Ọmụgwọ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ọmụgwọ
omenala
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaNdịda ọwụwa anyanwụ Naijiria Dezie
ndị n'eme yaNdị Igbo Dezie

Ọmụgwọ gee ntị  bụ okwu ndị Igbo nke Ndịda-Ọwụwa anyanwụ Naijiria na-eji akọwa omume nke onye ezinaụlọ ga na-elekọta nne mụrụ nwa ohụrụ na nwa ya, n'obere oge ọ mụchara nwa. Oge ọmụgwụ nwere ike ị bụ ụbọchị iri anọ mbụ nke ndụ nwatakịrị ma ọ bụ karia.[1] N'ọtụtụ ọnọdụ, ọ bụ nne ma ọ bụ nne di ọhụrụ na-aga anọ nyèrè ya. N'ọnọdụ ebe ha na-anọghị, onye ezinaụlọ nwanyị ọzọ ga anochi anya nne di ma ọ bụ nne nwanyị mụrụ nwa ohụrụ. Ihe dị mkpa nke omume a bụ na ọ na-enyere nne ọhụrụ aka ime ka ọrụ ya dị mfe site na ahụmahụ nke nne (di ma ọ bụ nwunye), iji nyere ha aka ịghọ nne, site n'inye ihe ọmụma na nkwado.[2] [3]

óménàlà ndị Igbo[dezie | dezie ebe o si]

Agbụrụ Igbo bụ ndị malitere omenala ọmụgwọ nke a na-eme ugbu a n'ọtụtụ ebe na Naijiria. Omenala a na-enye nlekọta pụrụ iche nye ndị nne mụrụ nwa ọhụrụ na ndị na-enye nwa ara.[4] Nlekọta mgbe amuchara nwa (ọmụgwụ), di mkpa ka nne ohuru wee zuru ike nke oma, ka o nwetaghachi ike ya.[5] Omugwo bu otu n'ime ihe kachasi mkpa ma bụrụ kwa óménàlà ochie ndi Igbo.[3]

Otu esi eme ọmụgwọ[dezie | dezie ebe o si]

Ọtụtụ oge, mgbe amuchara nwa bụ mgbe omugwo na-amalite. Ọ bụ ọrụ nne (nke di ma ọ bụ nwunye) ịkụziri ma ọ bụ ịduzi nne mụrụ nwa ọhụrụ na ụdị nri ọ ga na-eri iji nyere aka na ịmepụta mmiri ara ka nwa na-aṅụ, a ga ahịa ya aka n'ahụ na má kwa ya mmiri ọkụ.[6]

Mgbe amuchara nwa, nne nne ga-enyere nne ọhụrụ aka ịmá mmiri ọkụ na ahụ. Usoro ịma mmiri na-ekpo ọkụ gụnyere ịtinye akwa na mmiri ọkụ na iji ya na-má n'afọ nne ọhụrụ. Ịnọdụ na mmiri ọkụ bụ omume dị mkpa ma ọ bụrụ na nne ọhụrụ mụrụ ji ikpu mụọ nwa ka mkpụkọ ọbara dị n'afọ ya wee pụta ka o wee gwọọ ime ahu ya nke ọma.[2][5] Nne ma ọ bụ nne di nwanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-arụ ọtụtụ ọrụ ụlọ, na-elekọta ma nne ọhụrụ na nwa ọhụrụ.[3]

A ga-enye nne ọhụrụ ahụ ihe oriri na-afụ ose dị ka ofe ose na ụda iji nyere aka wepụ mkpụkọ ọbara nke achọghị na ahụ ya ma nyere aka ịkwalite mmepụta mmiri ara. Akamu bụkwa nhọrọ nri ọzọ a na-enye nne ọhụrụ ka ọ na-enyere aka ịmepụta mmiri ara ya.[5][7]

Na ngwụcha ọmugwo, a na-ezila/nye nne ma ọ bụ nwunye di nne mụrụ nwa ọhụrụ onyinye ịji gosipụta ekele site n'aka nne na nna ọhụrụ. Onyinye ekele nwere ike ị bụ ihe ndị dị ka akwa, ncha, ihe oriri, ego, na ihe ndị ọzọ.[8]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. BBC World Service - Focus on Africa, Omugwo: Igbo's postpartum cultural practice (en-GB). BBC. Retrieved on 2022-07-12.
  2. 2.0 2.1 Claire Mom (2022-04-12). Unpaid postpartum care, 'Omugwo', affecting women empowerment (en-US). NewsWireNGR. Retrieved on 2022-07-12.
  3. 3.0 3.1 3.2 RefinedNG (2020-08-01). OMUGWO (en-US). RefinedNG. Retrieved on 2022-07-12.
  4. 10 Things About Igbo Tribe 10 Interesting Things We Know About the Igbo (en-US). RefinedNG (2022-06-25). Retrieved on 2022-07-12.
  5. 5.0 5.1 5.2 Omugwo: Understanding The Culture Behind Igbo's Traditional Postpartum Care (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2018-11-07). Retrieved on 2022-07-12.
  6. Omugwo: When a new mother is pampered (en-GB). Vanguard News (2018-08-22). Retrieved on 2022-07-12.
  7. Omugwo: The Igbo practice of caring for the new mother and baby…. – Ibiene Magazine (en-GB). Retrieved on 2022-07-12.
  8. Sincerelyonyi (2017-10-10). Omugwo also known as igbo traditional after birth care (en-US). Sincerely Onyi. Retrieved on 2022-07-12.