Jump to content

Ọrịa na-éfē èfè

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ọrịa na-éfē èfè

Nke Njerịa bụ nje dịkarịsịrị ntakịrị - nje nke anya nkịtị na-enweghị ike ịhụ - nwere ike ikesa ọrịa ma kpatakwa nrịanrịa maọbụ ọrịa. A na-akpọkwa anụmanụ ndị a na-ebugharị ọrịa nje maọbụ 'parasaịt' oge ụfọdụ, maka na ọ na-eji ahụ onye o bi n'ime ya mere nri. Nje ọrịa ndị a na-ahụkarị bụ nje vaịrọs na bakterịa.[1] Ọrịa ndị nje ọrịa na-akpata - dịka ọrịa COVID-19 - ka a na-akpọ ọrịa na-efe efe maọbụ ọrịa nkesa.

Ụdịdị

[dezie | dezie ebe o si]

Nke zoro ezo vs nke a ga-achọpụtanwu (nke a na-ahụghị anya vs nke a na-ahụ anya)

[dezie | dezie ebe o si]

Okwu a bụ “ọrịa òfùfè ” na-ekwú maka nnweta nje ọbụla na-ebute ọrịa, n’agbanyeghị ma ọ dị obere ma kama na a na-eji ya egosipụta na e nwere ọrịa nke a na-ahụ anya. Nke a nwere ike ibute mgbagwojuanya mgbe ụfọdụ, ya mere na ndị na-arụ ọrụ na ngalaba ahụike na-ekwukarị banyere njigbu ahụ mmadụ mgbe nje ndị a na-ebute ọrịa nọ mana e nweghị ọrịa ọbụla. E kewara ọrịa òfùfè nwere mgbaàmà ụzọ abụọ: nke anya na-adịghị ahụ & nke anya na-ahụ. Ọrịa òfùfè nke na-ejigbu ahụ, mana o nweghị ihe mgbaàmà ọbụla ka a na-akpọ nke zoro ezo (e nwekwara ike ịkpọ ya anya ahụghị maọbụ ọgbara nkịtị). Ọrịa òfùfè nke a na-ahụghị anya na-ekwu maka ọrịa nọ nkịtị n'ahụ ma ọ naghị arụ ọrụ maọbụ ebute nsogbu ọbụla. Ọmụmaatụ: ụkwara nta zoro ezo bụ ọrịa nje bakterịa na-éfē èfè. Ọrịa vaịrọs na-éfē èfè nwekwara ike ịdị na nzokwa, dịka ọmụmaatụ ọrịa 'herpes'. E kewakwara ọrịa òfùfè n'ụzọ ndị a: ndị na-ala ngwangwa,[2] (ebe mgbaàmà na-amalite ngwa ngwa), ndi na-adịghị ala ala,[3] (ebe ihe mgbaàmà na-eji nwayọọ na-abịa) ndị nọ n'etiti, (ebe mgbaàmà na-ewe ogologo oge iji gosipụta ma ọ na-ejigbu ahụ ngwangwa karịa ọrịa na-adịghị ala ala), ndị a na-ahụghị anya, (ebe ihe mgbaàmà na-anaghị egosi mana nje ọrịa nọ ya) ndị nọ n’akụkụ ahụ, [4] (nke a kọwapụtara dịka ebe ọrịa bidoro site na ya gbasaa n’akụkụ ahụ niile).

Nnyefe Ọrịa

[dezie | dezie ebe o si]

Ụzọ nke nje ọrịa si na-ebugharị ọrịa site n’ótù onye ruo n’onye ọzọ ka a na-akpọ usoro nnyefe. Nje ọrịa ụfọdụ pụrụ iche na-akpata ọrịa na-efe efe pụrụ iche tinyekwara na ọrịa nje ọbụla pụrụ iche nwere usoro nnyefe nke ha pụrụ iche. Iji ghọta ihe kpatara ọrịa ofufe na-eji apụta nakwa ụzọ kachasị mma iji gbochie ha, ndị ọkà mmụta sayensị aghaghị ịghọta usoro nnyefe nke ọrịa ofufe.

Usoro nnyefe ọrịa ofufe nwere ọtụtụ mpaghara maọbụ nkebi. Na nkenke, ha bụ ndị a:

  1. Nje ọrịa maọbụ parasite (n'ihi na ọ na-ebi n'ahụ onye na-arịa ọrịa) bụ nje ahụ na-ebute ọrịa òfùfè. Nje ọrịa ndị a na-ahụkarị bụ nje vaịrọs na bakterịa.
  2. Óbu ọrịa bụ anụmanụ maọbụ mmadụ "bu" nje ọrịa.
  3. Ụzọ ọpụpụ bụ etu nje ọrịa na-esi ahapụ ahụ onye bu ọrịa
  4. Nnyefe na-ekwu maka ụzọ nje ọrịa si esi n'ahụ onye bu ọrịa ruo n'ahụ onye ọzọ ga-ebutenwu ọrịa.
  5. M̀bárá ezi na-ekwu maka ebe ahụ nje ọrịa ga-agaferịrị tupu o si n'ahụ onye bu ọrịa ruo n'ahụ onye ọzọ ga-ebutenwu ọrịa
  6. Ụzọ mbata bụ oge ahụ nje ọrịa banyere n'ahụ onye ga-ebutenwu ọrịa.
  7. Óbu ọrịa ọdịnihu, bụ onye ahụ ya dị n'ụdị ịna anabata nje ọrịa.

E nwere ike ibufe nje ọrịa site n'ahụ onye bu ọrịa ruo n'ahụ onye ga-ebutenwu ọrịa n'ụzọ dị iche iche. Ụfọdụ nje ọrịa ka a na-ebufe site na nri maọbụ mmiri, ụfọdụ site na mmekọahụ mmadụ na mmadụ ebe nje ọrịa ndị ọzọ na-esite n'ikuku abịa. N'okwu nke a kpụ n'ọnụ, anyị ga-eleba anya na nke na-esi n'ikuku.

Nke dị na mbụ na nke batara n'ihi na oghere dapụtara

[dezie | dezie ebe o si]

Nke dị na mbụ vs. nke batara n'ihi na oghere dapụtara.

[dezie | dezie ebe o si]

N'eziokwu, ọnụ ọgụgụ ọrịa dịkarịsịrị ala ka a na-enweta n'ahụ ndị nwere ezigbo ahụike n'agbanyeghị na nje dị iche iche jupụtara ebe niile. Mbido na ikike ọrịa na-adabere n'ikike nje ọrịa (maọbụ nje) igbu onye bu ọrịa nakwa ikike ya ịlụso ya bụ nje ọgụ nakwa mgbe ụfọdụ ndị soja ahụ na-ekpochapụ nje nwere ike inye obu ọrịa ihe mmerụ ahụ mgbe ha na-agbalị ịhazi ọrịa òfùfè. N'ihi nke a, ndị ọrụ ahụike kewara nje dịka nke na-adịbu n'ahụ na nke batara n'ihi na oghere pụtara.

Nje ọrịa dịbu

[dezie | dezie ebe o si]

Nje ọrịa dịbu (maọbụ nje) na-ebute ọrịa n'ihi na ha nọ n'ahụ maọbụ na ha na-arụ ọrụ ma nwee ike ịkpata ọrịa n'ahụ onye nwéré ezigbo ahụike. Ọtụtụ nje n'ahụ mmadụ bụ naanị mmadụ ka ha nwere ike ịkpatara ọrịa mana ụfọdụ ọrịa dị egwu ka nje ndị a nwekwara ike ibubata n'èzí maọbụkwanụ ndị na-ebufe ọrịa n'anụmanụ ndị ọzọ

Nje ọrịa batara n'ihi na oghere dapụtara

[dezie | dezie ebe o si]

Nje ọrịa batara n'ihi na oghere dapụtara nwere ike ibute ọrịa òfùfè n'ahụ ndị nwere ọnụ ọgụgụ soja agha ahụike dị ala(ndị soja mbuagha ahụike ha ezughị oke) maọbụ ndị n'ihi n'ọnọdụ ha dịka 'awamahụ/operation' maọbụkwanụ ihe mberede nwere ike ịbanye n'ime ahụ ha. Nje ọrịa batara n'ihi na oghere dapụtara na-ekesa ngwangwa mgbe ọnọdụ ahụike onye bu ya dịkarịsịrị ala.

Ọrịa òfùfè àgbá mbụ vs ọrịa òfùfè àgbá nke abụọ

[dezie | dezie ebe o si]

E nwere ike ịhụta ọrịa òfùfè àgbá mbụ dika isi mkpatara nsogbu ahụike, ebe ọrịa òfùfè nke àgbá abụọ bụ ọrịa òfùfè ndị ahụ bụ mpụtara nsogbu sitere n'isi mkpatara.

Ike nkesa ọrịa

[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ụfọdụ a na-akpọ ọrịa òfùfè ọrịa nkesa mgbe e nwere ike ikesa ha ngwangwa site na mmekọahụ onye bu ọrịa a maọbụkwanụ ọ̀sụ́sọ́ ọrịa ndị si ya n'ahụ na-apụta (ọmụmaatụ: ụkwara nta) Ọrịa òfùfè ndị ọzọ dị iche iche maọbụkwanụ nke na-ekesa ekesa n'ụzọ òfùfè pụrụ iche, dịka mmekọahụ nwoke na nwanyị, bụ nke a na-anaghị ekwu na ha bụ ọrịa nkesa, mana mgbe ụfọdụ ọ dịchaghị mkpa na ndị na-arịa ya ga-anọpụ iche. A na-ekesakarị ọrịa òfùfè site n'otu onye ruo onye nke ọzọ site na mmekọahụ maọbụ nkesa ihe ntụsá, n'agbanyeghị nke a ha nwekwara ike ikesa site n'ikuku, nri mebiri emebi na mmiri ọṅụṅụ, mmekọahụ mmadụ na anụmanụ na arụ́ ahụhụ. [5]

Akara & Mgbaàmà

[dezie | dezie ebe o si]

Ụdị mgbaàmà ọrịa òfùfè na-adabere n'ụdị ọrịa. Ụfọdụ akara ọrịa òfùfè na-emetụta ahụ niile, dịka ike ọgwụgwụ, enweghị agụụ iri nri, ịta ahụ, ahụọkụ, ọ̀sụ́sọ́ abalị, oyi ọmụma, ahụ ụfụ na ahụ mgbu. Ụfọdụ na-anọkarị n'akụkụ ahụ pụrụ iche, dịka akpụkpa ahụ, ịtụ ụkwara, maọbụ nsọpụta imi. Mgbe ụfọdụ, ọrịa òfùfè nwere ike ọ gaghị egosipụta mgbaàmà ọbụla n'ọtụtụ oge maọbụ oge niile ọ nọ n'ahụ mmadụ ọbụla. Ibute nje ọrịa apụtaghị na mmadụ butere ọrịa na-éfē èfè, maka na ọ bụghị nje niile na-ebute ọrịa.[6]

Nje bakterịa maọbụ nje vaịrọs

[dezie | dezie ebe o si]

Maka na bakterịa na vaịrọs nwere ike ibute otu ụdị ọrịa, ọ na-abụ ihe siri ike ịchọpụta nke kpatara ọrịa ọbụla.[7] ịghọta ndịiche dị n'etiti ha abụọ dị mkpa, n'ihi na ọrịa nje vaịrọs enweghị ọgwụ ọgwụgwụ mana ọrịa nje bakterịa nwéré ọgwụ ọgwụgwụ.[8]

Ntụle ndịiche dị n'etiti ọrịa òfùfè vaịrọs na nke bakterịa.
Njirimara Ọrịa òfùfè vaịrọs Ọrịa òfùfè nke bakterịa
Mgbaàmà a na-ahụkarị N'izugbe, ọrịa nje vairọs na-emetụta akụkụ ahụ dị iche iche maọbụ karịa otú mpaghara ahụ n'otu oge; ya bụ nsọpụta imi, mkpọchi okporo ụzọ imi, ụkwara, ahụ mgbu, dzg. Naanị ụfọdụ ọrịa nje vaịrọs na-afụ ụfụ, dịka ọrịa ụfụ mamịrị nke a na-akpọ 'herpes'. A na-adị akọwakarị ụfụ ọrịa nje vaịrọs dịka ịkọ ọ́kọ́ maọbụ okpomọkụ. Mgbaàmà ndị a na-ejikarị amata ọrịa òfùfè bakterịa bụ akụkụ ahụ na-acha ọbara ọbara, okpomọkụ, ọzịza ahụ na ụfụ. Otu n'ime ihe a na-eji amakarị ọrịa òfùfè bakterịa bụ mgbu mpaghara ahụ, ụfụ nke nọ naanị n'otu akụkụ ahụ. Dịka ịma atụ, ọ bụrụ na e nwere ọnya nke nje bakterịa bara n'ime ya, akụkụ ahụ́ ebe ahụ̀ ọnya dị ga na-afụ ụfụ. Ọnyá na-agbapụta ábụ na mmiri dị ọcha ga-eburiri nje bakterịa.[9]

Ọgwụgwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọrịa òfùfè busoro ahụ agha, ọgwụ na-egbu nje nwere ike ịkwụsị ọrịa ahụ. E nwere ọtụtụ ọgwụ nje bakterịa . Ọgwụ nje bakterịa a na-akpọ 'antibiotics' na-arụ ọrụ maka ịkwụsị naanị nje baktérịa; ọ naghị emetụta vaịrọs. Ọgwụ nje baktérịa na-arụ ọrụ site n'ibelata mmụba nje bakterịa maọbụkwanụ igbu ha kpamkpam. [10]

References

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Chapter: 2. Disease and disease transmission. Available at https://ec.europa.en>cpd02 Accessed on 13 April 2020
  2. Grinde, Bjørn (2013-10-25). "Herpesviruses: latency and reactivation – viral strategies and host response". Journal of Oral Microbiology. 5: 22766. doi:10.3402/jom.v5i0.22766. ISSN 0901-8328. PMC 3809354. PMID 24167660.
  3. Acute infections (MPKB)". mpkb.org. Retrieved 2019-12-09.
  4. Boldogh, Istvan; Albrecht, Thomas; Porter, David D. (1996), Baron, Samuel (ed.), "Persistent Viral Infections", Medical Microbiology (4th ed.), University of Texas Medical Branch at Galveston, ISBN 978-0-9631172-1-2, PMID 21413348, retrieved 2020-01-23
  5. Foster, John (2018). Microbiology. New York: Norton. p. 39. ISBN 978-0-393-60257-9.
  6. Ryan KJ, Ray CG, eds. (2004). Sherris Medical Microbiology (4th ed.). McGraw Hill. ISBN 978-0-8385-8529-0.
  7. (Higurea & Pietrangelo 2016)
  8. "Bacterial vs. Viral Infections – Do You Know the Difference?" National Information Program on Antibiotics
  9. Robert N. Golden; Fred Peterson (2009). The Truth About Illness and Disease. Infobase Publishing, 2009. p. 181. ISBN 978-1438126371.
  10. "Infection". Rencare. Archived from the original on March 5, 2012. Retrieved 4 July 2013.