Ọrụ Nkuzi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ọrụ Nkuzi bụ izi ihe n'ụdị di iche iche ka e wee nwee mmụta na mbawanye. Ọ bụ otu n'ime akaọrụ di na mba ụwa nile. Ọ bụkwa otu n'ime akaorụ dibara mgbe gbo, site na okike ụwa. E nwere otụtụ ụzọ esi akuzi nkuzi nke gụnyere ịkpa nkata, imụ ọrụ, ọzụzụ, nyocha na ikwado. Aha a na-akpọ ndi na-arụ a bụ Ndi Nkuzi. E nwere ndi nkuzi na ngalaba di iche iche na n'ogo di iche iche dika na ụlọ akwụkwọ, ulọ ụka na ụlọ ọrụ. A na-ahụ ndi ọrụ nkuzi ka ndi mara ihe ma nwekwa oke mmụta. Ọ bụ n'ihi na ha na-aga ọzụzụ pụrụ iche na ụlọ akwụkwọ ma nwekwaa akara nzere. Mana ọbụghi ndi nkuzi nile nwere akara nzere na nnukwu ụlọ akwụkwọ. E nwere ndi ọrụ nkuzi bụ ọpụrụ iche na akaọrụ dika ikpụ ihe, ịse ihe na ọrụ aka di iche iche. Ma nwekwa ndi ọrụ nkuzi na ụlọ akwụkwọ prima, sekọndịri na mahadum di iche iche.

Udi Ndi Nkuzi[dezie | dezie ebe o si]

E nwere ndi nkuzi na ngalaba ụlọ akwụkwọ di iche iche na mba ụwa nile. Otu ihe jikọtara ha dum bụ na ha na-akuziri ndi mmadụ ka ha si na itibọrịbọ pụta ma nweta mmụta ga-enyere ha aka igbanwe ndụ ha ka ọkawanye mma. E nwekaraa ndi nkuzi kpuru isi na ndi nwere olusi di iche iche.[1] Ọtụtụ ebe ha na-arụ gụnyere:

Ulọ akwụkwọ ntakara bu ebe ndi nkuzi na-akuziri ụmụntakiri ndi nọ na-agbata afọ abụọ were rue afọ ise. Umụntakiri a bụ ndi na-amụ ka esi ekwu okwu. Ka ọdi tata, ọtụtụ ndi nne na nna na-akpọgakwa ụmụ ha ndi erubeghi afọ abụọ na ụlọ akwụkwọ ntakara ka ndi nkuzi nọ ebe ahụ na-elekọta ha tutu ruo mgbe ha gbasara ọru maọbụ mechie ahia.

Ulọ akwụkwọ prima maọbụ elementiri bụ ebe ana-akuziri ụmụntakiri di na agbata afo isii were ruo afọ iri na otu. Ha na-ebido na elementiri nke mbụ were ruo na nke isii mgbe ha ga-ele ule were banye sekọndịrị. Ndi nkuzi nọ ebe ahu na enwere klas ma kuzicha ihe gbasara akwụkwọ (class subject) were ruo mgbe ụmụntakiri ahụ ga-agafe na klas ọzọ.

Ulọ akwụkwọ sekọndịrị na Koleji[2] bụ nkeji ebe ụmụntakiri tolitegoro ma marakwa ihe. Ndi nkuzi ha na-akuziri ha ebe ọpụrụ iche iji nyere ha aka inweta ọrụ nka, inyere onwe ha aka ma ibanyekwa na nnukwu ụlọ akwụkwọ mahadum maka mmụta di elu.

Ulọ akwụkwọ mahadum[3] bụ ejesia ọgwụ na mmụta ebe ndi nkuzi na-arụ ọlụ. Ndi nkuzi nọ ebe ahụ bụ ọkacha mara na ngalaba di iche iche na mmụta. Ebe ahụ ka enwekwara ndi nnukwu ọka mmụta na ihe nile. Ọ bụ na mahadum ka ndi nkuzi na-azụpụta ndi dibia oyibo, ndi nkuzi, ndi ọrụ nchekwa, ndi injinia,<refhttps://tryengineering.org/teachers/teacher-resources/></ref> ndi ọka ikpe, ndi nkuzi igbo,[4] ndi nlekọta ọba akwụkwọ na ndi ọzọ

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://www.bbc.com/igbo/afirika-46419968
  2. https://www.worldcat.org/title/edemede-nka-na-ilu-igbo-maka-ndi-sekondiri-na-koleji-a-na-azu-ndi-nkuzi-si-naka/oclc/19074582
  3. Archive copy. Archived from the original on 2021-05-15. Retrieved on 2021-05-15.
  4. https://wakuwaku2021.online/download/ikuzi-igbo-usoro-ndi-nkuzi-tosiri-iso-the-essentials-of-igbo-language-teaching-for-student-teachers-upe-igbo-teacher-education-text-august-27th-31st-1979