Jump to content

Ọrụ ugbo na India

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Akụkụ nke ndị ọrụ na-arụ ọrụ n'ọrụ ugbo na India

Akụkọ ihe mere eme nke ọrụ ugbo na India malitere n'Oge Neolithic. Obodo India nọ n'ọnọdụ nke abụọ n'ụwa niile na mmepụta ugbo. Dị ka nnyocha akụ na ụba India site n'afọ 2020 rụo 21, ọrụ ụgbọ were ihe karịrị 50% nke ndị ọrụ India n'ọrụ ma nye aka 20.2% na GDP nke mba ahụ.[1]

N'afọ 2016, ọrụ ụgbo na ngalaba ndị metụtara ya dị ka ịkpa anụ, ọrụ ọhịa na ịkụ azụ mejupụtara 17.5% nke GDP (ngụkọta ngwa ahịa ụlọ) na ihe dị ka 41.49% nke ndị ọrụ n'afọ 2020 [2] [3] .[4][5] India bụ nke mbụ n'ụwa na mpaghara kachasị elu nke mba US na China sochiri.[6] Enyemaka akụ na ụba nke ọrụ ugbo na GDP nke India n'ebelata nwayọọ nwayọọ na uto akụ na ụba zuru oke nke mba ahụ. N'agbanyeghị nke ahụ, ọrụ ugbo bụ ngalaba akụ na ụba kachasị ukwuu ma n'arụ ọrụ dị mkpa na usoro mmekọrịta ọha na eze na akụ na ụba nke mba India.

gụkọta nke ngwa ahịa ugbo bụ US $ 3.50 ijeri na onwa Machị - June n'afọ 2020. India bubatara $ 38 ijeri ngwa ahịa ugbo n'afọ 2013, na-eme ka ọ bụrụ nke asaa kachasị ebubata ugbo n'ụwa niile na nke isii kachasị ebubata.[7] Ọtụtụ n'ime ihe ndị a na-ebupụ n'ọrụ ugbo na-ejere mba ndị na-emepe emepe na ndị n'enweghị ọganihu ozi. A n'ebupụ ihe oriri ndị India na ihe karịrị mba 120, ọkachasị mba Japan, Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia, mba SAARC, European Union na United States.[8][9]

  1. India economic survey 2018: Farmers gain as agriculture mechanisation speeds up, but more R&D needed. The Financial Express (29 January 2018). Retrieved on 8 January 2019.
  2. CIA Factbook: India-Economy. Retrieved on 17 November 2018.
  3. Agriculture's share in GDP declines to 13.7% in 2012–13
  4. Staff, India Brand Equity Foundation Agriculture and Food in India Accessed 7 May 2013
  5. Labor force by agriculture sector in India.
  6. India outranks US, China with world's highest net cropland area. Archived from the original on 18 November 2018. Retrieved on 17 November 2018.
  7. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named usda2014
  8. Agriculture in India: Agricultural Exports & Food Industry in India | IBEF.
  9. Home. Archived from the original on 8 September 2017. Retrieved on 7 September 2017.