Gaa na ọdịnaya

Ọrụ Aka

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ọrụ Aka
metaclass, second-order class
Obere ụdị nkeAkaọrụ Dezie
Mụrụ yasociology of professions Dezie
Nwere àgwàakụkụ Mmụta, professionalism, wage Dezie
Ndị n'eme yaprofessional Dezie
Ndị ji ya eme iheby occupation or profession Dezie
Megidere nkehobby Dezie
Artisans africain

Ọru Aka bụ ọrụ e ji emepụta ihe nka di iche iche. Ihe a na-akpọ ndi na-arụ ya bụ ndi ọrụ aka. Ndi ọrụ aka bụ ndi gara ọzụzụ were turu ugo na nka di iche iche. Ha jiri anya nka na nkuzi ha natara na-arụpụta ihe ndi gụnyere oche, akwa ndina, tebulu na kabinet. Ndi nọ na otu iji osisi aruputa ihe ndia ka a na-akpọ ọkwa nkà. Ndi ọrụ aka gụnyekwara ndi na-akwa akwa, ịkpa akwa,[1] ndi na-esi nri, ndi na-edozi ụlọ, ndi na-eme achịcha, ndi na-edozi ụgboala di iche iche, ndi na-akpa isi,[2] ịkpụ ụzụ[3] na ndi na-edozi akarangwa mebiriemebi. Ọtụtụ n'ime ha bụ ndi nwere onwe ha ma chọtakwa ụmụ ọrụ na-enyere ha aka na ụlọ ọrụ ha. Ọtụtụ bụ ndi ewere na ụlọ ọrụ bekee ka ha na-edozi ihe ndi mebiri emebi ebe ahụ, dika ọkụ, eletrik na jeneratọ. Ọru Aka bụ otu ụzọ di mkpa ndi mmadụ si enye onwe ha ọrụ ma na-ekesakwa ọrụ na ala anyi ọkachasi ugbua ọrụ gọọmentị na adighi. Ndi ọrụ aka jupụtara ebe nile. A naghi-achọ ha achọ na okporo ụzọ m'oli.


N'oge mbụ, ndi chọrọ ịmụ ọrụ aka na-aga na nke onye nwere ya, kwụọ ya ụgwọ. Ha na-akwụziri ndi ahụ ụru, ihe dịka otụtụ onwa mọbụ otụtụ afọ tupu e duo onye ahụ ka ọmalite nke ya. O ka nwekwara ebe ọ di otu ahụ mbọchi taa. Ma enwekwaziri ọtụtụ ụlọ akwụkwọ, ebe ndi mmadụ na-agakwa mụọ ọrụ aka. Ha na-agụ ya ka e si agụ akwụkwọ na mahadum tupu ha turu ugo pụta mepekwa ya n'ụdị pụrụ iche. Nwoke na nwanyị na-arụ ọrụ aka n'ihi na igbo kwetara na “aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ, a rụọ n’anwụ, erie na ndo, ike kete, o rie, onye rụọ, ya erie.[4] Ọzọkwa bụna orụ aka bụ maka ndi na-agba mbọ. I jimatụ, a nahụta ndi igbo dika ndi na-agba mbọ. Ya mere e jiri kwuo so "onye Igbo bụ onye e ji ịgba mbọ mara. Ọ na-agba mbọ ịkpata nke ọ ga-eri, nke ọga-eji nyere nne na nna ya na ọha izugbe aka."[5]

Ebensidee

[dezie | dezie ebe o si]
  1. file:///C:/Users/ADMIN/Downloads/142676-Article%20Text-379291-1-10-20160822.pdf
  2. https://www.bbc.com/igbo/afirika-46556465
  3. https://www.bu.edu/200word/igbo/professions/
  4. https://www.researchgate.net/publication/331935527_Usoro_Aka_Oru_Ndi_Igbo_Ihe_A_Choro_Maka_Ntuteghari_Onodu_Aku_Na_Uba_Iji_Kwusi_Ariri_Na-Eri_Ndi_Igbo
  5. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54111128