Ọgwụ ọgbụgba Hepataịtis B

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ọgwụ ọgbụgba Hepataịtis B
essential medicine, vaccine type
obere ụdị nkeviral hepatitis vaccines, vaccine Dezie
onye nchọpụtaBaruch Samuel Blumberg Dezie
vaccine forHepataịtis B Dezie
brandTwinrix, Recombivax HB Dezie
WordLift URLhttp://data.medicalrecords.com/medicalrecords/healthwise/hepatitis_b Dezie

[ I[ File:US Navy 070406-N-5627R-326 Airman Sandra Valdovinos, from Delano, Calif., administers Airman Adam Helton, from Mesa, Ariz., a Hepatitis B vaccine.jpg | thumb ] ]

Ọgwụ ọgbụgba Hepataịtis B bụ ọgwụ emere maka ọrịa umeji nke abụọ.[1] Ntụziaka enyere maka ya bụ ka agbaa ya nwatakịrị ozugbo amụrụ ya, ma gbakwuo ya ugbo abụọ maọbụ atọ. Ndị nwere ọrịa obiri na aja ọcha na ndị ahụ ha esichaghị ike kwesịrị ịgba ya, ọbụladị ndị amụrụ mgbe ha erubeghị ọnwa itolu n’afọ. Onyela nchekwa ruo pasent 95 nke ndị gbara ya mgbe kwesịrị.[1]

Ọdịkwa mma inyocha ọbara nke onye gbarala ya iji mara ma ọrụọla ọrụ ka okwesịrị. Ndị ahụ ha esichaghị ike nwekwara ike ịgba ya site na mgbe ruo na mgbe maọbụrụ n’ọdị mkpa. Ndị nwere ọrịa ụmeji mana ha agbaghị ọgwụ ya kwesịrị itinye ọgwụ ọbara mgbe ha n’agba ọgwụ a. A na-eji ntụtụ agbanye ya n’ime ahụ.[1]

Onweghị ihe n’esochi mgbe mmadụ gbara ya. Mana onwere ike igbu onye ahụ mgbu ebe ọgbara ya. Onye dị ime na nwaanyị n’enye nwa ara ga-ejikwa ya mee ihe. Onwebeghị mgbe achọpụtara n’ọ na-enye nsogbu n’akwara maọbụ akụkụ ndịozọ nke ahụ karịa ebe okwesịrị. Ọgwụ maka ya ndị emepụtara bụ site na nnyocha dị iche iche emere n’ebe ọtụtụ mmadụ nọ. Ọgwụ ndịa nọ, ma tinyere ndịọzọ ejikọtara.[1]

Na mba Amerịka k’ebu ụzọ chọputa ọgwụ maka hepataịtis n’afọ 1981.[2] Nke ka mma batara ahịa n’afọ 1986.[1] Ótú mba ụwa akpọrọ Wọld Helt Ọganaịzeshọn ji ya mee ihe dịka ọgwụ ha ga-eji eme ihe nke kasị mkpa maka nlekọta ahụike.[3] Ọnụegọ maka onye chọrọ ịzụ ọtụtụ bụ dọla 0.58 na 13.20 maka otu n’afọ 2014.[4] Na mba Unaịted Steeti ọnụego ya bụ site na dọla 50 na 100 maka otu.[5]

Njikọ[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 "Hepatitis B vaccines WHO position paper" (PDF). Weekly epidemiological record. 40 (84): 405-420. 2 Oct 2009.
  2. Moticka, Edward. A Historical Perspective on Evidence-Based Immunology. p. 336. ISBN 9780123983756.
  3. "WHO Model List of EssentialMedicines" (PDF). World Health Organization. October 2013. Retrieved 22 April 2014.
  4. "Vaccine, Hepatitis B". International Drug Price Indicator Guide. Retrieved 6 December 2015.
  5. Hamilton, Richart (2015). Tarascon Pocket Pharmacopoeia 2015 Deluxe Lab-Coat Edition. Jones & Bartlett Learning. p. 314. ISBN 9781284057560.