na ngahari nrù, ngahari nrù nwere ngalaba dika nkwụmọtọ-nru, ngahari-nru, ya na ọgazụfere.

Ụda bu ọ̀mụ̀mụ̀ etu esi emepụta, achịkwa, enyefe ma na anabata ebiri ụda. Ngalaba ụda dị oké mkpa taa gụnyere ụdanfere, ọ̀mụ̀mụ̀ ebiri ụda nke nwere nnukwu mkpụgboro (frequency) gáfèrè ihe mmadụ ga egenwu; ụda-ndụ, fiziksi nke ụda anumanu ya na ụdalatriki, ntụgharị ebiri ụda ana anụ site na ngwa latriki.

Ìhèn'anya, bu ọ̀mụ̀mụ̀ na eleba anya na ìhè anya na ahụ na nke anya na anaghị ahu dika nchawa-ụhịe ya na nchawa nfereụhịe, nke na egosi njirimara ìhè belusọ ịhụ ụzọ (ime-enyo, mgbanwe-nkiri, nkụkọta-ọnụ, nkesa, mgbasa, na ngakọta-ọnụ).

Okpomọkụ bu otu ụdị ume, bu ihe atọm ihe ọbula nwere; njemokpomọkụ na eleba anya na mmekọrịta dị n'etiti okpomọkụ na ụdị ume ndị ọzọ. Magnelatrịkị bu ọ̀mụ̀mụ̀ ana amụ dika otu ngalaba fiziksi kemgbe narị-afọ̀ 19; njemọkụ latriki na ebute mbara igwe-ọdidọ, ma mgbanwe mbara igwe-ọdidọ na amanye njemọkụ latriki. Nkwụmọtọlatriki na elebara anya na chaji latriki nke kwu ọtọ, njemlatriki na elebara anya na chaji na eme ngahari ebe magnestasisi na elebara anya na mbara igwe-ọdidọ kwu ọtọ.

Ngahari Stasisi

[dezie | dezie ebe o si]
Mgbakọmyiri Stasisi

Ngahari stasisi bu atụmatụ matimatiksi nke na etinye usoro ngosi-data (stasisi) & iwu ọpụrụịmè na mgbakọta ihe dị ntakịrị. Aha ya ozo bu fiziksi stasisi maọbu njemokpomọkụ stasisi, ana etinye ya na ọrụ na ọ̀mụ̀mụ̀ dum dị na fiziksi, bayọlọji, kèmị̀à, sayensịnụịro, ọ̀mụ̀mụ̀ kọmputa, iwu mgbasaozi, na ọ̀mụ̀mụ̀ ígwé-mmadụ. Isi sekpùntị ya bu ịkọwa njirimara mátà na ahiri, makwa na iwu okike na achị ngahari atọm ya.

Nhatanha na-egosi na mgbanwe ọgbaghara (S) kwa mgbanwe ọgụgụ oge (t) karịrị efu. Nhatanha nkea ka esi weputa iwu nke abụọ nke njemokpomọkụ.

Ngahari stasisi sitere na mmepe njemokpomọkụ nkịtị, ọ̀mụ̀mụ̀ nke ọ nwere ike ịkọwa njirimara nhụtanya nkeokpookpo (dika ọdamọkụ, mpidala, mbum okpomọkụ) na etu osi gbasa njirimara nkentakịrị na agbanwe kwa mgbe ma na enwekwa nkesa ọpụrụịmè.

Nhatanha na-egosi mmekọrịta ụdị ume dị iche iche nọ na nhanhiwe (system). Mgbanwe ume nile (dE) bu mgbakọ ume okpomọkụ (–T S), ume mpidala (P V) na ume kemịkalu ( N). Nhatanha na-egosi iwu nke abụọ nke njemokpomọkụ P bu mpidala, V bu volume, bu mwem-kemịkalu, S bu ọgbaghara, T bu ọdamọkụ, ebe N bu onụ-ọgụgụ mkpụrụ ya (particle).

Ebe njemokpomọkụ nkịtị na elebara anya na nhata njemokpomọkụ, ngahari stasisi na etinye anya na ngahari stasisi na aghaghị rue na mwapụta kentakịrị nke ụwara usoro na anaghị echilata azụ. Ọmụmatụ usoro ndịa gụnyere mmeghari kemịkalu yana nrum okpomọkụ na ihe.

Ǹkàngahari Kwantụm

[dezie | dezie ebe o si]

Ǹkàngahari kwantụm bu ngalaba fiziksi na eleba anya na nhiwe atọm na nkewa atọm ya na mmekọrịta ha site na nhụta ụdị ume ọbula na apụta na nchịkọ nke akpọrọ "quanta". Iwu kwantụm kwadoro nanị arụ̀marụ̀ ọpụrụịme maọbu ngosi-data nke njirimara ọkpụrụkpụ nkewa atọm. Nhatanha Schrödinger na enye aka na ngahari kwantụm dika etu iwu Newton ya na iwu nchekwaba ume si enye aka na ngahari nkịtị (ọ na ebu amụma omume nhanhiwe mgbanwe). Ọ bụkwa nhatanha ebiri nke eji arụ arụ̀marụ̀ ebiri.


Ìhè maọbu nchawa magnelatrịkị nke chaputara maọbu chabaa na atọm nwere ụfọdụ mkpụgboro (maọbu nsetị-ebiri), dika aga ahụtanwu site na enyo ahịrị ejiri mara mmejụta kemịkalu nke atọm ahụ. Iwu kwantụm na egosi na mkpụgboro ndịa na egosi ume nke kwantụm ìhè maọbu fotọn, ihe ndịa bu maka na latrọn nke atọm na enwe ụfọdụ nha ume enyere ya; mgbe latrọn a si na otu nha ume ba na nha ume ọzọ, nchịkọ ume (nke akpọrọ kwantụm ume) nke mkpụgboro ya na ndiche ume n'etiti nha ume ha na agako, na achawapụ maọbu achaba.

Magnelatrịkị

[dezie | dezie ebe o si]

Magnelatrịkị bu mmekọrịta dị n'etiti ọkpụrụkpụ ndị nwe chaji latriki site na mbara magnelatrịkị. Njimike magnelatrịkị so n'otu n'ime njimike okike anọ enwere. Ọ bu njimike kachasị na mmekọrịta atọm na njikọ-atọm. Ana ahụtakwa magnelatrịkị dika Mgbakwunye nkwụmọtọlatriki ya na ígwè-ọdidọ bu ndị dị iche mana ha na agakọ. Njimike magnelatrịkị na adịkwa n'etiti ihe abụọ nwere chaji. Njimike latriki na ebute ndọta n'etiti ihe nwere chaji eyighị, na ndọsa n'etiti ihe nwere chaji yiri onwe ha. Ígwé-ọdidọ bu mmekọrịta dị n'etiti ihe nwere chaji nọ na njem. Njimike abụọ ndịa gbakọrọ ịwepụta njimike magnelatrịkị.

Mmetụta Ọpụrụiche

[dezie | dezie ebe o si]

Iwu nke mmetụta ọpụrụiche bu nke Albert Einstein turu na 1905 mgbe ọ dere édémédé ya "On the Electrodynamics of Moving Bodies" nke ntụgharị ya bu "Maka Njemlatriki nke Ihe Ngahari". Isi okwu édémédé a na egosi na mmetụta ọpụrụiche na emezi ndị iche di na nhatanha Maxwell ya na ngahari nkịtị. Iwu ndị a dị abụọ: (1) ụdị matimatiksi nke iwu nke fiziksi agaghị na nhanhiwe inertia; (2) ụwara ìhè n'ime vacuum anaghị agbanwe, agbanyeghị ebe ọ sị maọbu onye na ele. Njikọ Iwu abụọ a chọrọ njikọ mbara na oge n'ime echiche mbara dabere na atụmatụ.

Nkuzi Fiziksi

[dezie | dezie ebe o si]

Nkuzi fiziksi bu usoro nkuzi ndị ejigasi ekuzi fiziksi. Ana akpọ ọrụ a onyenkuzi fiziksi. Nnyocha nkuzi fiziksi bu ngalaba nyocha zuru okè na achọ ịhazi usoro ndịa. Site na mbụ, ana akuzi fiziksi na ụlọakwụkwọ sekọndiri yana mahadum site na usoro nkuzi ya na nwalee na ụlọnnyocha, ị me ka enyochata ihe akuziri na klaasi. Echiche dị na fiziksi bu ihe aga aghọtanwu ọfụma ma egosipụta ya site na nwalee dị oké, ya na ajụjụ ajụrụ ga eme ụmụ akwụkwọ ịchemi echiche ihe ga eme na nnwali ma ihe mere ọ ji mee. Ụmụ akwụkwọ ọbula sonyere na mmụta zuru oke na amụta site na nchọpụta ha mere na onwe ha. Site na nwali ha ga amụta ịgbanwe etu ha si chee maka ihe omume dị na fiziksi ma chọpụta echiche dị na ya. Nkuzi fiziksi so na otu ngalaba nkuzi sayensị.

Ọrụ Fiziksi

[dezie | dezie ebe o si]

Ọkàfiziksi bu onye ọkà-sayensị nke bu ọkachamara na fiziksi, nke gbakọrọ mmekọrịta mátà na ume na ahiri ma na oge na okike. Ndị Ọkàfiziksi na elebara anya na ihe butere ihe omume dị na fiziksi, ha na atụghari echiche a ka ọ bụrụ nhatanha matimatiksi. Ha na arụ ọrụ na ọtụtụ ọrụ nnyocha dị iche iche site na fiziksi nkewa atọm rue bayofizksi rue fiziksi ìgwè. Ọrụ fiziksi nwere ụdị ọkàfiziksi abụọ: ọkàfiziksi nke nwalee, ndị na ahuta maka nnyocha ihe na eme na okike, nnwapụta ya na ntule nwali echiche fiziksi. Nke ọzọ bu ọkàfiziksi ọtụmiwu, bu ndị na ahụta maka ịse atụmatụ matimatiksi nke nhanhiwe fiziksi iji we kọwaa ma bue amụma maka ihe na eme na okike.

Ọkàfiziksi na etinye ihe ha mụtara n'ọrụ iji mezie nsogbu maọbu nwepụta nkanụzụ ọhụrụ (ihe amara dịka fiziksi ntinye-ọrụ maọbu fiziksi ọkànjịnịa)