Ọdụ Ụgbọelu mba Ụwa Mallam Aminu Kano

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ọdụ ụgboelu mba ụwa Mallam Aminu Kano
international airport, ọdụ ụgbọ élú, commercial traffic aerodrome
aha mkpirisiKano, Kano Dezie
A gụrụ ahaAminu Kano Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaKano Dezie
nhazi ọnọdụ12°2′51″N 8°31′28″E Dezie
date of official opening1936 Dezie
ebe a na-eje ozi site n'ọdụ ụgbọ njemKano Dezie
state of usein use Dezie
runway06/24, 05/23 Dezie
IATA airport codeKAN Dezie
ICAO airport codeDNKN Dezie
Map
Ọdụ Ụgbọelu mba Ụwa Mallam Aminu Kano

Àtụ:Infobox airportỌdụ Ụgbọelu Mba Ofesi Mallam Aminu Kano (bu ọdụ ụgbọ elu mba ofesi na- eje ozi na Kano, isi obodo Kano Steeti nke Naijiria . Ọ bụ ọdụ ụgbọ elu Royal Air Force tupu mba ahụ enwere onwe ya. Ọ bụ ọdụ ụgbọ elu na-eje ozi n’ebe ugwu Naịjirịa ma agụrụ ya aha onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Aminu Kano . Ọdụ ụgbọ elua nwere ọnụ mba na nke ụlọ . Ọrụ nwughari malitere na ọnụ ụlọ ọhuru nke ụlọ ọrua ma a gbapekwara ya na ụbochi iri abụọ na atọ nke ọnwa May 2011. N’afọ 2009, ọdụ ụgbọelu lebara ndị njem dị puku narị atọ na ịrị abụọ na atọ na narị anọ na iri asatọ na abụọ anya. Otutu ụgbọ elu mba ofesi na-elekọta ọtụtụ ndị obodo Lebanọn dị na Kano na njem alakụba Alakụba ana aga na Mecca.

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Ọdụ Ụgbọ elu mba ụwa Mallam Aminu Kano bụ nke kacha ochie na Naịjirịa na ụgbọelu mbụ rutere na Naịjirịa rutere Kano na afọ 1922, ma irụ ọrụ bidoro na afọ 1936. N'ime iri afọ ndị mbụ nke ọrụ, ọ ghọrọ ebe nkwụsị maka mmanụ dị mkpa nye ụgbọ elu na-efe ọrụ ogologo oge n'etiti Europe na Africa. Ụgbọ elu ndi Ọhụrụ achọghị nkwụsị mmanụ dị otú ahụ, tịnyekwara njedebe nke akụ na ụba Kano na ngwụsị narị afọ nke ịrị abụọ, ọtụtụ ụgbọ elu mba ụwa kwụsịrị ime njem site na ọdụ ụgbọ elu ahụ. Mgbe ha kwụsịrị ọrụ ha ebighebi na Kano na afọ Juun 2012, KLM bụ naanị ụgbọ elu si mba Europe na-eje ozi na Kano, nke ha mere na-enweghị nkwụsị kemgbe afọ 1947. [1]

Lọ ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọdụ ụgbọ elua na-efe ụgbọ elu ndị nkịtị na nke ndị agha. A na-ejikarị Ọkpọrọ ụzọ ụgbọ elu na esi efepụ ma na ada nwere akara 06/24 eme ihe maka ụgbọ elu ndị nkịtị, ebe Ọkpọrọ ụzọ ụgbọ elu na esi efepụ ma na ada nwere akara 05/23 na-arụkarị ọrụ maka ọdụ ndị ọrụ Ndọkwa ọbọdọ Nigeria dị na ndịda ọdụ ụgbọ elua. Ọkpọrọ ụzọ ụgbọ elu na esi efepụ ma na ada nwere akara 05/23 nọ na arụ ọrụ niile mgbe agbazigharịrị ọkpọrụzọ nke ịsi na mbido  narị afọ nke iri abụọ na otu. Ọdụ njedebe ụgbọ elụ ahụ dị n'agbata okporo ụzọ abụọ ahụ.

Kano VOR-DME (njirimara: KAN) na mgbama ndị na-enweghị ntụzi (njirimara: KO na AO) dị na mpaghara ama. [2] [3] [4]

Ọdụ njedbe ụgbọ elụ nke pụtara ịhe na ụlọ elu na-achịkwa ụfe bu ha na-efe ụgbọ elu mba ụwa na ọrụ ụlọ nke Arik Air na-arụ . Akụrụngwa ndị dị na ọgbe ezumike nchere ọpụpụ dị ntakịrị, yana ebe ngọsi akwụkwọ akụkọ dị nso na tebụl ndenye ego na obere ụlọ mmanya n'akụkụ ebe ụgbọ elụ na anọ. Onwere obere ulo ezumike maka ndi njem dị ezigbọ Mkpa. Ụlọ ọrụ ahịa ndi na-enweghị ụtụ mechịrị emechi ka ọdi ụgbụa. E nwere obere ụlọ mmanya na ụlọ ọrụ nzipu ozi na ọgbe mbata. N'ebe ndịda ọdụ ụgbọ elu, n'okporo ụzọ akara ya bụ 06/24, bụ ọdụ njedebe ụgbọ elụ ụlọ nke na-arụ ọrụ ugbua maka ụgbọ elu nke IRS . Akụrụngwa ndi ahu gụnyere ebe a na egọsi ma na-ere akwụkwọ akụkọ na obere ụlọ mmanya. Ịwu ọdụ njedebe ụgbọ elụ nke ụlo ohuru di n'akụkụ ụlọ ọdụ njedebe ụgbọ elụ nke pụtara ịhe,  malitere na mmalite narị afọ nke iri abụọ na otu. A gbahapụrụ ọrụa ma maliteghachiarịa ya. Onye na-ahụ maka ọdụ ụgbọ elu ahụ, Federal Airport Authority Nigeria (FAAN), hụrụ nrụcha nke ọdụ ọhụrụ ahụ na ọnwa Nọvemba afọ 2009. A gbapere ya maka ibidọ ọrụ na ọnwa Mee afọ 2011.

Ndị nhazi ụsọrọ ụgbọ elu na ebe njedebe[dezie | dezie ebe o si]

Onye njem[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Airport destination list

Ibu[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Airport-dest-list

Ndekọ ọnụ ọgụgụ[dezie | dezie ebe o si]

Ihe ndekọ data a na-egosi ọnụọgụ ndị njem na-abanye n'ọdụ ụgbọ elu, dịka nchọpụta ndị ngalaba Nchịkọta jikọrọ ụgbọelu nke Federal Airports Authority nke Naijiria kwuru.

Afọ 2005 2006 2007 2008 2009 2010 2011 2012 2013 2014 2015
Ndị njem 302,017 349,057 381,862 363,290 341,367 381,841 448,792 369,132 327,267 433,263 389,530
Uto (%) 3.13% 15.58% 9.40% 4.86% 6.03% 11.86% 17.53% 17.75% 11.34% 32.39% 10.09%
Isi mmalite: Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN). Akụkọ Ngalaba Ụfe ụgbọelu (2010-2013, [5] 2014, [6] Q3-Q4 nke afọ 2015, [7] na Q1-Q2 nke afọ 2016, [8] )

Ihe Mberede[dezie | dezie ebe o si]

  • N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Juun afọ 1956, ụgbọelu BOAC n'arụ ọrụ na ike njin anọ Canada C-4 Argonaut dara ma kpọkasịa ka ọ si n’ọdụ ụgbọelu mba ụwa dị na Kano n'apu. N'ime ndị njem iri anọ na ise na ndị ọrụ nọ n'ụgbọ ahụ, ọ bụ naanị mmadu iri na atọ bu ndị n'anwụghị.
  • N'abali iri abụọ na abụọ n'ọnwa Jenụwarị afọ 1973, Nnukwu Ọdachi mere n'ikuku Kano - otu ụgbọ ala Alia Boeing 707-320C dara ma kpọkasia na ọdụ ụgbọ elụ mba ụwa dị na Kano mgbe ọ na-anwa ịdatu n'etiti oké ifufe. Mmadu otu nari iri asaa na isii n'ime ndị njem dị nari abụọ na abụọ na ndị ọrụ nọ n'ụgbọ ahụ nwụrụ. Ọ bụ ma bụrụ ọdachi ụgbọelu kachasị njọ na akụkọ ntolite nke Nigeria.
  • N'abali anọ nke ọnwa Mee afọ 2002, EAS Airlines Flight nwere akara 4226, bu BAC 1-11-500 ụgbọelu nwere njin abụọ dara ma kpọkasia mgbe ọ si na ọdụ ụgbọ elu mba ụwa Mallam Aminu Kano pụta, gbuo ndị njem dị iri asaa na otu na ndị ọrụ nọ n'ụgbọ ahụ tinyere mmadụ iri asaa na asatọ ndị ọzọ bi gburugburu ebe ahu bukwa ndị ụgbọ elu ahụ mebiri ụlọ ha.

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Njem na Nigeria
  • Ndepụta ọdụ ụgbọelu ndị dị na Nigeria
  • Aha ụgbọ elu ndị kacha ekwo ekwo na Africa

Ntughari[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Air Force Historical Research Agency</img>Ederede a metukwara aka na ihe akụkọ ndị diri ọhaneze sitere n'akara ịntaneti a http://www.afhra.af.mil/

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. KANO INTERNATIONAL AIRPORT – From Grace to Grass and Back Again. JetLife Nigeria (10 July 2013). Archived from the original on 3 March 2015.
  2. Kano NDB (KO) @ OurAirports. ourairports.com. Retrieved on 2018-08-21.
  3. Kano NDB (AO) @ OurAirports. ourairports.com. Retrieved on 2018-08-21.
  4. Kano VOR-DME (KAN) @ OurAirports. ourairports.com. Retrieved on 2018-08-21.
  5. Passenger Only Aviation Data Report 2010-13 to Q1 2014
  6. Aviation Sector Summary Report Q4 2014 - Q1 2015
  7. NIGERIA AVIATION SECTOR Q3-Q4 2015 REPORT
  8. Nigerian Aviation Sector Summary Report: Q1-Q2 2016