Ọ́bá Akwụkwọ Kashim Ibrahim

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ọbá akwụkwọ Kashim Ibrahim bụ otu n'ime ọbá akwụkwọ agụmakwụkwọ kachasị ukwuu n'Afrịka nke dị na isi ụlọ akwụkwọ nke Mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria, Naijiria. A na-akpọkarị ya KIL site na Abusites.

Ọbá akwụkwọ ahụ bụ otu n'ime ọbá akwụkwọ agụmakwụkwọ kachasị ochie na Naịjirịa n'ihe gbasara ezigbo ụlọ ọrụ, njikọ ịntanetị kwụsiri ike na ịnweta ọbá akwụkwọ. Onye bubu onye na-elekọta ọ́bá akwụkwọ mahadum a bụ Prọfesọ Doris Bozimo[1] Aha onye na-elekọta Ọ́bá Akwụkwọ Mahadum a ugbu a bụ Abdulhamid Gambo nke na-arụ ọrụ dị ka onye na-ahụ maka ọ́bá Akwụkwọ.[2]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

E guzobekọtara ụlọ ọbá akwụkwọ mahadum a n'afọ 1963 ya na mahadum a na ebumnuche nke ijere ndị òtù mahadum a niile ozi. Alhaji Sir Kashim Ibrahim meghere ụlọ ọbá akwụkwọ dị ugbu a n'ọnwa Disemba n'afọ 1976, onye e ji aha ya gụọ ya. ụlọ ahụ nwere ikike maka ihe dị ka mpịakọta 500,000 (Puku Narị Ise) nke akwụkwọ na ọnụ ọgụgụ ndị na-agụ akwụkwọ 2000 n'otu oge.[3][3]

Ọdịdị ya[dezie | dezie ebe o si]

E nwere nnukwu ọbá akwụkwọ nke bụ ụlọ nwere okpukpu atọ dị na isi ụlọ akwụkwọ, o nwere ngalaba na ọfịs dị iche iche. Ọbá akwụkwọ ahụ nwere nkewa pụrụ iche dị ka ngalaba usoro, ngalaba Ntuziaka, Ụlọ Ọchụchọ CD-SROM, ngalaba mgbasa ozi, Ngalaba Akwụkwọ Ndị E debere na Ụlọ Ọgụgụ.[2] A na-ahụ alaka ndị ọzọ nke ọbá akwụkwọ ahụ n'ụlọ ọgwụ nkuzi na n'èzí steeti ebe mahadum ahụ, Zaria.[4][5]

Nchịkọta[dezie | dezie ebe o si]

E nwere ihe dị ka akwụkwọ 160,000 (Puku Otu Narị na Iri Isii) na akwụkwọ akụkọ 5138 n'ọbá akwụkwọ Kashim Ibrahim na nchịkọta maka nka na sayensị mmekọrịta mmadụ na ibe ya dị na okpukpu nke mbụ, ebe ndị maka sayensị anụ ahụ, ahụike na injinia dị na okpukpere nke abụọ.[6][7] Ọbá akwụkwọ ahụ nwere ọtụtụ ngalaba nke nwere nchịkọta niile dị ka ndị a:

  • Mmepe nke Ndị Mmadụ
  • Mmepe nke Ihe ọmụma
  • Nhazi Ihe Ndị E Ji Ji Jiha
  • Nkewa nke usoro
  • Ngalaba mgbasa ozi
  • Teknụzụ ozi na nkwukọrịta (ICT)
  • Ngalaba Na-ahụ Maka Ndị Ahịa

Ọ́bá akwụkwọ Satellite[dezie | dezie ebe o si]

Ọbá akwụkwọ Kashim Ibrahim nwere ọbá akwụkwọ satellite na-akwado nkuzi, mmụta na nyocha nke dị ka ndị a:[3]

  • Ọbá akwụkwọ ọrụ ugbo na Institute of Agricultural Research na Samaru nke na-enye ozi Resource na sayensị ọrụ ugbo.
  • Ọbá akwụkwọ ahụike maka ngalaba ọgwụ nke dị na Institute of Health.
  • Lee T. Railsback Library nke na-eje ozi na ngalaba nke ọgwụ Veterinary, sayensị ọgwụ.
  • Ọbá akwụkwọ President Kennedy na ogige Kongo nke na-eje ozi na ngalaba nchịkwa.
  • Ọbá akwụkwọ iwu na-eje ozi na ngalaba iwu na ogige Kongo
  • Ebe a na-ahụ maka ọmụmụ iwu Islam na ogige Kongo
  • National Animal Production Research Institute (NAPRI)

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndị Kanuri
  • Ndepụta nke ọbá akwụkwọ na Naijiria
  • Ndepụta nke ọbá akwụkwọ agụmakwụkwọ

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Admin (2017-01-12). BOZIMO, Prof. Doris Oritse Wenyimi (en-US). Biographical Legacy and Research Foundation. Retrieved on 2022-05-22.
  2. 2.0 2.1 The Iconic Kashim Ibrahim Library: One Of Africa's Largest University Libraries | The Abusites (en-US) (2022-03-07). Retrieved on 2022-11-30.
  3. 3.0 3.1 3.2 Ahmadu Bello University Zaria (2010). ABU Library complex Student Hand Books, 9th (in English), Zaria-Kaduna state: Ahmadu Bello University press, 17. 
  4. Iconic Kashim Ibrahim Library: One Of Africa's Largest University Libraries | The Abusites (en-US) (2022-03-07). Retrieved on 2022-05-22.
  5. Kashim Ibrahim Library. www.gamji.com. Retrieved on 2022-05-22.
  6. Akhidime (1979-01-01). "The Kashim Ibrahim library building: Its genesis, progress and prospects" (in en). International Library Review 11 (1): 179–190. DOI:10.1016/0020-7837(79)90048-7. ISSN 0020-7837. 
  7. Akhidime (1979-01-01). "The Kashim Ibrahim library building: Its genesis, progress and prospects". International Library Review 11 (1): 179–190. DOI:10.1016/0020-7837(79)90048-7. ISSN 0020-7837.